Prince Philip, Duke nke Edinburgh, anwụọla ka ọ gbachara afọ 99

Ọkparaeze Philip bụ Duke nke Edinburgh

Ọkparaeze Philip, di Ezenwaanyị Ịngland nke abụọ anwụọla dịka ọ gbachara afọ iri itoolu na itoolu, dịka obieze si kwuo.

Ọkparaeze Philip lụrụ Adaeze Elizabeth n'afọ 1947, n'ime afọ ise tupu ọ bụrụ Ugoeze ma bụrụ onye kachasị nọtee aka n'ọkwa ahụ.

Ozi si obieze 'Buckingham Palace' kwuru sị, "Ọ bụ obi mwute ka Adaeze ji ekwupụta ọnwụ di ya, Okparaeze Philip, Duke nke Edinburgh.

"Ọkparaeze nwụrụ n'udo n'ụtụtụ a na 'Windsor Castle'."

Ndị ọrụ obieze wepụtara ọkwa ọnwụ ya dịka e kwupụtara ya

Ebe foto si, Reuters

Praịm minista mba Briten bụ Boris Johnson mgbe ọ na-ekwu okwu na 'Downing Street'sị na o ji "obi nwute" nata ozi ọnwụ ya

Johnson gara n'ihu kwuo na "ọ kpalitere mmụọ ọtụtụ ndị ntoroọbịa".

Achịbishọp nke Canterbury bụ Justin Welby sị Duke "ji ndụ ndị ọzọ kpọrọ ihe karịa ndụ nke ya, n'ime nke ọ bụụrụ ezigbo ihe ịmaatụ nye n'ọrụ okpukperechi Kraịstị".

Obieze kwuru "Ezinaụlọ obieze so ndị mmadụ n'ụwa niile na-eri uju ọnwụ ya."

Ọkwa ọnwụ Ọkparaeze Philip

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, E dosara ọkwa ọnwụ ya n'ihu obieze

Di na nwunye a mụrụ ụmụ anọ, ụmụ ụmụ asatọ na ụmụ ụmụ ụmụ iri.

A mụrụ nwa ha mbụ bụ Ọkparaeze Charles onye bụ Ọkparaeze nke Wales n'afọ 1948, nwanne nwaanyị na-eso ya bụ Adaeze Anne ka a mụrụ n'afọ 1950, mụọ Ọkparaeze Andrew bụ 'Duke' nke York n'afọ 1960 na Ọkparaeze Edward bụ 'Earl' nke Wessex n'afọ 1964.

A mụrụ Ọkparaeze Philip n'Island Corfu' nke mba Greece n'ọnwa Juunu 10 n'afọ 1921.

Nna ya bụ Ọkparaeze Andrew nke Greece bụ obere nwa Eze George nke mbụ ndị Hellenes.

Nne ya bụ Adaeze Alice nke Battenberg bụ isiada nke Ọkparaeze Louis nke Battenberg bụrụkwa nwanne onye Earl Mountbatten nke Burma.

Ọkwa ọnwụ kparaeze Philip nke Edinburgh

Duke nke Edinburgh na mmemme ịnyịnya n'afọ 2003

Ebe foto si, Getty Images

Nwaeze Philip, onye Duke nke Edinburgh nwetara nkwanye ugwu maka nkwado ya n'ebe ugoeze nọ.

Ọ bụ oke ọrụ nye onye ọbụla, ma ya fọdizie onye nwoke ejirila rụọ ọrụ dịka onye agha mmiri, onye nwere amamihe na ngalaba dị icheiche.

Mana ọ bụ ezigbo agwa ya ahụ mere o jiri rụọ ọrụ ya nke ọma ma were obi ya niile kwado nwunye ya n'ọkwa ya dịka Ugoeze.

Asambodo ọmụmụ ya gosiri ụbọchị Mee 28 nke afọ 1921 dịka ndị Greece enwetabeghi ọnụọgụgụ ụbọchị mgbe ahụ.

Ọ bụ nwa nke ikpeazụ, otu nwanwoke n'etiti ụmụnwaanyị nke mere ndụ ya mgbe ọ dị obere jiri juputara n'ịhụnnanya.

Ọkparaeze bidoro agụmaakwụkwọ ya na mba France ma ọ bịara biri na nke ndị nwanne ya na Mountbatten nke mba England mgbe ọ gbara afọ asaa, ebe ọ gara ụlọakwụkwọ praịmarị na Surrey.

N'oge a chọpụtara na nne ya nwere ọrịa schizophrenia ,e wee ziga ya n'ụlọ ize ndụ.

Obere Okparaeze anaghị ahụ nne ya anya dịka o kwesiri.

N'afọ 1993, e zigara ya na Schule Schloss Salem dị na South Germany nke onye nlekọta ya bụ ọkammụta Kurt Hahn.

N'ime ọnwa ole na ole, Hahn bụ onye Juu gbara ọsọ maka mmegbu nke ndị Nazi.

Mbanye n'ọrụ aghammriri

Hahn gara na mba Scotland mepee ụlọakwụkwọ Gordonstoun, ebe Ọkparaeze gafere mgbe ọ gụrụ nanị tamụụ na mba Germany.

N'oge ọchịchị Gordonstoun Spartan nke gbakwasịrị ụkwụ na mmadụ ịtukwasị onwe ya obi bụ ezigbo ọnọdụ nye obere nwa nne na nna ya hapụrụ, nke mere o jiri di ya ka ọnọrọ onwe ya.

Dịka agha na-achọ ịda, Ọkparaeze Philip kpebiri ị banye ọrụ ndị agha.

Ọ chọburu isoro ndị agha ọgbọelu mana ndị ezinaụlọ nne ya nwere omenala metụtara mmiri nke mere o jiri banye ụlọakwụkwọ Britannia Royal Navy dịna Dartmouth.

Lieutenant Philip Mountbatten na ndịọrụ agha mmiri na-akpakọrịta ụka - 1947

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Philip nwere ọrụ nke agha mmiri pụrụ ịche

Dịka e zipuru ya idu ndị Adaeze Elizabeth na Margaret ozi mgbe Eze George nke isii na Ugoeze Elizabeth na-eme njem nlereanya n'ulọ akwụkwọ ahụ.

Dika anya hụrụ ka ojiri mee kwuru, Ọkparaeze Philip mere nkeọma na njem ahụ bụkwa nke juru obere Adaeze Elizabeth dị afọ 13.

Philip gosiri onwe ya dịka ọpụrụiche mgbe ọgbara onye mbụ na mpụta ụlọakwụkwọ n'afọ 1940, ebe ọ lụrụ agha nke mbụ ya n'Osimiri India.

Ọ gafere n'ụgbọmmiri agha HMS Valiant nke ndị angalaba agha Mediterranean bụ ebe akpọkuru ya aha maka ọrụ ya n'agha nke Cape Matapan n'afọ 1941.

Dịka onye agha na-ahụ maka ugebeọkụ ụgbọmmiri ahụ, ọrụrụ ọrụ dị mkpa na-ichekwa ogige ụgbọmmiri ahụ n'oge abalị.

"Ahụrum ụgbọmmiri ọzọ we gbaa mpaghara etiti ya ọkụ, ya bụrụ ihe furuefu n'otu ntabi anya n'okpuru mkpọegbe Salvo nke ogologo ya dị 15 n'ihu n'ihu."

N'ọnwa Ọktoba afọ 1942, o so na otu n'ime ndị Lieutenants mbụ nke ndị agha mmịrị Royal kachasị obere n'afọ bụ ndị na-arụ ọrụ n'ụgbọ mmiri HMS Wallace.

Njikọta

N'ime oge niile a ya na obere Adaeze Elizabeth nọ na-agbanwerịta akwụwkọ ozi, ọtụtụ oge akpọrọ ya ka ọbịa nọrọ n'obieze.

Ọ bụ n'ime otu njem ahụ n'oge ekeresimesi afọ 1943 ka Elizabeth were foto Ọkparaeze Philip ebe oyi uwe ndị agha mmiri tụgbọ ya n'ebe akwa nke ndi ya.

Mmekọrịta ha toro n'udo agbanyeghi na ụfọdụ ihe mgbochi si n'aka ndị ọrị alaeze ndị kọwara Ọkparaeze Philip dịka "onye agharịgha n'akwa agwa ọjọọ".

Mana obere Adaeze hụrụ ya n'anya nke ukwu, n'ime oge sọọma nke afọ 1946, onye chụrụ ịlụ ya kwara nna ya ka ọkpọnye ya adanwaanyị ka ọlụọ.

Adaeze Elizabeth a lụọ Philip Mountbatten - 1947

Ebe foto si, PA

Nkọwa foto, Alụmalụ dị na nwunye ya na Adaeze Elizabeth ka akpọrọ "mpụta ihe nke agwa n'oge agha Britain''

Tupu a na-ekwuputa njem ọlụlụ ha, ọparaeze kwesiri ịgbanwe aha obodo ya n'akwa aha ezinaụlọ ọhụrụ. Ọ gọnarịrị akpụrụ ya dịka onye mba Greek ma bụrụzie nwafọ mba England wee kọrọ aha bekee nne ya bụ Mountbatten.

Mgbe ọfọdụrụ otu ụbọchị ka ha gbaakwụkwọ, Onyeze George nke isii chiri Philip echichi ndịeze akpọrọ His Royal Highness, n'ụtụtụ ụbọchị agbamakwụkwọ ahụ e mere ya Duke nke Edinburgh, Earl nke Merioneth na Baron Greenwich

Ha gbara akwụkwọ na Westminster Abbey n'ụbọchị 20 Nọvemba afọ 1947. Winston Churchill kọwara ya dịka " mpụta ihe nke agwa" n'oge agha Britain.

Duke laghachịrị n'ọrụ ya dịka onye agha mmịrị, ezigara ya na Malta ebe ya na nwunye ya ga-ebị ndụ dịka ezinaụlọ ndịọzọ.

Nwa ha bụ Ọparaeze Charles bụ onye n'Obieze dị na Buckingham n'afọ 1948, mụọ kwa Adaeze Anne n'afọ 1950.

N'abalị abụọ nke ọnwa Seputemba afọ 1950 ka otozuruoke n'ebumnobi onye agha mmịrịọbụla mgbe emere ya onyeisi ụgbọmmiri nke ya bụ ndịda HMS Magpie.

Mana ọrụ ya dịka onye agha mmiri na-abịa ịkwụsị. Ọke ọrịa nke Eze George nke isii pụtara na Ada ya nwaanyị ga-eleba anya nkeọma n'ihe metutara alaeze ebe ọ ga-achọ ka dị ya kwụrụ ya n'azụ.

Philip nara ezumike n'aka ndị aghammiri Royal n'ọnwa Julaị afọ 1951. Mana ọ laghachịghị azụ n'ọrụ.

Duke abụghị nwoke na-ata onwe ya ụta, mana n'ime oge ndụ ya ọ kwara arịrị na ọ laghachịghị n'ọrụ ya dịka onye aghammiri.

Ndị enyi kwuru n'ike nke ọnwe ya na ọ gara irigoro n'ọkwa onye Sea Lord nke mbụ

N'afọ 1952 dị na nwunye alaeze a mere njem nlereanya ndị Commonwealth nke atụmatụ bụ na Eze na Ugoeze ya ga-aga.

Echiche ọgbaraọhụrụ

Ọ bụ n'ọnwa Febụwarị dịka ha nọ n'obi egwuregwu dị na mba Kenya ka ozi bịara na Eze anwụọla.

Ọ rịara ọrịa akpọrọ coronary thrombosis - ọrị ọjọọ mkpụkọta ọbara obi.

Ọdabara n'aka ọparaeze ị zị nwunye na ọ bụ zị Ugoeze ugbua.

Otu enyi mechara kọwa ya Ọparaeze Philip dịka onye a ga-asị na "ọkara ụwa" da kwasịrị ya.

Ugoeze Elizabeth II na Ọparaeze Philip n'ekele igwe mmadụ ka e chichara ya Ezenwaanyị - 1953

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Dụke chọrọ ịgbanwe ịsiọchịchị

Ebe a na-apụrụ ya ọrụ aghammịrị, o kepụtara onwe ya ọrụ ọhụrụ ọzọ tinyere nrigoro n'ocheeze nke Elizabeth wetara ajụjụ ihe ọzọ ga-eme.

Dịka oge ịchịeze na-abịa nso, enyere iwu na Ọkparaeze Philip ga-eji ihe ọbụla gbasara Ugoeze kpọrọ mkpa karịsịa ihe ndị ọzọ, mana ọ gaghị enwe ọkwa ọbụla iwu kwadoro.

Onye Duke nwere amamịihe buru ibu otu ọ ga-eji gbanwe ọnọdụ ọchịchị mana ụfọdụ ndị anya ụfụ nchekwa obieze ekweghị ya mezuo atụmatụ ndị ahụ.

Ihe ilu chere ya n'ihe

O were ike ya niile tinye n'ikpori ndụ. Ya na ụfọdụ ndị enyi ya ụmụnwoke na-ezukọ izu ọbụla n'ụlọ oriri dị na Soho etiti London.

Ha gakwara n'ụlọ ndịna n'akwa ụlọegwu dị icheiche bụ ebe e sere ya na ndị enyi ya foto ọtụtụ oge.

Otu ebe enyere duke ike nkwuwa okwu bụ n'ime ezinaụlọ ya agbanyeghi na onweghi ike gụọ ụmụ ya aha.

Ugoeze Elizabeth II and Ọparaeze Philip sị n'elu Land Rover ekele ụmụakwụkwọ na mmemme nnabata emere na Racecourse n'Ibadan ala Naịjiria

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọ nabatara mgbanwe ndụ ya ka dị Ugoeze - ebe a, ha na eleta ala Naịjiria na 1956

Ọ bụ ihe ilu nye Duke na mkpebi Ugoeze mere ịgụ ezinaụlọ ha aha ndị Windsor n'abụghị nke Mountbatten.

"Ọ b ụ nanị m bụ nwoke nọ na mba a nke na-enweghi ike ịgụ ụmụ m aha nkem" dịka ọ kọsara ndị enyi ya " Onweghi ihe m bụ karịsịa amoeba."

Dịka onye nna, Ọkparaeze Philip enyeghi ike ibu ihe n'obi maọbụ nwe ekworo.

N'ihe Ọparaeze Charles,Jonathan Dembleby dere banyere ya, mgbe ọdị o bere na-emere ya ihe akaja n'anyammiri n'ezi maka nna ya,mmerikọta nna na ọpara ya adịghịrị ha mfe.

Philip siri ọnwụ ka Ọkparaeze Charles ga ụlọaakwụkwọ ochie ya bụ Gordonstoun maka iji kwalite mmụọ nke nwa ya.

L-R: Duke nke Edinburgh, Adaeze Anne, Ọparaeze Edward, Ezenwaanyị Elizabeth II, Ọparaeze Charles (n'azụ Ezenwaanyị) na Ọparaeze Andrew - 1968

Ebe foto si, PA

Nkọwa foto, Otu ebe enyere duke ike nkwuwa okwu bụ n'ime ezinaụlọ ya

N'ihi nke a obere ọparaeze kpọrọ ụlọakwụkwọ ahụ asị ,ebe ọrịara ọrịa ọtụtụ oge ma bụrụ onye a na-akụ ihe mgbe ọbụla.

Agwa duke gosipụtara ụdịdị nke onwe ya,mgbe ụfọdụ bụ ị noro onwe oge ọ dịna nwata.

Akwabara ya ị n'ime iwulite onwe ya mgbe ọ dị obere nke mere oji esiri ya ike ịghọta na ọ bụghị onye ọbụla nwere udị ike ahụ n'akparamagwa.

Otu ihe na-emetu Ọparaeze Philip n'obi nkeukwu bụ ezi ọnọdụ ndị ntoroọbịa, nke kpalitere mụọ ya iwepụta ohere ihe nrite nke Duke ndị Edinburgh n'afọ 1956.

N'ime ọtụtụ afọ o nyere ohere ka ndị mmadụ ruru nde isii ahụ siri ike na ndị nwere nkwarụ gbara afọ 15 rue 25 n'ụwa niile nwale onwe ha n'ụzọ amamihe na ndịọzọ dị icheiche iji kwalite ịdị n'otu na nkwanyetara ugwu.

"Ọ bụrụ na i mee ka ndị ntoroọbịa mee nkeọma n'ihe omume ọbụla", ọ kara ndị BBC, "nkwalite mmụọ ahụ ga-agazu ihe ndịọzọ."

N'ime oge ndụ ya niile, duke tinyere uchu na oge ya n'ihe gbasara ije ozi ahụ, dịka ọ gakwara emume niile gbasara nke a si n'ụbọchị rue n'ụbọchị.

'Amamihe ziriezi'

Ọ bụ onye hụrụ ụmụanụmanụ na gburugburu obibi n'anya, agbanyeghi na mkpebi ya ịkpa agụ egbe mgbe ọ gara mba India n'afọ 1961 butere nkọcha.

Ozi ewepụtara na foto ebe egosiri agụ dịka ihe nrịta mere ka okwu ahụ ka njọ.

O tinyere ikikere na akụ ya n'ihe gbasara nchekwa ndụ ndị ihe dị n'ime ọhịa bụ World Wildlife Fund nke mechara bụrụ World Wild fund for Nature, bụkwara onye a gara ahọpụta dịka onyeisi nke mbụ.

Philip nọ n'elu enyi mgbe ya na Ugoeze ya gara nleta Kanha Game Reserve na India

Ebe foto si, PA

Nkọwa foto, Oji ike were sonye na ịhe nchekwa anụmanụ na gburugburu obibi

"Eche m na ọ bụ ezi ihe na anyị nwere ndụ dị icheiche n'elụ ụwa, na-ebirikọta ọnụ," ọ gwara onye BBC gbara ya ajụjụ ọnụ.

"Eche m na ọ bụrụkwa na anyị bụ mmadụ nwere ike nke ndụ na ọnwụ - maọbụ nke mkpochapụ na ịzọndụ - anyị kwesiri iji ya mee ihe n'ụzọ ziri ezi. Kedu ihe mere iji ekpochapụ ihe mgbe na-ikwesighi?"

Ọ kpaliri iwe ụfọdụ ndị nchekwa ndụ mgbe o kpuchiri oke ịgbaegbe n'ụzọ ezighi ezi.

"Ọbụrụ na ị nwere ebe a na-azụ anụ, ị ga-achọ ka ọpụta ndụ ka ị were ya me ihe n'afọ na-abịa abịa dịka onye ọrụubi. ị ga-achọ ịkọ ya ihe, karịa ikpochapụ ya."

Ihe nwereike bụ nsogbu

Mana etoro ya na mgbalị ya ichekwa ọhịa nọ n'ụwa n'akwa ịkatọ oke ịkụ azụ n'osimiri.

Ọparaeze Philip tinyere uche n'ụlọọrụ nrụpụta ihe dịka o mere njem nleta n'ụlọọrụ dị icheiche ma bụrụ nna ogige nrụpụta ihe bụ Industrial Society nke bụ zị 'Work Foundation'.

Ugoeze Elizabeth II na Duke nke Edinburgh n'ese fọtọ ebe ha gara nleta Tuvalu - 1982

Ebe foto si, PA

Nkọwa foto, Ọ na ekwuputa okwu na ebutekwa okwu mgbe ụfọdụ

Duke gosiri ndị otu ọrụ nrụpụta ihe n'afọ 1961 akparamagwa pụtara ihe mgbe ọ gwara ha "Ndị nwoke ibem, oge eruola mgba anyị ga-ewpụta mkpịsịaka anyị."

Oke mkwuputa okwu ya mere ụfọdụ ji eche na onweghi mkwanye ugwu, nke tinyere ya na nsogbu oge ụfọdụ.

Ọ bụ onye ama-ama na-inwe nghọta dị iche banyere ọnọdụ ihe, karịsia mgbe ọ nọ na mba ọzọ.

Okwuru otu okwu ejiri too ya mgbe ya na Ugoeze soro ga nleta na mba China n'afọn 1986. okwuru o chere na ọ bụ nkeonwe gbasara "anya ụra".

Nke a butere oke okwu n'akwụkwọ mgbasa ozi, agbanyeghi na ọ bụchaghị ihe nsogbu na mba China.

Mgbe ọ gara mba Australia n'afọ 2002, ọ jụrụ otu onye nwoke Aboriginal na-achụ nta ego "unu ka na-ama onwe unu ube".

Dịka ọtụtụ ndị katọrọ ya maka ụdị okwu ndị ahụ, ụfọdụ hụrụ ya dịka onye kwụrụ onwe ya,na-ekweghi ka ihe gbasa ọchịchị mebie ya.

Ufọdụ hụtara ihe akpọrọ "mkwuhịe" ya dịka ihe eji eme ka ọcha kpa ndị mmadụ, ka obi daa ndị mmadụ jụụ .

N'oge ndụ ya niile, Ọparaeze Philip bụ onye egwuregwu n'anya nke ukwuu, ọnyara ụgbọmmiri, kụọ cricket na polo, nyaa ibuịnyịnya maọbụrụ onyeisi ndị International Equestrain Federation ọtụtụ afọ.

Duke nke Edinburgh ebe ọ na agba polo in Sussex - 1952

Ebe foto si, PA

Nkọwa foto, O nwere mmasị pụrụịche ebe egwuregwu 'Polo' dị

Ihe nsogbu banyere nwa mbụ ya pụtara ihe ọzọ mgbe Jonathan Dimbleby depụtara akwụkwọ banyere ndụ Ọkparaeze Charles.

Onye Duke nke Edinburgh ka ekwuru kwabara Charles ịlụ Nwada Diana Spencer. Mana ọ bụ ya kacha ekpeọnụ karịa ndị na-akatọ ya ọtụtụ afọ mgbe agbamaakwụkwọ nwa ya nọ na- ekewa.

Ọgbara mbọ ịhọta nsogbu ha nwere, dịka na ncheta ya ọ mara ihe ọpụtara ịlụ nwanyị si na EZINAỤLỌ NDỊ EZE.

Njem ala nsọ

Owetere Ọkparaeze Philip nke ukwuu n'ọdịda alụm dị na nwunye ụmụ atọ n'ime anọ ọ mụrụ, ndị gunyere Adaeze Anne, Ọkparaeze Andrew na Ọkparaeze Charles.

Mana ọ naghị ekwu ihe gbasara onwe ya dịka ọ gwara ndị ode akwụkwo akụkọ n'afọ 1994 na o mebeghi ya mbụ nke ọ ga-eji mmalite ugbua.

Mgbago n'afọ egbochighi ya ebila ndụ dịka ọ nọ na-eme njem maka World Wide Fund for Nature n'akwa njem nleta mba dị icheiche ya na Ugoeze.

Duke nke Edinburgh ebe ọ nọ n'asọmpị nke Sandringham Country Show Horse Driving Trials - 2005

Ebe foto si, PA

Nkọwa foto, Ịnya ụgbọ ịnyinya bụ egwuregwu masịrị Oparaeze

O mere njem ala nsọ naanị ya na mba Jerusalem n'afọ 1994 ebe ọ gara letu ili nne ya,onye uche obi ya bụ ka-elie ya ebe ahụ bịara na mmezu.

Ọnọdụ ihe nwute ọzọ mere na ndụ ya bụ mgbe ncheta ụbọchị VJ gbara afọ 50 emere na 1995.

Ọkparaeze Philip nọ na ụgbọmmiri mbibi ndị mba Britain dị na ọdọ mmiri mba Tokyo mgbe ndị mba Japan wụsara ngwaagha ha, n'oge emume ncheta ahụ o soro ndị agha ibeya nke ọwụwanyanwụ mee njem ahịrị gafe n'ihu Ugoeze n'ụlọ ahịa.

Olu nkụjụobi

O gosiri obi ebere n'ebe ndị mba Japan atọghapụrụ na mkpọrọ nọ ndị hụtara ya dịka ihe ịraahụ ịgbaghara ihe emere ha.

Agwa ịke ya belatara na ọdị n'ihu maka agwa iro ndị ọha na-akpaso ezinaụlọ onyeze mgbe Diana bụ Adaeze nke Wales nwụchara.

(L-R) Ọparaeze Philip, Adaeze Cambridge (na obere Adaeze Charlotte na obere Ọparaeze George) na Ọparaeze William kwụ na mbara Obieze Buckingham Palace ị nele ụgbọ elu ndị agha elu na London - June 2017

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ọ naghị ekwe ikwu maka ihe ndị gbasara ya

N'afọ 2007, ewpụtara akwụkwọ ozi mkparịta duke na Adaeze iji katọọ akụkọ n'ewu na ya na ada ya dị n'iro.

Akwụkwọ ozi Dubbed the Dear gosiri na ọ bụ onye ezigbo nkwado nye Diana, ahụtara nkea na ụdị olu ọma ọ Diana na-eji ezigara ya ozi.

Mohamed Al Fayed, nna onye ya na Diana nọ n'ikpeazụ boro Ọkparaeze philip ebubo na ọ bụ zipuru ndị gburu Diana - ebubo onye a echiri echiche na-anabataghi.

Ọkparaeze Philip, Duke nke Edinburgh, bụ onye agwa ya siri ike kwụrụ onwe ya ma hụkwa onwe ya n'etiti mba Britain.

'Eleghi anya n'ihu'

Ọ bụ onye ndu site na ọmụmụ, onye ọrụ ya mere ya ka ọ na-abịa dịka onye nke abụọ; nwoke obi ọkụ na-enweghi ezumike maka ụdị ọnọdụ chere ya n'ihu gbasara ọkwa ya.

Ugoeze Elizabeth II na Ọparaeze Philip jikọ aka - 2015

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ugoeze Elizabeth akpọla ya ike ya na nkwado ya

"Emela m ihe m chere kacha nma," ọ gwara BBC. "Agaghị m agbanwe ụzọ m jiri eme ihe na ntabi anya, agaghị m agbanye ihe ndị na-amasị m maọbụ otu esi m akpa agwa. Nke a bụ otu m si eme ihe."

Onye rụtụrụ aka n'okwu a bụ Praịm Mịnịsta David Cameron n'ozi mkwanye ugwu mgbe duke mere ihe ncheta ọmụmụ ya nke afọ 90 n'ọnwa Juunu 2011.

"Ọ bụ onye na-eme ihe n'ụzọ nke ya,onye nwere ume ala, na-adịghị eleanya n'ihu nke ndị mba Britain hụrụ dịka ihe obi ụtọ.

Philip bụ onye mere nkeọma n'iji ọkwa ya kwalite ndụ ndị Britain wee gbaa mbọ ịhụ na ọnọdụ ọchịchị gbanwere dịka ibi ndụ na-agbanwe n'ime ọtụtụ afọ.

Mana ọrụ ya kachasi ibe bụ nkwado tara ọchịchị onyere Ugoeze ọtụtụ afọ niile ọ nọ n'ọchịchị.

O kwuru na ọrụ ya bụ ihụta na "Ugoeze ga-achị" dịka ọ gwara onye na-ede akwụkwọ banyere ya.

Na mmemme i cheta alụ dị na nwunye gbara afọ 50, Ugoeze kwanyere di ya ugwu, onye kachasị a nọ n'ọrụ Obieze ọtụtụ afọ karịa ndị ọzọ na mba Britain niile.

"Ọ bụ onye na-adịghị achọ ka etoo ya, mana ọ bụ ike m n'ime afọ niile a. Mụ na ezinaụlọ ya niile, ndị a na mba ụwa ndị ọzọ ji ya ụgwọ ebe ọdị ukwuu nke na apụghị ịkwụcha."

Foto niile a nwere ndị nwe ya.