Prince Philip, Duke Edinburgh: Kedụ ihe mere BBC na-agbasakarị ozi banyere ụfọdụ ndị ezinaụlọ obieze Ingland n'ụzọ pụrụ iche?

Ezenwaanyị Elizabeth II nke Briten na di ya bụ Ọkparaeze Philip bụ 'Duke' nke Edinburgh dịka ha na-agagharị na Broadlands dị na Hampshire n'afọ 2007

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ezenwaanyị Elizabeth II na Ọkparaeze Philip na foto ha sere n'afọ 2007, ha nọkọrọ afọ iri asaa

Akụkọ dị iche tata. Webụsaitị BBC niile nakwa usoro akụkọ BBC niile bụ nanị otu okwu ka a na-elenye anya n'ụzọ miri emi.

O nweghị ihe akpamọchị maọbụ ihe erijughị afọ i nwere ike ịhụ maọbụ nụ ebe ọbụla, ebe onye na-agụ akụkọ na-eji obi iru ụjụ agụ ya.

Mgbanwe ndị a n'iile bụ maka otu okenye n'obieze mba Briten nwụrụ.

Ọ bụrụ na ị na-ere maọbụ agụ akụkọ taa, ị ga-amarala na di Ezenwaanyị bụ Ọkparaeze Philip , otu n'ime mmadụ anọ bụ ndị kacha okenye ndị BBC na-eme akụkọ ya n'ụzọ a.

Ndịọzọ bụ Ezenwaanyị Elizabeth II, nwa ya ma bụrụkwa onye ọkwa eze ruru bụ Ọkparaeze Charles (Ọkparaeze nke Wales), na nwa ya nwoke ma bụrụkwa onye na-eso n'ịba ọkwa Eze bụ Ọkpareze William (Duke nke Cambridge).

Ọ dịzị ka BBC a na-ewezi ọnwụ a karịa etu ụlọrụ ntaakụkọ dị ọzọ si ewe ya. Gịnị mere o ji dị otu a?

Ihere mere ọkwụ n'obieze Ingland jiri bụụ nnukwu ihe nye BBC?

Ọkparaeze Charles,Ọkparaeze Philip, Ọkparaeze Harry na Ọkparaeze William dịka ha so agbatiozu nke Nne Ezenwaanyị n'afọ 2002 oge e butere ya na Westminster Abbey

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Akwamozu Nne Ezenwaanyị n'afọ 2002 bụ nnukwu ihe kpọtụụ akpọtụ n'ụlọakụkọ dị nn'ụwa gbaa gburugburu

Ezenwaanyị Elizabeth nke Abụọ bụ onye kachasị nọ n'ocheze na mba Briten - Ọ nọọla n'oche eze afọ 69. Ọ bụ onyeisiala mba UK na mba iri na ise ndị ọzọ.

Ọ bụkwa onyeisi otu 'Commonwealth' nke bụ otu mba 54 (iri ise na anọ) nọbu n'okpuru ọchịchị mba Briten jiri aka ha nọrọ. Ọ bụ onye ndị Ohaneze ndị Briten na ndị ọzọ ejighị egwu egwu.

Onye obieze mba Briten nwụọ, ụlọ ntakụkọ n'ụwa dum naetinye anya na ya n'ụzọ pụrụ iche.

BBC na-agba mbọ n'ụzọ abụla ụzọ ịhụ na ha wepụtara akụkọ banyere ya ọfụma. Nke a bụ maka ihe dị mkpa.

BBC abụghị gọọmentị Briten na-eweta ego eji ahazi ya, mana ọ bụ ego ndị ọhaneze Briten na-atụkọta site n'ụụtụisi a kpọrọ " the licence fee" na Bekee.

Ego a a na-atụkọta etu a bụ iji hụ na ụlọọrụ BBC nọrọ onwe ya na-eme akụkọ na enweghị ogbochi ọbụla site n'aka gọọmentị mba ahụ.

Foto Princess Elizabeth na Prince Philip na nwa ha nwaanyị Adeze Anne nakwa ọkpara ha Ọkparaeze Charles na Buckingham Palace, London, n'ụbọchị 21 Ọktọba, 1950

Ebe foto si, AFP/Getty Images

Nkọwa foto, Princess Elizabeth na Prince Philip na nwa ha nwaanyị Adeze Anne nakwa ọkpara ha Ọkparaeze Charles n'afọ 1950

BBC na-egosi ndị na-akwụ ụtụisi a na ego ha anaghị emefu ya na nkịtị, ebe ọhaneze na-enwekarị mmasị n'ihe gbasara Ezinaụlọ Eze kemgbe na mba Briten.

Mgbe Nne Ezenwaanyị Elizabeth - A ma dịka Nne Ezenwaanyị- nwụụ n'afọ 2002, ihe karịrị mmadụ 100,000(otu narị puku) bịara hụ ozu ya abalị atọ e dowere ya n'obieze nke Westminster.

Ihe karịrị otu ndde mmadụ kwụụ n'okporoụzọ, ebe mmadụ nde iri (10 m) kiriri ka e bu akpatị ozu ya n'ihe onyonyo dịka e bu ya aga ebe e liri ya na Windsor.

Ụlọọrụ akụkọ mba ụwa wepụkwara akụkọ ya n'uju.

Nke a abụghị ihe gbara gharịị, dịka akụkọ metụtara Ezinaụlọ Eze bụ akụkọ na-amasị ịkọ n'ụwa nnile.

Mmemme metụtara Ezinaụlọ Eze bụ ihe ndị mmadụ karịrị otu ijeri na-ekiri maọbụ gee.

N'ezie, ụdị akụkọ a bụ nnukwu akụkọ nke BBC na-emekwa ka akụkọ.

Onye ntaakụkọ BBC na-ahụ maka ihe na-eme n'Obieze bụ Jonny Dymond, "Ihe gbasara Obieze bụ ihe na-amasị ọha n'ụzọ ọ bụladị ndị a ma ama, enwenwughị ike ọha."

"O siri ike ịma ihe kpatara nke a. Mana,o nwere ihe dị n'ime ọtụtụ ndị mmadụ mere akụkọ ifo maka Obieze na-agbanyeghị na n'ime obi ha o nwechara ka ọ dị n'agba ọhụrụ a."

A na-atụ anya na BBC nke dị na mba ndị ọzọ (BBC World Service) ga-ebụkwa akụkọ ndị a n'ise.

Tarik Kafala bụ onye "News Controller nke BBC World Service Languages' si kwuo, "Ọnwụ onye okenye n'Ezinaụlọ Obieze bụ ihe na-amasịkarị ndị mmadụ n'ụwa niile. Dịka ụlọọrụ ntaakụkọ 'British Broadcasting Corporation', narị kwuru narị ndị na-ekiri, ndị na-ege na ndị na-agụ akụkọ anyị n'ụwa gbaa gburugburu na-atụ anya akụkọ zuru oke maka ụdị ihe a mere."

line

Kedụ etu BBC si ewepụta akụkọ maka ọnwụ onye okennye n'ezinaụlọ Eze Briten?

line
Martine Croxall
Nkọwa foto, ọgụakụkọ BBC bụ Martine Croxall kpọpụtara ọnwụ Duke nke Edinburgh n'akụkọ BBC News