Ọṅụ maka etu Eze Nwaanyị siri nọgide dịka ezi onye ọchịchị

Ndị na-eme emume ncheta a

Ebe foto si, Getty Images

Archbishop nke York bụ Stephen Cottrell jiri ịhụnanya Eze Nwaanyị nwere n’egwiregwu ịnyịnya were maa atụ sị, “ Eze Nwaanyị ka nọ kwa n’elu ịnyịnya” agbanyeghị na ọ nweghị ike ịbịa ụka a pụrụ iche.

Nke a bụ kwa mbụ Duka na Duchess nke Sussex sonyere n’emume ọbụla gbasara obi eze Briten kamgbe ha pụrụ afọ abụọ gara aga.

Mana Eze nwaanyị dị afọ 96 sị n’Obi ya ekiri ya bụ ụka pụrụiche.

Ọ bụ maka na enwere etu ahụ siri mee ya n’ụbọchị Tụzde mere o jiri kagbuo i so na ya bụ ụka.

Nwaeze Charlse na nwunye ya

Ebe foto si, Getty Images

Nwaeze Andre esoghị kwa na ya bụ emume dịka ahụtara Covid-19 n’ahụ ya.

Mgbe nwaeze Harry na nwunye ya Meghan batara ogige ụloụka Saint Paul, ọtụtụ ndị mmadụ bunyere ya ụkpa ekele.

Nwaeze Harry na nwunye ya

Ebe foto si, Getty Images

Ụka pụrụiche maka ncheta ọchịchị 70 Eze nwaanyị

Ebe foto si, Getty Images

Ndị ọrụ NHS, ndị ọrụ gọọmentị, ndị natara ihe nrite ekele pụrụiche na ndị na-enyere ndị ọnụ na-erụghị aka sonyere na ya bụ ụka pụrụiche. Nke a so n’emume ụbọchị anọ a ga-eme maka emume ncheta ọchịchị afọ 70 nke Eze nwaanyị.

Ndị ọzọ ọnụ na-eru n’okwu bịara nụ bụ Praịm Mịnịsta Briten Boris Johnson na nwunye ya bụ Carrie. Ụfọdụ ndị kwara ya emu ebe ụfọdụ ndị na-eto ya.

Nwaeze Harry na nwunye ya

Ebe foto si, Getty Images

Ndị agha pụrụiche

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisi ndị ọrụ bụ Keir Starmer na John Mayor, Tony Blair, Gordon Brown, David Cameron na Theresa May bụ ndị bụbu Prọ́ịm Mịniosta nọkwa ebe ahụ .

Johnson gụrụ akwụkwọ ozi nke sị n’akwụkwọ ozi nke Pọolụ degara ndị Philippians nke dị n’agba ọhụrụ akwụkwọ nsọ nke jiri okwu a bido, “ Oge niile na-aṅụrị ọṅụ n’ime Chineke’”. 

Ọ bụ Archbishop nke York bụ Justin Welby onye nọchịtere anya nke Cantebury maka o butere ọrịa covid-19.

Ndị na-akwado ezinụlọ obi eze

Ebe foto si, Getty Images

Ndị Ezinụlọ Eze nwaanyị

Ebe foto si, Getty Images