Ogbogwu Market Fire: "A ka na-achọ mmadụ abụọ achọ n’ọkụ gbara n’ahịa a"

Ọkụ gbara n'Ogbogwu

Chinedu Ezekweike bụ onyeisi ndị na-azụ ahịa n’Ogbogwu dị n’Onitsha Anambra Steeti ekwuola na ha ka na-achọ mmadụ abụọ achọ kamgbe ọkụ gbachara n’ahịa ahụ n’ụbọchị Tuzde.

O kwuru nke a mgbe onye ntaakụkọ BBC Igbo gara ebe ahụ na Fraịde 11th Nọvemba 2022, ịhụ ka ọnọdụ ebe ahụ si dị kamgbe ahụ.

Ezekweike sị na ọnụọgụgụ ndị nwụrụla eruola ihe dịka asaa ebe ndị merụrụ ahụ karịrị asaa.

“I lee anya ị ga-ahụ na anyị ka na-agba mbọ, ịkpochapụta ụlọ ndị a dara ada iji mara ma o nwere ndị tọrọ ebe ahụ.

“O nwere ụmụaka abụọ bịara ebe a ma sị na ha na-achọ nne ha achọ kamgbe ahụ”.

Ọ sị n’ime ndị merụrụ ahụ na a gwọọla ụfọdụ ma ha lawa n’ụlọ ha ebe ndị ọnọdụ ha dị njọ ka na-anata ọgwụgwọ.

Ebe ọkụ gbara n'Ogbogwu

Ihe NEMA kwuru maka ndị nwụrụ na ndị merụrụ ahụ

Ahịa Ogbogwu dị n'Onitsha Anambra State

Ụlọọrụ gbata gbata bụ National Emergency Management Agency (NEMA) ngalaba Anambra Steeti ekwuola na ọ bụ mmadụ anọ nwụrụ n'ọkụ ahụ gbara n'ahịa Ogbogwu Onitsha n'ụbọchị Tuzde 8 Nọvemba 2022.

Ọnụ na-ekwuru ha bụ Nwonye Chinyelu gwara BBC Igbo nke a n'ekwentị ma sị na ọnụọgụgụ ndị merụrụ ahụ karịrị iri na abụọ.

O kwuru na ọnụọgụgụ a nwereike ịkarị kama na ọ bụ kọmishọna na-ahụ maka ahụike ka ọ dị n'aka ịma mmadụ ole o metụtara kpọmkwem.

Chinyelu gara n'ihu kwuo na ụlọọrụ ha na-abọkaasị ogigi ahụ ugbua ịmata ma o nwere ndị tọọrọ n'ime ya bụ ụlọahịa ndị dara ada n'ihi ọkụ a.

'Nnukwu ihe gbara, anwụrụ kuputa tupu ọkụ ahụ amalite'

Ọkụ gbara Ọgbọgwụ, Onisha

Onyeisi ahịa BridgeHead, Ọnịcha, Anambra steeti bụ Chinedu Ezegwuike, akọwaala na ọ bụ ihe ọgbụgba malitere ọkụ gbara n'ahịa Ọgbọ-ọgwụ dị na Head Bridge, Ọnịcha, ụbọchị Tuzde.

O pekata mpe mmadụ anọ nwụrụ, ọtụtụ merụọ ahụ n'ọkụ gbara ọdọahịa 80 n'ahịa Ọgbọgwụ n'etiti ehihie abalị asatọ nke ọnwa Novemba afọ 2022.

Na mkparịtaụka Ezegwuike gwara BBC Igbo e nwere na ahịa ahụ, "Ebe o ji ihe dịka nkeji iri gafee Elekere iri na abụọ nke ehihie, anyị nụrụ nnukwute ihe dara ụda gbaa,kwụlie anwụrụ ọkụ."

" Oge ihe a mere, ọgbaghara dara n'ọtụtụ ebe, ndị mmadụ na-agba ọsọ nke butere n'ọtụtụ ndị mmadụ merụrụ ahụ."

O kwuru na ihe ọgbụgba ahụ zere ụlọ ndị dị na "Gọverment Line" bụ ebe a na-arụ kemikal n'ahịa ahụ.

Ọ ga n'ihu kwuo na ha na-atụ uche na ụfọdụ ndị mmadụ nakwa ndị ahịa ka tọọrọ nokpuru ụlọ ndị dara ada.

Eze ahịa Bridge Head Chinedu Ezegwuike

Ọkụ gbara metụtara ọdọahịa 80 n'Onitsha - Onyeisi ụlọọrụ mmenyụ ọkụ Anambra

Ebe ọkụgbara na ọdọ ndị na-ere ihe lap nakwa akọọngwa Sayensi n'ahịa Ogbọgwụ, Ọnịcha

Ihu atọghị ọtụtụ ndị mmadụ na-azụ ahịa n'Ọgbọọgwụ dị na Head Bridge, Onicha, Anambra steeti taa bụ Wenezde, dịka ọtụtụ na-agụkọ ihe ọkụ ọgbụgba tara isi o pekata mpe mmadụ anọ, ma merụọ ọtụtụ ndị mmadụ ahụ riri ha.

A mabeghị kpọmkwem ihe butere ọkụ ahụ maọbụ mmadụ ole nwụrụ n' ọdachị ahụ nke malitere n'ebe Elekere 12 nke etiti ehihie mana otu onye ndu n'ahịa ahụ achọghị ka a kpọ aha ya gwara BBC Igbo na e nwetalaa ozu mmadụ anọ nwụrụ n'ọkụ ahụ.

Ndị ọrụ mmenyụ ọkụ

Onyeisi ụlọọrụ gọọmentị Anambra steeti na-emenyụ ọkụ bụ Martin Agbili, gbara ama na ya bụ ọdachi metụtara

N’ozi mgbasaozi nke Agbili binyere aka ma wepụta n'ụbọchị Wenezde, o kwuru na ya bụ ọkụ malitere n’ọdọ ebe a na-ere kemikal na akọrọngwa sayensi n’Ọgbọ-ọgwụ.

Agbịlị kọwara na ọ bụ ihe ọgbụgba gbara n'ọkụ ahụ mere ọtụtụ ụlọ dị ebe ahụ mere ji daa.

"Ọ bụ nnukwu ihe mere mana agbanyụọla ọkụ ahụ."

" Ọ bụ ala ọmajiji so ihe gbara mere ka ụfọdụ ụlọahịa daa."

O kwukwara sị na a matabeghị mmadụ ole nwụrụ maọbụ ndị merụrụ ahụ.

Onye ntaakụkọ BBC Igbo gara n'ahịa ahụ n'ụtụtụ Wenezde kwuru na ọ hụrụ ndị ahịa ya bụ ihe metụtara na ndị ọdọ nke ha dị nso na-agba mbọ ibupụ ngwahịa ha ndị fọrọ afọ dịka gọọmentị Anambara steeti kwuorola na a ga-akwatu ụlọahịa ndị ọkụ ahụ metụtara.

Ka ọ dị ugbua, a ka na-achọ ndị ụlọ dagidere, ebe e bugarala ọtụtụ ndị merụrụ ahụ n'ụlọọgwụ dị n'Ọnicha na Asaba, Delta Steeti.

Ihe Gọọmentị Anambra steeti kwuru maka ọkụ gbara

Kọmishọna na-ahụka ọrụ pụrụ iche bụ Sly Ezeokenwa
Nkọwa foto, Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ pụrụ iche bụ Sly Ezeokenwa, Omeiwu na-achọte Onitsha-North bụ Eddy Ibuzor na onyeisiahịa Head Bridge Market bụ Chinedu Ezegwuike, na onyeisi ọrụ ụlọọrụ e nyere ọrụ ikutu ụlọ ndị mebiri n'ọkụ ọgbụgba ahụ, bụ Cho oge ha gara leta ka ihe mebiri n'ahịa ahụ.

Gọọmentị Anambara steeti kwuru na ndị ọrụ gbatagbata ha amalitere ọrụ ịhụ na a zọpụta ndị tọrọ n'ụlọ ahịa ndị dara ka ọkụ ahụ gbara ma kutuo ụlọ ndị nwere ike ịda.

Osote Govanọ steeti ahụ bụ Gilbert Ibezim kwuru nke a oge gara n'ebe ihe mere na mgbede Tuzde.

N'aka nke ọzọ, Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ pụrụ iche bụ Sly Ezeokenwa, kwuru na ọ bụ kemikal gwakọrọ were gbaa mere ka ọtụtụ ụlọ dị n'ahịa ebe ihe mere ji daa.

Ọkụ agbaala n'ahịa Ọgbọọgwụ dị n'Onitsha

Ebe ọkụ gbara n'ahịa Headbridge dị n'Ọnịcha.

Ebe foto si, Screenshot/Other

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ọkụ na-agba n'ahịa Ogbo ogwu dị na 'Headbridge' Onitsha.

Ndị hụrụ ebe ihe mere na-ekwu na ọ bụ kemịkalụ gbapụrụ dịka ogbunigwe mana amabeghi nke bụ eziokwu.

E kwukwara na ọtụtụ ndị mmadụ nwụrụ na ya bụ ọdachi mana amabeghi ezi ọnụọgụgụ ndị nwụrụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga ekwuola na ndị ọrụ mmenyụọkụ kwụ chịm n'ebe ahụ.

N'ime ihe onyonyo ndị na-efegharị na soshal midia, ị nwereike ịhụ ebe ọkụ na-agba n'ebe akpọrọ 'Gọvernment Line' n'ahịa ahụ.

Ndị ime ahịa ahụ na-ekwukwa na ọkụ ahụ malitere ịgba kemgbe etiti ụbọchị bụ elekere iri na abụọ.

Ahịa ebe ọkụ gbara
Ebe ọkụ gbara n'ahịa Headbridge dị n'Ọnịcha.

Kedụ ihe kpatara ọkụ ahụ?

Mgbe BBC garuru n'ahịa ahụ, ụfọdụ ndị na-azụ ahịa n'ebe ahụ gwara onye ntaakụkọ anyị na ọ bụ ebe edobere Kemikal ka ọkụ ahụ si bịa.

O kwuru na ha gwara ya ebe adọsara kemịkal n'ahịa ahụ gbapụrụ dịka ogbunigwe were malite ịgba ọkụ.

Otu onye hụrụ ebe ihe mere gwara BBC na ọkụ ahụ si n'ime ụlọ mapụ otu nwaanyị.

Ha kwukwara na ọ kụrụ nwaanyị ọzọ n'ala ma dọwaa ntị ya.

Mana onyeisi ndị ọrụ mmenyụọkụ apụtabeghi kwuo ihe ọ bụ butere ya bụ ọkụ.

Kepu kepu na-ekwukwa na ọtụtụ ndị mmadụ nwụrụ na ya bụ ọdachi mana amabeghi ezi ọnụọgụgụ ndị nwụrụ.

Ka ihe si kwụrụ ugbua, emenyụọla ọkụ ahụ na-agba ebe ndị ọdọ ahịa ha dị nso n'ebe ahụ ka na-azọpụta ngwa ahịa ha ndị fọrọnụ.