Ọ bụ ọgụ dara n'etiti ndịagha na ndị ohi mmanụ butere nsogbu n'Izombe - Gọọmentị Imo

Ebe foto si, Imo State Government
Gọọmentị Imo steeti ekwuola na ọ dị mwute etu ogu dapụtara n'etiti ndị agha Naịjirịa na ndị ohi mmanụ agbịdị si bute nnukwu ọgbaaghara n'obodo Izombe n'Imo steeti.
Declan Emelumba bụ Kọmishọna mgbasaozi n'Imo steeti kwuru nke a n'akwụksọ ozi o zipụrụ n'ụbọchị Tọzde ma kwuo na Gọvanọ Hope Uzodinma ehibela kọmiti ga-enyocha ihe mere n'Izombe n'ụbọchị Mọnde, Nọvemba 7, afọ 2022.
Emelumba kwuru na obere nnyocha ha mere gosiri na ọ bụ ndịagha na ndị ohi mmanụ agbịdị nwere nsogbu, nke butere ọnwụ otu onye agha, ma mezie ka ndị agha were iwe wakpo obodo ahụ.
"Dịka anyị na-eche mpụtara nnyocha nke Gọvanọ Hope Uzodinma kwuru ka e mee, anyị na-arịọ ndị niile okwu a gbasara ka ha nọrọ jụụ ma hapụ ka udo chịa," Emeumba kwuru.
"Anyị na-arịọ ndị nkịtị ka ha hapụ ị na-akpasu ndị ọrụ nchekwa iwe n'ụzọ ọbụla ka onye ọbụla biri n'udo."
Chinedu Nnadi, bụ otu onye obodo Izombe gwara onye ntaakụkọ anyị na ndị obodo gbara ọsọ ejirila nwayọ nwayọ na-alọghachi.
"Ihe mere na be anyị dị egwu," Nnadi kwuru. "Otu onye okenye anyị bụ Dee Celestine nwụrụ n'ihi obi mmapụ. Ha gbara ahịa anyị ọkụ, gbaa ọtụtụ ụlọ ọkụ. Gọọmentị kwesịrị itinye ọnụ ka mwakpo ndị a kwụsị kpamkpam n'obodo anyị."
Etu ndị 'Ebube Agu' na ndị agha Naịjirịa si wakpoo obodo anyị - Ndi Izombe
Precious Kelechi Igwe bụ otu n’ime ndị ndu n’Izombe nke dị n’Okpuruọchịchị Oguta nke Imo steeti, akọwaala etu mwakpo ha sị na ndị agha Naịjirịa na ndị Ebube Agu mere na be ha ụbọchị Mọnde si mee.
Ọ sị na ihe butere ya bụ ihe bụ na otu trọkụ bụ mmanụ agbidi e kere n’akpa bata na be ha abalị atọ gara aga.
Mgbe ụmụ ntorobia huru ndị a, ha kwụsịrị ha, nke mere ka ha na ndị bu mmanụ ahụ nwee nghọtahie.
Otu onye so trọkụ ahụ gbaa ọsọ mechara kpọrọ ndị agha lọghachite maliete ịgba egbe aghara aghara.
Mgbe nke a na-eme, otu ukwu ụgbọala trọkụ ahụ gbawa maka mgbọ tụrụ ya.
Ọ sị na ndị agha Naịjirịa bịara nyere ndị ahụ aka gbawa egbe ruo mgbe ha bupuru trọkụ ahụ bụ ya bụ mmanụ.
Kelechi sị na tupu nke a emee, na ndị obodo nwere ọgbakọ ebe a gbaara aha ama na ndị agha na ndị Ebube Agụ ga-abịa ọgụ n’obodo ha.
“Anyị n’onwe anyị bụ ndị isiobodo n’asị ha ha atụla ụjọ maka na gọọmentị agwabeghị ha ihe dị otu a”.
Ọ sị na ụnyaahụ bụ Mọnde, na ndị agha bịara buru ụgbọala ha gagharịa n’obodo, mana ọnweghị onye ya na ha nwere esemokwu ọbụla.

Ọ sị na mgbe ndị obodo malitere gbawa ọsọ, na “ndị agha sị ha agbala ọsọ na o bụ udo ka ha ji bịa, na ọ bụ “Operation Golden Dawn" gọmmentị hiwere ka ha na-eme maka ịchekwa ndị obodo. Anyị che na ọ bụ ihe ha bịara”.
Ọ sị na nke a mere ka ndị obodo mepechaa ụzọ okporoụzọ ha niile.
Ka nke a mechere, dịka Kelechi kwuru, ndị Ebube Agu jiri iwe na ọnụma bata kwawa mgbọ aghara agha.
Ndị mmadụ malite ịgba ọsọ ndụ ha.
“Mgbe ahụ ka ndị Ebube Agụ ahụ malitere ịkpa mkpamkpa dị iche iche, ma ịgba ụlọ ndị mmadụ ọkụ”, Kelechi gwara BBC Igbo.
Ọ sị na ha gbara ụlọ ahịa n’Ọgbafọ Izombe nakwa ebe ndị ọzọ ọkụ.
Kelechị sị na ọtụtụ ndị mmadụ gbabachara ọhịa.
Ọ kwuru na, “mụ ọnwe m na-agwa gị okwụ ugbua bụ n’ọhịa ka m si pụta”.
Kelechi sị na ya ji ohere a arịọ gọomentị ka ha kwụsị oke igbu mmadụ na be ha.
“Ọ bụrụ na e nwere ndị ohi maọbụ ndị omekome na-enye nsogbu n’obodo, ha chọo ụzọ ha ga-esi chọta ndị ahụ, ndị obodo ga-enyere ha aka jide ha”.
Kelechi kọrọ ka otu nwoke bụ Nwauwa Onye Ndulukwu si gbalahụ ọnwụ. Ọ sị na ihe zọrọ ya bụ nwaamadị mgbe ha gbara ya egbe bụ na ọ gbara n’ala.
Ọ sị na ọ bụ nwaamadị ahụ ka ha bu ụzọ wakpoo.
O kwukwara na ha mechere ihe ndị a lawa na mgbede abalị mgbe ha mebichara ihe.
Ọ sị na o wutere ha na ha nụrụ na ndị agha boro ha ebubu igbu ndị otu ha.
Ọ sị na nke ahụ abụghị eziokwu maọlị.
Ihe ndị uweoji na Gọọmentị Imo steetị kwuru maka ya
Ndị uweijii Imo steeti ekwuola okwu gbasara kpamkpa ahụ kpara n'Izombe dị n'Okpuruọchịchị Oguta,Imo steeti ụnyaahụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Mike Abattam, mgbe BBC kpọtụrụ ya n'ekwentị n'ehihie Tuzde, sị na,"anyị anụbeghị na ọ nwere ihe mere n'Izombe".
Ọ sị na ọnwebeghị onye kpọtụụrụ ha maka ya bụ ihe kemgbe ọ mere maka na ụlọọrụ ha ebe ahụ gbara ọkụ.
Abattam sị na ya ga-ezipu ndị ọrụ ha ngwangwa ka ha ga mara ihe mere ebe ahụ.
N'aka ọzọ, Kọmishona Imo steeti bụ Declan Emeluba sị na "ọ bụ ebe ndị uweojii kwụ ka anyị kwụ. Anyị ekwesighị ịma ihe mere ebe ahụ karịa ndị uweojii".
Mgbe BBC jụrụ ya sị, ka ọ bụ ihe a ka ị chọrọ ka anyị dee.,
Maazi Emelumba sị na, " amaghị m ihe unu chọrọ ịde kama, anyị ekwesighị ịma ihe mere karịa ndị uweojii".
Etu ọgbaghara dị n'etiti ndịagha na ndị ntoroọbịa si taa isi ndị mmadụ n'Izombe
Ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị ọrụ nchekwa na ụfọdụ ndị ntoroọbịa obodo Izombe dị n'Okpuruọchịchị Oguta, Imo Steetị ataala isi ọtụtụ mmadụ ma laa ngwa ụlọ n'iyi.
Nke a mere n'ụbọchị Mọnde 7 Nọvemba 2022, mgbe e zigara ụfọdụ ndịagha nke ngalaba 34 Artillary Obinze ka ha ga-arụọ ọrụ nchekwa n’obodo a na-emepụta mmadụ agbidi.
Kepukepu kọwaara na ụfọdụ ndị ntoroọbịa wakporo ụgbọala gwongworo ma gbuo onye na-akwọ ya n’ụbọchị abụọ gara aga, nke kpatara ndị ọrụ nchekwa jiri bịawa n’ebe ahụ.
Akụkọ sị na ụfọdụ ndị ntoroọbịa obodo wakporo ụgbọala ndịagha a, nke mere ha jiri malite ịgba egbe aghara aghara.

Otu onye si n’obodo ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na akụkọ a bụ eziokwu ma boo ebubo na ndịagha wakporo obodo ha.
Ọ sị na ndịagha batara obodo ha ma bido ịgba egbe aghara aghara. Mana ọnụ na-ekwuru ndịagha ngalaba 34 Artillary Obinze, Imo Steeti bụ Joseph Akubo gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo n’ekwentị na ndịagha awakpoghi obodo ahụ.
Ọ sị na ọ bụ ndị ntoroọbịa wakporo ndịagha na-arụ ọrụ nchekwa dịịrị ha maka etu nchekwa si dị ọjọọ n’obodo ahụ.
“Ọ bụghị ndịagha wakporo obodo a kama ndịagha nọ na-arụ ọrụ nchekwa dịịrị ha mgbe ndị ntoroọbịa malitere ibuso ha agha.
“N’ụbọchị abụọ gara aga, a wakporo ụgbọala gwongworo Dangote ma gbuo onye na-akwọ ya bụ ụgbọala.”
Akubo gara n’ihu kwuo na ọ mabeghi mmadụ ole nwụrụ maọbụ merụrụ ahụ maka na ọgụ a ka na-aga n’ihu.
Nke a abụghị mbụ ụdịrị ihe a na-eme n'obodo Izombe. N'ọnwa Ọktoba afọ 2021, ndịagha Naịjirịa wakporo obodo Izombe ma gbaa ọtụtụ ụlọ obibi nakwa ụlọahịa ọkụ.
Ha boro ebubo na ndị ntoroọbịa obodo a gburu ndịagha ibe ha.






