Ihe mere e ji gbuo ma lie Uchechi Nwachukwu n'Owerri

Ebe foto si, Nigeria Police
Ndị uweojii Imo steeti anwụchiela mmadụ abụọ gụnyere onye nlekọta otu ụlọorụ gaasị dị n'Imo steeti.
E boro ha ebubo ịkpa nkata izupu ego ụlọọrụ ahụ nke mere ka ha gbuo nwaanyị ahụ bụ ọdeeakwụkwọ nakwa ọgụego ụlọọrụ ahụ.
Dịka ha si kwuo, ezinaụlọ nwaada ahụ aha ya bụ Uchechi Nwachukwu mere mkpesa n'aka ndị uweojii na ọ gara ọrụ kemgbe ụbọchị 24 nke ọnwa Ọktoba maka ọ nataghị.
Nke a mere ndị uweojii ji malite nyocha n'ụlọorụ ahụ duuru ha chọpụta ili emighi emi ebe eliri ozu nwata nwaanyị ahụ.
Ha kwukwara na mgbe ha na-eme nnyocha, ha hụrụ ọbara gbasara n'ọgba aja n'ime mbara ụlọọrụ ahụ.
Nchọpụta ha mere gosiri na egburu nwaanyị ahụ n'ihi na ọ bụ ya na-ebuga ego ụlọọrụ ahụ n'ụlọakụ kwa izu ụka.
Ha kpara nkata igbu nwata nwaanyị ahụ ma zupu ego niile ha na-akpakọta n'ụlọọrụ ahụ.
Kedụ etu e si chọpụta maka ọnwụ nwaada a?

Ebe foto si, Imo state Police command
N'ozi nke ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Michael Abattam binyere aka na ya, ọ kowara etu ndị uweojii si rụo ọrụ nyocha gbasara okwu a.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
O kwukwara na ha chọtara mma obejiri nakwa ihe e ji egwu ala n'ebe ha bọpụtara ozu nwagbọghọ ahụ.
Ozi ahụ sị "Mgbe ndị ezinaụlọ Nwachukwu mechara mkpesa n'aka ndị uweojii, e zipuru ndị gara n'ụlọọrụ ya ịmalite nyocha ma gbaa ndị mmadụ ajụjụ ọnụ".
"A chọpụtara na Nwaada Nwachukwu na-arụ ọrụ ọgụ ego nakwa odeeakwụkwọ na-elekọta ụlọorụ ahụ dịka onye nwe ya bi n'ofesi"
"Ọ bụkwa Nwachukwu na-ewega ego ọbụla akpatara n'ụlọakụ kwa izuụka"
Mgbe ndị uweojii bu ụzo ga n'ụlọorụ ahụ legharịa anya, o nweghi ihe pụrụiche ha hụrụ. Ha mechara gaa n'azụ ụlọorụ ahụ ịga n'ihu na nyocha ha.
Ọ bụ ebe ahụ ka ha "hụrụ ọbara tesara n'ọgba aja nke mere ka ha malite ngwuputa n'akụkụ ebe ahụ"
Ha hụrụ ahịhịa ochie e desara okwute n'elu ya ma mgbe ha boghere ebe ahụ, ha ahụ ozu nwaanyị ahụ ezinaụlọ ya na-achọ achọ kemgbe.
Ndị uweojii ahụ nwụchiri mmadụ abụọ a na-ebo ebubo ọnwa a dịka ha na-eche na mma obejiri nakwa ihe e ji egwu ala ha chọtara bụ ihe ndị ahụ ji kugbu nwaada Nwachukwu.
E bugaala ozu ahụ ha chọpụtara n'ọbaozu dị n'ụlọogwụ FMC dị n'Owerre ka e mee ya nyocha.

Ebe foto si, Getty Images








