Izombe crisis: Ihe mere n'Izombe wutere m ruo n'ọkpụkpụ maka na ana m ahụta ya ka obodo nke m - Uzodinma

Gọvanọ Hope Uzodinma nke Imo steeti ekwupụtala nnukwu mwute o nwere gbasara ihe mere n'obodo Izombe, n'Oguta.
Uzodinma kwuru nke a dịka ọ na-agwa ndị okenye obodo ahụ okwu n'ụbọchị Tuzde.
O kwuru na ya bụ ihe wuteruru ya n'ọkpụkpụ n'ihi na ọ na-ahụta Izombe dịka obodo ya.
"Iji kwuo eziokwu, ihe a wuteruru m n'ọkpụkpụ n'ihi na Izombe dịka obodo m. Ọ na-ewute m na ụdị ihe a na-eme n'obodo m," Uzodinma kwuru.
"Obodo a bụ otu obodo nyere m nkwado pụrụ iche kamgbe m malitere ọrụ dịka onye ndọrọndọrọ ọchịchị, ma oge m nọ na sineti."
"Ọ dị mụ nnukwu mwute ịnụ na ọ bụ n'obodo a ka ndị ntorobịa na-akpa aghara, na-egbu ndị ọrụ nchekwa, na-edokọba egbe."
"Gịnị na-ewe ha? Gịnị bụ isi nsogbu a? Gịnị mere ụnụ abịaghị kọsara m? Onweghị ihe mụ na ụnụ enweghị ike ịkpa."
Uzodinma kwuru na ya ma na ụdị aghara a abụghị ihe e ji mara obodo Izombe, ya mere o ji dị mkpa na anyị ga-achọpụta ndị ntorobịa na-akpa agwa ọjọọ dị otu a.
Etu e si gbaa ihe karịrị ụlọ 40 ọkụ n'Izombe, Imo steeti
Onye ntaakụkọ BBC Igbo kọwara ihe o ji anya ya hụ ka ọ garuru obodo Aborsi dị n'Izombe, Imo steeti bụ ebe a gbara ihe karịrị ụlọ 40 ọkụ n'ụbọchị Fraịde.
BBC hụrụ ọtụtụ ụlọ mebiri emebi; ndị gbara ọkụ na ndị aja eji kpụọ ha dachara ada.

Ndị obodo ahụ na-ebo ndị agha ebubo mwakpo na mmụnye ọkụ a.
Ndị nke gwara BBC Igbo okwu sị na ihe butere ya bụ ọgụ bụ maka azụmahịa okpuru nke mmanụ agbịdị (oil bunkering) nke ha sị na ụfọdụ ndị agha na ụmụokorobia obodo ahụ na-azụkọrịta, bụ nke ha na-eme 'a gbata e kee' mechara dapụtara ha okwu.

Ndị obodo ahụ sị na otu n'ime ndị agha ahụ gbagburu otu onye okorobịa nke kpasuru ha iwe mere ka ha bọgwọrọ ọbọ, gbuo ndị agha abụọ ma napụ ha egbe ha.
Nke a mezịrị ndị agha fọrọ ebe ahụ ji gaa kpọta ndị otu ha, buru ụgbọala agha na ụgbọala ndị ọzọ ha sị ruru 18 bịa buso obodo ahụ agha n'isi ụtụtụ Fraịde.
Ndị gwara BBC Igbo okwu kwuru na ha niile gbafuchara ọsọ, nke mere ka ndị agha ahụ mụnye ụlọ niile ahụ ọkụ.




BBC Igbo ka na-anwa inweta ndị agha ka ha tinye ọnụ n'okwu a.
Anyị ga-achọpụtarịrị ndị omekome mebiri ihe n'obodo Izombe - Gọvanọ Hope Uzodimma
Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodimma ekwuola na ha ga-achọpụtarịrị ndị niile kpatara ọgbaghara n'obodo Izombe dị n'Oguta, Imo Steeti.
Uzodimma kwuru nke a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'ụbọchị Mọnde.
O kwuru na ọ ga-ehibe kọmitii pụrụ iche ga-enyocha iji chọpụta kpọmkwem ihe kpatara ọgbaghara ahụ.
Cheta na ndị obodo na-ebo ebubo na ọ bụ ndị agha malitere ịgba ụlọ ndị mmadụ ọkụ, n'ihi na ndị ekperima gburu otu onye agha.
Mana Uzodimma kwuru na ọ dị mwute etu ndị ekperima si "wakpo ndị agha, gbaa ụgbọala ha ọkụ, tọrọ ndị agha abụọ ma gbuo ha, ma werekwa egbe ha".
"Ihe a merenụ ebulitela iwu ndị ọrụ nchekwa tiburu ka onye ọbụla nwere egbe, n'agbanyeghị ụdị nnukwu mmadụ onye ahụ bụ, weghachiri ya ndị ọrụ nchekwa".
"Gọọmentị ga-agba mbọ ịhụ na iwu a bịara na mmezu, anyị ga-anwụchirịrị ndị omekome niile ma nye ha ntaramahụhụ kwesịrị ya.
Ndị agha abụọ na otu onye nkịtị nwụrụ n'ọgbaaghara dapụtara n'Izombe, Oguta

Ebe foto si, Getty Images
Mmadụ atọ atụfuola ndụ ha n'ọgbaaghara dara n'obodo Izombe nke dị n'okpuru ọchịchị Oguta, Imo steeti, n'ụbọchị Fraịde.
Ha gụnyere ndị agha abụọ na otu onye nkịtị, dịka ndị obodo ahụ si gwa onye ntaakụkọ anyị.
Otu onye obodo ahụ gwara onye ntaakụkọ anyị na ihe kpatara nke a bụ oge ndịagha bịara ịnwuchi otu nwa okorobịa si n’ụlọ mkpọrọ gbaa ọsọ, aha ya bụ Obera, mana ndị otu nwoke ahụ ekweghị.
Oge ọgbaaghara a malitere, ndị ntorobịa ahụ chụrụ ndị agha ọsọ ma gbuo mmadụ abụọ n'ime ha, gbakwaa otu ụgbọala ha ọkụ.
Mana ndị agha mechara bịaghachi wee malite ịchụsasị ndị mmadụ n’obodo ahụ. Ebe ahụ ka otu onye nọrọ tufuo ndụ ya.

Onye ahụ gwara onyentaakụkọ anyị okwu kwuru na ha ncha nọ n’ọsọ ugbua n’ihi na ndị agha na-achụsa onye ọbụla ma na-emebikwa ọtụtụ ihe.
Ụlọntaakụkọ 'Daily Trust' kwuru na otu n'ime ụlọ ndị agha ahụ kuriri ma gbaa ya ọkụ bụ ụlọ eze ọdịnala na-achị obodo ahụ, aha ya bụ Eze Muforo.
Oge onye ntaakụkọ anyị kpọrọ Sunday Akuga, bụ ọnụ na-ekwuru ndị agha ngalaba 34 ‘artillery brigade dị n’Owere, o kwuru na ya anụbeghị maka ihe a merenụ, mana ọ ga-ezighachiri anyị ozi.

