Ihe ndị dị na nnyocha Amerịka mere banyere ogbugbu ndị ụka Kraịst na Naịjirịa

Aha onyonyo, Ihe ndị na nnyocha Amerịka mere banyere ogbugbu ndị ụka Kraịst na Naịjirịa
Ihe ndị dị na nnyocha Amerịka mere banyere ogbugbu ndị ụka Kraịst na Naịjirịa

Onyeomeiwu mba Amerịka bụ Riley Moore ewepụtala akwụkwọ nnyocha ha mere banyere akụkọ mkpagbu ndị ụka Kraịst na Naịjirịa ma ziga ya n'obi ọchịchị ha bụ White House'.

N'akwụkwọ ozi ahụ, o kpughere ọtụtụ ihe dị iche iche ha chọpụtara nke gụnyere na "Naịjirịa bụ ebe kachasị ọjọọ n'ụwa ịbụ onye okpukperechi Kraịst."

Ozi a kwuru ndị ojiegbe si agbụrụ Fulani nakwa ndị otu ozọ na-eyi ndụ egwu na-awakpo ma na-egbusi ndị ụka Kraịst, ọkachasị na mpaghara ugwu.

O Kwuru na ụfọdụ iwu dị ire na mpaghara ugwu Naịjirịa ka e ji egbochi ikike nkwuwa okwu ma na-akpagbu ndị Kraịst bi na mpaghara ahụ.

Donald Trump Onyeisiala mba Amerịka

Ebe foto si, Getty Images

Omeiwu Riley Moore na ndị otu ya tụrụ arọ usoro e nwereike iji kwụsị ma gbochie mkpagbu ndị a.

Akwụkwọ ozi a pụtara dịka Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump gbọpụtara Naịjirịa dịka mba a na-elekwasị anya dị aṅaa a kpọrọ 'Country of Particular Concern' n'ọnwa Ọktoba 2025.

Onyeisiala Trump nyere omeiwu Riley Moore na ndị ọzọ iwu ka ha mee nnyochaa banyere akụkọ ogbugbu a na-egbusi ndị ụka Kraịst na Naịjirịa.

Mana gọọmenti Naịjirịa jụrụ ịnabata mkpọpụta ahụ ma kwuo na Naịjirịa nsogbu nchekwa nke na-emetụta ma ndị ụka Kraịst, ndị okpukperechi Alakụba nakwa ndị ọdịnala.