Ihe mere m ji gbaa arụkwaghịm dịka mịnịsta Ọkụ n’oge Jonathan - Barth Nnaji

Aha onyonyo, Ihe mere m ji gbaa arụkwaghị dịka mịnịsta ọkụ latrịk n’oge Jonathan - Barth Nnaji
Ihe mere m ji gbaa arụkwaghịm dịka mịnịsta Ọkụ n’oge Jonathan - Barth Nnaji
Barth Nnaji na Goodluck Jonathan

Ebe foto si, BBC/Goodluck Jonathan/Facebook

Ọkammụta Barth Nnaji bụbụ Mịnịsta na-ahụ maka ọkụ latrik na Naijiria n’oge ọchịchị aka chịbụrụ Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan akọwaala na ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na ndị enyi ha achọghị ka ya gbasoo ụsoro ziri ezi na nhọrọ ndị ga-azụ ụlọọrụ latrik ndị gọọmentị resịrị ndị nkịtị mere ya ji tinye akwụkwọ arụkwaghịm.

Nnaji bụ onye hazirị atụmatụ ire akụkụ dị iche iche metụtara ọkụ latrik na Naijiria tupu ọ gbaa arụkwaghịm n’ike n’afọ 2012 nke tụụrụ ọtụtụ ụmụ Naijirịa.

Barth Nnaji
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere na nsonso a, Barth Nnaji, onye rụbụrụla ọrụ inginia ọkaibe na mba Amerịka tupu ọ lọta rụwa ọrụ mịnịsta na Naịjirịa kwuru na ya na-azọ isi onwe ya oge ahụ nke mere ka o tinye akwụkwọ arụkwaghịm ahụ n’ihi na ya achọghị imetọ aha ya.

Nwa afọ a bụbụkwa Minista na-ahụ maka Sayensị na Naịjirịa kwukwara na ihe abụọ mịnịstri ya mapụtara maka itozu ịzụ ụlọọrụ na-ekesa ọkụ latrik a kpọrọ ‘discos’ na Bekee bụ na ụlọọrụ ọbụla ga-azụta ya ga-enwe akatamkpo ego n’akpa iji tinye n’ịrụzi ihe ndị dị mkpa.

Nke a abụọ bụ na ụlọọrụ ahụ ga-abụ nke ihe gbasara ọkụ latrik doro anya nke ukwu .

O kwuru na ọ bụ n’ihi na ya kwechiri n’ịhụ na ọ bụ naanị ụlọọrụ ndị nwere ihe abụọ a bụ ndị ga-azụtali ụlọọrụ latrik nke Gọọmentị Naijiria chọrọ ire oge ahụ mere ka ndị anya ha dị n’izụ ụlọọrụ ndị a mana ha enweghị ihe a chọrọ jiri kpawara ya nkata ọjọọ.

O sịri na ọ bụrụ na ya gbara isi akwara ghara itinye akwụkwọ arụkwaghịm, a kara igbu ya.

"Ọ bụrụ na nọrọ dịka Mịnịsta , ọ ga-abụ na ha ka egburu m maọbụ na m kwetara soro ha na-emetọ aka etu ha chọrọ."

Nnaji kwuru na ọ bụ n’ihi na emeghị atụmatụ ahụ a kpọrọ ‘Privatatsation’ etu o kwesịrị mere na Naijiria ka na-enwe nsogbu inwe ọkụ latrịk rue ugbua.

O meela ihe karịrị afọ 10 e resịrị ndị nkiti akụkụ ụlọrụ latrik dị iche iche na Naịjirịa.

N’okwu ụlọọrụ Aba Geometric power plant, o kwupụtara ọnọdụ ọkụ dị na mpaghara Aba oge ha zere ya ma kọwa nsogbu ha nwere na ime ka atụmatụ ahụ nke o kwuru ruola pasent 97 ịbịa na mmezu.

Na nchịkọta Nnaji kwupụtara ihe mmepe ụlọọrụ ghara emere ndị bi na mpaghara ahụ ma ọ bụrụ na obido ọrụ n’ọnwa ole na ole na-abịa.

Gee ihe ndị o kwuru n'uju n’ihe onyonyo dị n'elu akụkọ a.