Hushpuppi sentencing: Lee ego ole ụlọikpe sị na ekperima ịntanetị a atụrụ mkpọrọ afọ 11 ga-akwụ ndị o gwuru wayo

Hushpuppi

Ebe foto si, Instagram

Ụlọikpe dị na mba Amerịka atụọla otu nwa afọ Naijiria a ma ama dịka Hushpuppi n'Instagram, nga afọ 11 na ụma maka iji intanetị zuo ego ndị mmadụ na mbaụwa.

Hushpuppi, onye ezi aha ya bụ Ramon Abbas, na-esiri ndị Amerika nakwa ndịọ ọzọ si mba ofesi ọnya o ji anapụ ha akatamkpo ego dịka ụlọrụ FBI si kwuo.

Nwa amadị ahụ nna ya na-agba taxi, nne ya na-agba mgbere na-egosi ọgaranya n'ihu akwụkwọ ọbaozi ya n'Instagram bụ ebe o nwere mmadụ nde abụọ na ụma asatọ (2.8 m) na-eso ya.

Ọkaikpe kpere ya bụ ikpe na Los Angeles, nyekwara iwu ka ọ kwụọ mmadụ abụo n'ime ndị o gwuru wayo dọla 1,732,841 (£1,516,182).

Hushpuppi ga-anọ ọnwa 135 na mkpọrọ etiti nke mba Amerịka.

Akwụkwọ ụlọikpe kwuru sị, "Ikpe a amara ya bịara na mmezu site na njikọ aka nke ndị ọrụ nchekwa ọtụtụ mba bụ ihe ịdọ aka na ntị nye ndị na-ekwu wayo na mba ụwa na FBI ka akpara ha aka ma ha anọ n'Amerịka ma ha anọ mba ndị ọzọ ma nwetara ndị ha zuru ego ha ikpenkwụmọtọ."

Na nso nso a, ụlọọrụ Instagram mechiri akara Instagram nwa amadị a.

Ozi ha kọwara na Hushpuppi dara iwu na-echekwa ndị ji ọba ozi ha agbasaozi.

Ozi ha dere “Anyị achọghị ka onye ọbụla jiri ọba ozi anyị na-ezu ohi ịntanetị maọbụ na-anapụ ndị mmadụ ego n’ike n’ụzọ ezighi ezi, o doro ọha anya na nke a megidere iwu anyị” nke bụ ihe otu ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ Meta bụ ndị nwe Instagram kwuru.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post

Hushpuppi

Ebe foto si, Hushipuppi/Instagram

Na mmalite...

N’afọ 2021, Husphpuppi kwetara na ya bupuru akatamkpo ego nke Bekee kpọrọ ‘money laundering’.

Dịka akwụkwọ ụlọikpe siri kwuo,o kwetara na ya gbalịrị izu ihe karịrị out nde dọla na ụma n’aka out onye chọrọ iwube ụlọakwụkwọ ụmụaka na Qatar

Hushpuppi mere ka ya abụ ndị ọrụ ụlọakụ site na ịrụ websaịtị.

Cheta na n'ọnwa Juun, afọ 2020, ndị uweojii mba ụwa nke 'Interpol' nwụchiri Hushpuppi(bụ onye na-ewu ewu n'Instagram maka igosi akụ; akwa, akpụkpọụkwụ, elekere aka na ihe ndị ọgaranya ndị ọzọ) nke ha sị na o nwetara n'ụzọ ezighi ezi, na Dubai ebe o bi.

Ha kpụpụrụ ya ụlọikpe na mba Amerịka maka igwu ọtụtụ ndị ojiegoachụego chandum nke nchịkọta ego ya ruru nde kwuru nde dọla site n’ịntanet.

E nyochara ya maka ịnapụ ndị mmadụ ego dọla nde 24 .