Rotimi Amaechi: Buhari bụ nwanne mmadụ maka ịrụrụ Akwammiri Naija nke abụọ

Aha onyonyo, Rotimi Amaechi: Buharị bụ nwanne mmadụ maka ịrụ Akwammiri Naija nke Abụọ

Mịnịsta na-ahụ maka njem bụ Rotimi Amachi akọwaala ihe kpatara o jiri bụrụ onye kacha mma ịzọ ọkwa onyeisiala Naijiria n'afọ 2022.

O kwuru na onye ahụ ga-abụ onye ga-akwalie akụnaụba na onye ga-egbo ọgụ nsogbu ndakpọ nchekwa.

Na mkparịtaụka ya na BBC nwere na nsonnso a, Amaechi kwuru na ya bụ naanị onye na-azọ ọkwa onyeisiala bụrụla onyeisi ụlọomeiwu nke steeti, Gọvanọ nakwa Minista.

Ọ kwuru na o nweghị onye mụtara ka ihe si aga n'ọchịchị obodo ruo ya n'ime ndị nile na-azọ ọkwa Onyeisiala afọ 2023.

O kwuru na ọchịchị ọ chịrị Rivas Steeti ebe e nwere nsogbu nchekwa ndị' militant' butere gosiri na ya nwenwuru ike igbo ọgụ na nsogbu nchekwa na Naijiria dịka onyeisiala.

N'okwu mkpagbu ndị Igbo na-ebo Onyeisiala Muhammadu Buhari, Amaechi kọwara Buhari dịka "nwanne mmadụ", kwuru na ọchịchị Buhari rụrụ ndị Igbo Akwammiri Naija nke Abụọ, nke ọchịchị Goodluck Jonathan nke ha were ka ọchịchị Igbo arụghịrị ha.

Onye bụ Amaechi?

Rotimi Amaechi bụ mịnịsta na-ahụ maka njem.

Tupu ọ banye n'ọkwa ya ugbua, ọ bụ gọvanọ chịị Rivas steeti.

Ọ bụbụ Onyeisi Ụlọomeiwu Rivas steeti

Gee ihe o kwuru n'uju: