Etu ndị 'unknown gunmen' si chụsaa ndị mmadụ n'Uli, Anambra steeti, taa

Ebe foto si, Getty Images
Ọgbaghara dara n’Uli, nke dị n'okpuru ọchịchị Ihiala n'Anambra steeti, n’ụtụtụ taa bụ Tuzde, Nọvemba 8, mgbe ndị amaghị ndị ha bụ ji egbe bịara chụsaa ndị mmadụ pụtara ahịa na mpaghara ahụ.
Otu onye achọghị ịkpọ aha ya n’arụ n’ụlọọgwụ n’Uli sị na, “ndị mmadụ gbara ọsọ ndụ mgbe ndị anyị amaghị bu egbe pụtara n’ụtụtụ a sị ndị mmadụ ha baa n’ụlọ”.
Ọ sị na ndị mmadụ malitere ịgba ọsọ nke butere ọgbaghara ebe niile.
Nwaanyị ahụ sị na “ndị ọrụ m zipuru ka ha ga gbaa ụmụakwụkwọ ọgwụ ji ọsọ gbaghachite azụ”.
Ọ sị na ya bụ ihe mebiiri ha ihe nke mere na ha agbaghịzị ụmụakwụkwọ ọgwụ ha kwesiri ịgba ha taa.
O kwukwara na ka ihe a mechere udo lọghachitere mgbe ndị agha bịara gagharịwa.
Ya bụ nwaanyị na-ekwu na ya na-eche na ọ bụ esemokwu dapụtara n’ime obodo butere ya bụ ihe, “mana ndị ụweojii, ndị Ebubeagụ na ndị agha bịaziri sonye ihe n’eme”.
Akụkọ pụtara n’ụtụtụ taa kwuru na ndị ji egbe ndị amaghị ndị ha bụ wakporo ọnọdụ ndị uweojii n’ụzọ si Ihiala ga Uli mgbe o ji ọkara gafe elekere iri nke ụtụtụ taa.
Akwụkwọ ahụ kwuru na ụfọdụ ndị ọkwọ ụgbọala hapụchara ụgbọala ha, gbabaa ọhịa.
Mana ndị uweojii Anambra steeti sị na ha amaghị ihe ọbụla gbasara ya bụ ihe a sị merenụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra bụ Toochukwu Ikenga kwuru na ha enwetabeghị ụdị mkpesa ahụ taa.
Mana ụfọdụ ndị bi n'obodo Uli gwara BBC na ọ bụ eziokwu na ndị ojiegbe chụsara ndị mmadụ na mpaghara ahụ taa, mana ụfọdụ mechara lọghachi ebe ụfọdụ kpochiri ụlọ ahịa ha laa.









