Onitsha fire: 'Ọkụ gbara ụlọelu nna m otu ịzụụka Gọọmentị Anambra ji kụkpọcha abụọ ndị ọzọ'

Ọtụtụ ndị mmadụ nọ n'akwa dịka ụlọ elu ogogo atọ gbara ọkụ pịapịa na Woliwo Ọnicha, Anambara steeti n'ụtụtụ taa bụ Monde.
O nweghị onye nwụrụ na ya bụ ọkụ mana ego na ihe e ji biri n'ụlọ ruru nde kwuru nde naira lara n'ihi n'ọkụ ahụ.
Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na a mabeghị ihe butere ya bụ ọkụ malitere n'ebe elekere atọ nke chi ofufo.
Ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere ndị bi n'ụlọ ahụ na ndị agbataobi gbalịrị inye aka ka zọpụta ndị tọọrọ n'ụlọ ahụ ma menyụọ ọkụ ahụ tupu ndị ọrụ mmenyụ ọkụ steeti ahụ abịa menyụọ ọkụ ahụ.
Mana tupu nke a e mee, ọkụ eriela akụ na ụba ọtụtụ ndị mmadụ bi n'ụlọ ahụ gunyere onye bi n'ụlọ kwuru na o dowere puku narị naira abụọ n'ụma nke ọ gara etinye n'ụlọakụ ma e wepụ 'nọrọụlọ a na-eme n'Ọwụẁa Ayanwụ kwa Monde ọbụla.

Kelechi Ezeagụ bụ onye nlekọta ụlọ ahụ ma bụrụkwa nwa onyenweụlọ bụ Ambrose Ezeagu gwara BBC Igbo na " Anọ m n'ebe Elekere atọ nke Ụtụtụ ka m nụrụ olu ndị mmadụ na-eti mkpu."
"Ndị bi n'ụlọ ahụ agbatuola na-ebe akwa."
N'okwu ihe butere ọkụ ahụ, Ezeagu kwuru na "O nwere ike ọ bụrụ ihe aka mere."
Ọ kọwara sị, "Ọkụ latrik adịghị n'ụlọ ahụ n'ihi na n'ọnwa Febụwarị ka anyị degara ụlọọrụ na-enye ọkụ akwụkwọ ka ha nye anyị mita."
" Nke ọzọ bụ o nweghị onye bi n'ọnụụlọ ahụ ọkụ ahụ malitere. Onye bi na ya kwapụrụ onwa ole na ole gara aga."
"Mana ihe anyị na-ekelere Chukwu bụ na o nweghị onye nwụrụ." Ezeagụ tụrụ arịrị na ọdachi ọkụ ọgbụgba na-abịa otu ịzụụka Gọọmentị Anambra steeti kụkpọchara ụlọ abụọ ndị ọzọ nke nna ya bụ Ambrose Ezeagụ hapụrụ ha were laa mụọ.
Ọnụụlọ 14 n'ime ọnụụlọ 28 dị n'ogogo nke atọ ụlọ ahụ gbara ọkụ kpamkpam.









