Ị na-eme njem n'Ọwụwa Anyanwụ? Lee okporoụzọ ị kwesịrị ịgbara ọsọ n'ihi ihe egwu

Okporoụzọ Atanị

Ebe foto si, Screengrab

Nkọwa foto, Okporoụzọ a banyere Atanị, dị n'okpuruọchịchị Ọgbaru
    • Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist

Njem okporoụzọ abụrụla agba e kpere chi na mpaghara dị icheiche na Naịjirịa, tinyere mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.

Kwa izuụka, akụkọ na-apụta maka mwakpo, ntọrọ, izu ohi nakwa ogbugbu ndị njem n'okporoụzọ ndị a.

Akụkọ a ga-eleba anya n'okporoụzọ dị icheiche ebe ụdị ọdachi ọjọọ a dakwasarala ndị mmadụ ugboro ugboro.

Okporouzo Ihiala

Ebe foto si, channels

Nkọwa foto, Foto e tinyere iji kọwaa akụkọ

Anambra Steeti

Okporoụzọ Ihiala/Orlu

Ebe foto si, Google Maps

Nkọwa foto, Ngozipụta okporoụzọ si Ihiala gawa Ọlụ

Okporoụzọ Ihiala/Iseke/Ọlụ

Na mbụ, ndị njem si Ọnịcha aga Ọlụ na-agbakarị okporoụzọ a maka na ọ bụ kacha nso, mana ugbua, ya bụ okporoụzọ abụrụla aga aga.

Nke mbụ bụ maka na e nwere mpaghara okporoụzọ ahụ mebiri emebi, nke ndị bi na mpaghara ahụ na-arịọ gọọmentị ka ha bịa ruzie.

Ọzọ bụ maka akụkọ mwakpo ndị ekperima, ntọrọ nakwa ogbugbu mmadụ na ya bụ okporoụzọ.

Ọ bụ n'okporoụzọ a ka ndị ekperima nọ tọrọ ndị agha Naịjirịa abụọ na-ala obodo ha maka agbamakwụkwọ.

Ndị ekperima a mechara gbuo mmadụ abụọ ahụ, ma wepụta onyonyo ebe ha na-ebepụ ha isi na soshal midia.

Ndị agha Naịjirịa boro ebubo na ọ bụ ndị otu na-azọ nnwereonwe Biafra bụ IPOB n'ịchafụ kpara arụ a, mana IPOB gọrọ agọ na ọ bụghị ha.

Ka ọ dị ugbua, ọtụtụ ndị na-anya ụgbọala na-asọ okporoụzọ Ihiala-Ọlụ asọ, maka na ejighi ihe a na-agba na ntị agba n'anya.

Linus Audu na nwunye ya bụ Gloria Mathew

Ebe foto si, Family

Nkọwa foto, Ọ bụ n'okporoụzọ si Ihiala gawa Ọlụ ka ndị ekperima tọọrọ Linus Audu na Gloria Mathew ma gbuo ha

Okporoụzọ Ụkpọ-Ọsumohu-Lilu-Azịa-Mbọsị

Akụkọ mwakpo na ogbugbu mmadụ n'okporoụzọ a dịkwa ọtụtụ, nke mere o ji bụrụ ebe a na-eze eze.

Ọ bụ n'okporoụzọ a ka ndị ekperima gbagburu Gabriel Ofoma, onye ọgaranya a ma ama dịka ọ na-aga Pọtakọtụ n'ọnwa Febrụwarị afọ a.

Gabriel Ofoma

Ebe foto si, Gabriel Ofoma Family

Nkọwa foto, Ndị ekperima wakporo ma gbuo Gabriel Ofoma n'okporoụzọ Ụkpọ-Ọsumohu-Lilu-Azia-Mbosị n'ọnwa Febrụwarị afọ 2022

N'okporoụzọ ahụ kwa ka a wakporo ma tọrọ Ọkaikpe Rita Pemu, onye na-arụ ọrụ n'ụlọikpe mkpesa dị n'Owere, Imo Steeti.

Nke a mekwara n'ọnwe Febrụwarị 2022, mana Ọkaikpe Pemu mechara mịpụ n'aka ndị omekome ahụ wee gbaa ọsọ ndụ.

Chetakwa na oge e mere ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra steeti n'ọnwe Nọvemba 2021, emeghị ntuliaka ọbụla na mpaghara Lilu na Orsumoghu.

Mana ka ọ dị ugbua, gọọmentị Anambra steeti ebusola ndị ekperima na-enye nsogbu na mpaghara ndị a agha dị egwu.

Okporoụzọ Ọzụbụlụ/Atanị

Okporoụzọ Ozubulu/Atani

Ebe foto si, Screengrab

Atanị bụ obodo dị nso n'Osimiri Naịja. Ọ dị n'okpuruọchịchị Ọgbaru n'Anambra steeti.

Ụfọdụ mpaghara okporoụzọ si Ozụbụlụ gawa Atanị ajọọla nnukwu njọ ugbu nke pụtara na ọtụtụ ndị ọkwọ ụgbọala anaghị ekwe agba ya bụ ụzọ.

Ọzọkwa bụ maka na ndị ekperima 'unknown gunmen' na-enyekwa nsogbu na mpaghara Ọgbaru, ọkachasị akụkụ Ọsọmala, Ogwu-Anịọcha, na ebe ndị ọzọ.

Imo Steeti

Okporouzo Akokwa-Arondizuogu

Ebe foto si, Akokwa Community

Okporoụzọ Akọkwa/Arondizuọgụ/Ụmụlọlọ/Ọkigwe

O teelarị mgbe okporoụzọ a ji bụrụ ebe a na-agbara ọsọ n'Imo steeti.

Okporoụzọ a bụ ebe kacha nso iji pụọ iro Ọkigwe/Ụmụahịa/Aba, mana ndị ekperima ọchịehi nakwa ndị ohi ejirila ebe ahụ mere isi ụlọọrụ.

Ọ bụ n'okporoụzọ a ka ndị ntọ tọọrọ ndị 'Reverend Sister' anọ n'ụbọchị ụka, abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Ọgọst afọ a.

N'ọnwa Disemba 2021, otu onye ọkwọ ụgbọala kọọrọ onye ntaakụkọ BBC Igbo etu o si gbalahụ ndị ekperima a na ya bụ okporoụzọ, mana mgbọ tụrụ ya n'aka dịka ọ na-agba ọsọ ndụ.

Okporoụzọ Ọlụ/Ideatọ

Okporoụzọ Ọlụ/Ideatọ

Ebe foto si, Motion Global

Nkọwa foto, Okporoụzọ Ọlụ/Ideatọ

Mkpamkpa ndị ekperima, tinyere mbuze, emeela ka okporoụzọ a, nke bụ ụzọ kacha nso jikọrọ mpaghara Ọlụ na Ideatọ n'Imo steeti, bụrụ aga aga.

Na mpaghara Ogboko dị n'Ideatọ Saụt, okporoụzọ a kewara abụọ n'etiti ya, n'ihi mbuze.

Iji gafee mbuze a, ndị ọkwọ ụgbọala na-agba ime obodo ime obodo tupu ha apụtakwa ebe ya bụ okporoụzọ dị mma ma malitekwa njem ha.

Mana n'ihi enweghị nchekwa, egwu anaghịkwa ekwe ụfọdụ ịgba ụzọ a.

Okporoụzọ Owere/Ọlụ

Ogbunigwe aka mere

Ebe foto si, Nigeria Army

Nkọwa foto, Ogbunigwe aka mere nke ndị agha Naịjiria sị na ha hụrụ n'okporoụzọ Owere/Ọlụ n'ọnwa Disemba afọ 2021.

Akụkọ gbasara mwakpo ndị ojiegbe apụtakwala ugboro ugboro n'okporoụzọ a.

N'ọnwa Disemba afọ 2021, ndị agha Naịjirịa kwuru na ha hụrụ ọtụtụ ogbunigwe nke ndị ekperima liri n'okporoụzọ a iji yie ndị njem egwu.

Ọzọkwa bụ na ya bụ okporoụzọ adịbughị mma, mana n'ọdị nso a gọọmentị Imo steeti kwuru na ha arụzichaala ya bụ ụzọ.

Abia Steeti

Uche Kanu
Nkọwa foto, Ụkọchukwu Uche Kanu bụ onyeisi ụka Methọdist na Naịjirịa. Ndị ntọ nwụchiri ya n'okporoụzọ Umunneochi/Leru/Isuochi
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Umunneochi/Isuochi

Naanị aha mpaghara a na-etinye ụjọ n'obi ndị mmadụ n'ihi ọtụtụ akụkọ mwakpo merela ebe a.

Ọ bụ na mpaghara a ka ndị ntọ tọrọ onyeisi ụka Methodist na naịjirịa bụ Uche Kanu n'ọnwa Mee afọ a.

Ụkọchukwu a kwụrụ otu narị nde naịra tupu ndị ntọ ahụ atọhapụ ya.

Mpaghara Lọkpanta

Mpaghara a dị n'okporoụzọ awaraawara si Enugwu gawa Pọtakọtụ, mana mpaghara a bụ ebe e nwere ogbe ndị na-achị ehi.

Lokpanta dịkwa n'okpuru ọchịchị Umunneochi n'Abịa Steeti.

N'ọnwa Jun afọ a, gọvanọ Okezie Ikpeazụ hibere kọmiti ga-eleba anya n'ụzọ a ga-esi weta ezi nchekwa na mpaghara ahụ.

O teghị aka, n'ọnwa Julaị, gọọmentị Abịa steeti kwuru na ha emebiela ụlọ nzuzo dị icheiche ebe ndị ekperima ji mere ebe obibi na mpaghara ahụ.

Mana akụkọ mwakpo kana-arịkwa elu na mpagha a, nke mere ndị ọkwọ ụgbọala ji eze ịgba ya.

Mpaghara Ohafia

Ohafia na obodo ndị gbara ya okirikiri abụrụla chi bọọ a nụ ọzọ n'okwu gbasara enweghị nchekwa.

Nke a emeela ka ndị ụgbọala chịrị uche n'aka oge ọbụla ha na-agbafe mpaghara a.

Enugwu steeti

Okporoụzọ Enugu
Nkọwa foto, Ebe ndị ekperima gbara otu ụgbọala ọkụ n'okporoụzọ n'Enugwu n'ọnwa Sepụtemba 2021

Okporoụzọ Ụkpabi-Nimbo

Ụzọ a abụchaghị ebe ụgbọala na-agba nnukwu, o nwekwara ọhịa n'akụkụ ya abụọ, nke mere ndị ntọ ji akpakarị ike ebe ahụ.

Ụzọ Eha-Amufu

Nke a bụkwa ebe ọzọ ndị njem na-achị obi n'aka ma ha na-agafe.

N'abalị iri na asatọ nke ọnwa Julaị afọ a, akụkọ pụtara na ndị omekome tọọrọ mmadụ iri na asaa na mpaghara ahụ.

Akụkọ a kwuru na ndị ntọ ahụ jikere dịka ndị na-eti mmọnwụ ma were ohere ahụ tọrọ ndị mmadụ.

Mpaghara Ugwu Onyeama

N'okporoụzọ si Enugwu gawa Ọnịcha, e nwere mpaghara ebe a na-akpọ Ugwu Onyeama, ebe enwerela ọtụtụ akụkọ gbasara ntọrị mmadụ.

Ebe ndị ọzọ kwa ndị njem na-achị obi n'aka bụ okporoụzọ Enugwu-Ezike gawa Kogi,