A tọhapụla ndị Sista Katọlik anọ a tọọrọ n'ụzọ Okigwe

Ebe foto si, Chinwe, Johannes na Liberata
A tọhapụla ndị sista ụka katọlik anọ ahụ a tọọrọ n’ụzọ Okigwe-Umulolo n’ụbọchị 21 Ọgọstụ, 2022.
Ozi si n’aka odeakwụkwọ ndị ‘sisters of Jesus the saviour’ pụta kwuru na obi dị ha ụtọ na ndị sista anọ ndị a e nwerela onwe ha na-enweghi ọkụ ọbụla kọrọ ha n’ahụ.
Ha kelekwara ndị niile gbara mbọ ịhụ na a tọhapụrụ ndị otu ha.

Ebe foto si, Sister of Jesus the saviour
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Etu e si tọrọ ndị sịsta ụka Katọlịk anọ n’ụzọ Umulolo, Okigwe

Ebe foto si, Getty Images
Akụkọ ntọrọ ọzọ esila n’akụkụ okporoụzọ Okigwe gawa Enugu pụta taa bụ ụbọchị 21 nke ọnwa Ọgọstụ, 2022.
Akụkọ a na-ekwu na a tọọrọ ndị sịsta ụka Katọlịk mmadụ anọ n’ụtụtụ ụbọchị ụka dịka ha nọ n’ụzọ a gaa ịka ụka.
Ihe a mere n’okporoụzọ a nke e jizi akụkọ ntọrọ ndị mmadụ were mara.
Cheta na ọ bụ n’akụkụ ebe ahụ ka a tọọrọ onyeisi ụka Metọdịstị na Naịjirịa bụ Prelate Samuel Kanu-Uche n’ọgwụ Juun.
N’ụzọ ahụ ka a tọkwara otu Fada ụka Katọlịk bụ Chinedu Nwadike n’izu gara aga.
Akụkọ ntọrọ ndị sịsta anọ a pụtara ihe dịka otu jịkọrọ ndị sịsta nke The Sisters Of Jesus The Saviour zịpụtara ozi nke isi okwu ya bụ ‘akụkọ dị mwute’ ma kwuo na a tọọrọ ndị otu ha mmadụ anọ.

Ebe foto si, Screengrab
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ha zịpụtara aha ndị a tọrọ ma deekwa:
“Ezigbo ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị anyị n’ime Kraịst, ọ bụ nnukwu ihe mgbu ka anyị ji ezipụta ozi ntọọrọ nke ụmụnne anyị nwaanyị anọ”.
“"Ihe mwute ntọọrọ a mere n'akụkụ okporoụzọ Okigwe-Umulolo n'ụtụtụ taa dịk ụmụnne nwaanyị ndị a nọ na-aga njem emume ụka nke ụkpa ekele”.
“Anyị na-arịọ unu ka unu tinye ha n’ekpere maka ntọhapụ ha ngwa ngwa na nchekwa ndụ ha”.
Mgbo BBC Igbo gbara ịnụ olu ọnụ-na ekwuru ndị uweojii n’Imo steeti bụ Michael Abattam amịtaghị mkpụrụ.
Na nso nso, akụkọ Umulolo gawa Ihube nakwa Umunnochi bụ ebe jịkọrọ Imo steeti nakwa Abịa steeti nọ n'ezigbo enweghị ezi nchekwa dị njọ.
Ndị ntọ ji ebe ahụ eme ndị mmadụ ihe sọrọ ha.
Kọmịshọna mgbasaozi n'Abịa steeti bụ Eze Chikamnayo gwara BBC Igbo ihe o chee so eme ka akụkụ Umunneochi dị njọọ.
Chikamnayo boro ebubo na ihe so na-etinye akụkụ okpuruọchịchị Umunneochi n’ọnọdụ ọjọọ ha nọ n’ime ya ugbua bụ ndị a na-eche na ha bụ ọchị ehi so awụbata mpaghara ahụ aghara aghara n’ihi ahịa ebe a na-ere ehi dị n’Umunneochi.
O kwuru “Etu ndị mbịarambịara a na-eche bụ ndị ọchị ehi siri awụbata ebe ahụ so akwanye ọkụ n’ọnọdụ enweghị nchekwa ebe ahụ, ọkachasị n’ọrụ ọjọọ nke ịtọọrọ ndị mmadụ”
“Ihe a abụrụla ụzọ ịkpa ego nye ndị a maka uru agbagba ego mgbapụta ndị mmadụ na-akwụ ha”.
O kwukwara na ihe ọzọ dị mkpa bụ na okpuruọchịchị Umunneochi nọ n’etiti mpaghara ọwụwa anyanwa niile nke bụ na ha na Imo, Anambra, Ebonyi nakwa Enugu steeti nwere ebe ala jịkọrọ ha.
N’okwu ya, ọ sị “N’ihi etu ndị ọrụ nchekwa siri achụ ndị omekome nakwa otu ndị ojiegbe dị icheiche ọsọ ụkwụ eru ala n’akụkụ Anambra nakwa Imo steeti, ọtụtụ n’ime ha na-awụbatazị Umunneochi ezo”.
Lee foto ndị Sista atọ n'ime mmadụ anọ a atọọrọ

Ebe foto si, Johannes Nwodo/Facebook

Ebe foto si, Chinwe Echemazu Christabel/Facebook

Ebe foto si, Liberata Mbamalu/Facebook









