Colliery Avenue fire: Etu ọkụ si gbapịa ihe ndị mmadụ n'Enugwu steeti

Ọkụ gbara na Colliery Avenue, Enugu
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndị bi na Colliery Avenue dị na Coal Camp, Enugwu steeti, nọ na nnukwu iru uju n'ihi mkpamkpa ọkụ kpara na be ha.

Dịka ndị ihe metụtara si kwuo, ọkụ a malitere ịgba ebe elekere iri nke ụtụtụ Sọnde, ụbọchị isii nke ọnwa Febrụwarị afọ 2022.

Ha kọwaara BBC Igbo etu ha si gbaa mbọ ibuputa ngwongwo ha n'ime ọkụ a, ma kwuo na enweghi onye nwụrụ n'ọkụ a.

Ha kọwakwara etu ndị ọrụ mmenyụ ọkụ si gbata ọsọ enyemaka, mana mgbe ahụ ọkụ agbapịachaala ngwongwo ha.

Ka ọ dị ugbua, amabeghi ihe kpatara ya bụ ọkụ gbapịara ọtụtụ ụlọ.

Ha jikwa ohere ahụ na-arịọ ka gọọmentị gbatara ha ọsọ enyemaka.

Lee ihe ha gwara BBC Igbo n'ihe onyonyo:

Lee etu ọkụ a si kpaa mkpamkpa:

Ọkụ gbara na Colliery Avenue, Enugu
Ọkụ gbara na Colliery Avenue, Enugu
Ọkụ gbara na Colliery Avenue, Enugu
Ọkụ gbara na Colliery Avenue, Enugu
Ọkụ gbara na Colliery Avenue, Enugu
Ọkụ gbara na Colliery Avenue, Enugu
Ọkụ gbara na Colliery Avenue, Enugu

Cheta na ọkụ gbakwara ọtụtụ ụlọahịa dị na Coal Camp, Enugwu, n'isi ụtụtụ ụbọchị 26 nke ọnwa Jenụwarị a.

Ndị nọ mgbe ihe mere kwuru na ọkụ ahụ malitere ebe elekere otu nke isi ụtụtụ, n'ebe a na-akpọ Calabar street, ma kwuputa etu ha si gbalịa ịmenyụ ya bụ ọkụ tupu ndị ọrụ mmenyụ ọkụ abịa menyụọ ya bụ ọkụ.