Umuahia fuel station fire: E menyụọla ọkụ gbara n'ọdọ mmanụ ụgbọala

E menyụọla ọkụ gbara otu ọdọmmanụ ụgbọala n'Aba Road, Umuahia bụ isiobodo Abịa steeti, n'ụtụtụ Satọde, Jenụwarị 29, 2022.

Amabeghi ihe kapatara ya bụ ọkụ malitere n'ụtụtụ, mana ndị ọrụ mmenyụ ọkụ gbatara ọsọ, buso ọkụ ahụ agha ma merie ya.

Ndị bi nso ebe ọkụ a na-agba gbakọrọ na-enye aka imenyụ ya, ma na ya bụ ọkụ ka nọ na-agba mgbe ihe karịrị otu awa ọ malitere gachara.
Onye ntaakụkọ BBC hụrụ ebe ụfọdụ ndị nwere ọnụ ụlọahịa ebe ahụ na-agbagharị na-akwapụta ngwongwo ha, dịka ha na-atụ ụjọ na ọkụ ahụ nwereike ibanye na nke ha.


Anthony Agbazuere bụ onyeisi ndị ọrụ gọọmentị Abịa steeti na Chris Ezem bụ odeakwụkwọ gọọmentị ahụ, garuru ebe ya bụ ọkụ na-agba, iji anya ha hụ ma mara ihe na-eme.

Ka e menyụrụ ọkụ a mgbe awa abụọ gachara, Agbazuere dọrọ ndị mmadụ aka na ntị na mkpa ọ dị inwe igwe mmenyụ ọkụ a kpọrọ "fire extingusher".
O kwuru na a gaara emenyụ ọkụ a n'oge ma ọ bụrụ na e nwere igwe mmenyụ ọkụ dị nso.
Ọ dọkwara ndị mmadụ aka na ntị ka ha gbado anya n'oge ọkọchị a.
Foto ndị a si n'ebe ọkụ gbara:



Nke a emeela ya ọkụ nke atọ na-agba na mpaghara Ọwụwa-anyanwụ n'ime ụbọchị atọ, dịka ọkụ gbara n'Ọnịcha, Anambra steeti, n'ụbọchị Tọzde na Fraịde, Jenụwarị 27 na 28 nke afọ 2022.
Chetakwa na ọkụ gbakwara n'akụkụ ụlọikpe 'Federal High Court', Umuahia, nakwa ọtụtụ ụlọahịa dị na Coal Camp, Enugwu, n'ụbọchị 26 nke ọnwa Jenụwarị a.
Ọkụ ọzọ gbakwara ihe ruru ụlọ 25 na Delta steeti n'ụbọchị 27 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2022.









