Dementia: Nri ise ị kwesịrị izere na-ebute ọrịa nsogbu ụbụrụ

Ebe foto si, Inpho
- Onye dere ya, Chioma Nkemdilim
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist, Igbo Service
Dkt. Alois Alzheimer, bụ onye mba Germany, bụ onye buru ụzọ chọpụta maka ọrịa a n'afọ 1906, mgbe o mere nyocha n'ahụ nwaanyị na-echezọ ihe n'ụzọ pụrụiche tupu ọ nwụọ.
Ọ chọpụtara na ụbụrụ nwaanyị ahụ dalatara ma hụkwa na nsogbu dị n'akwara mkpụrụ ndụ dị n'ahụ ya
Oge ọ chọpụtara ihe ndị a, ọrịa dementia adịghị ka ọ dị ugbua.
Mana taata, a na-achọpụta na mmadụ nwe ọrịa a kwa ntabi anya atọ.
Ọrịa enweghi ọgwụgwọ ma ncha.
Na mba ụwa niile, ndị nwere ọrịa ruru nde 50 (50 million). Mana a na-ekwu na o nwereike rịa elu ruo nde 130 (130 million) mgbe afọ 2050 ruru.
Dịka World Health Organization siri kwuo, mmadụ ọrịa dementia na-egbu ejirila oke abụọ karịa etu ọ dị n'afọ 2000, ma bụrụkwa ọrịa nke ise kachasị egbu mmadụ n'uwa niile.
Gịnị bụ ọrịa dementia?
Dementia bụ ihe mgbaama n'ọrịa dị iche iche gbasara ụbụrụ.
Ichefu ihe bụ njirimara nke kacha n'ọrịa a. Mmadụ ọ na-eme ga na-echezọ ihe dị iche iche mere nso nso a.

Ebe foto si, Alamy
Ihe mgbaama ndị ọzọ bụ: mgbanwe agwa, ọnọdụ uche na njirimara uche, onye agaghi amazi ebe ndị ọ mara mbụ, ma chefuo okwu ụfọdụ ma ya na mmadụ na-enwe mkparịtaụka.
Ọ na-aka njọ rute mgbe mmadụ amaghịzi mgbe nri maọbụ mmiri na-agụ ya.
Dementia dị n'ụdị na ụdị dịka: 'Alzheimer's disease' (a na-ahụkarị nke a), 'vascular dementia', 'dementia with Lewy bodies', 'fronto-temporal dementia', 'Parkinson's disease dementia', 'amyotrophic lateral sclerosis' na nke a chọpụtara ọhụrụ bụ 'Late'.
Nri 5 na-ebute ọrịa dementia
Ị mara na nri kachasị soro n'ihe ndị nwereike ime ka mmadụ nwe ọrịa dementịa?
Lee nri ise ị ga-ezere maọbụ belata na ndụ gị:
1: Oke suga
Ụbụrụ anyị ji ike sitere na 'glucose', bụ ụdị suga arụ ọrụ n'ahụ. Mana, mmadụ riwe oke suga, 'glucose' dị na uburu akarịa.

Ebe foto si, Getty Images
Nchọpụta ndị e mere gosiri na ọ na-ebelata ikike ncheta, ma belata ndọtị 'hippocampus', bụ akụkụ ụbụrụ na-enye aka n'icheta ihe.
Ụfọdụ nri bu oke suga bụ mmanya ọtọ bịrịbịrị, achịcha ụtọ, dgz.
N'agbanyeghi na ahụ mmadụ chọrọ ihe dị iche iche, ndị America Heart Association kwuru sị na nwaanyị ekwesighi iri suga karịrị 25 grams, ma nwoke ihe karịrị 36 grams n'ou ụbọchị.
2: Nri e ghere eghe
A bịa n'ihe gbasara ahụike ụbụrụ, ọ dị mkpa ịbelata nri e ghere eghe mmadụ na-eri. Otu nyocha gosiri na ndị riri ụdịrị nri a emeghi ọfụma n'ihe mmụta na ncheta ihe.

Ebe foto si, Getty Images
Nyocha ọzọ gbasara obi ịda mba na echiche na iri nri e ghere eghe gosiri na ndị riri ụdịrị nri a na-enwe obi ịda mba.
Ọ bụrụ na ị na-eri nri e ghere eghe kwa ụbọchị, riwe ya kwa izu. O bụrụ kwa izu ka ị na-eri ya, riwe ya kwa ọnwa. Ọ bụrụ na ị naghị eri ya ma ncha, ị ma ihe ekwe na-akụ.
3: Carbohydrate anụchara
Iri oke carbohydrate (carbs) anụchara nwereike ibelata echiche, ma bute ọria dementia.
Carbs a gunyere ntụ ọka nwereike 'high glycemic load' na 'high glycemic index' (High-GI), nke pụtara na ahụ na-agbari ya ngwa ngwa, ma mee ka insulin na suga dị n'ọbara gbalie elu.

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụghị iwu na ị ga-ewepu carbs niile ị na-eri, mana ị ga-enyocha ụdịrị nke ọ bụ.
N'afọ 2018, ndị na-eme nyocha chọpụtara na ahụ ndị na-eri ọka juru eju na nri nwere ahịhịa ka mma karịa ndị na-eri carbs anụchara. Ha hụkwara na ndị na-eri nrị anaghi enwe obi ịda mba.
Nri nwere High-GI gunyere poteto, achịcha ọcha, osikapa. Nri nwere Medium-GI gunyere mmanụ aṅụ, oroma, achịcha juru eju, dgz. Nri nwere Low-GI gunyere akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi, karrot, agwa, 'chick peas' na 'lentils'.
4: Mmanya na-egbu egbu
Ịnụ oke mmanya na-aba n'anya adịghị mma n'ụbụrụ.
Ọ na-ebute gbanwe na-ahụ mmadụ, belata etu ụbụrụ ha, tisasi ngwaọrụ dịka 'neurotransmitters' ụbụrụ ji arụ ọrụ. Ụfọdụ mmanya nwere 'nitrates' na-ebute dementia.

Ebe foto si, Getty Images
Lancet Public Health wepụtara nyocha ọhụrụ site na France ha mere na mmadụ otu nde nwere ọrịa dementia. Ha hụrụ na ndị dị afọ 65 ma karịa nọ n'ụlọọgwụ nwe ọrịa na-aba ha n'ụbụrụ maka ṅụrụ mmanya oke n'oge ha.
Ọ bụ na ị ga-aṅụ mmanya, anụfeghi ya oke.
5: Monosodium glutamate (MSG)
MSG bụ ngwanri e ji eme ka nri tọọ ụtọ pụrụiche, ma chekwa nri.
O so n'ihe na-ebute dementia, maka ọ na-eme ka usoro akwara rụọ ọrụ karịa etu o kwesịrị.

Ebe foto si, Getty Images
Ihe ndị ọzọ ị nwereike ike ime iji gbalahụ ọrịa dementia
N'agbanyeghi afọ ị dị, oge ka dị ka ị leba anya ma riwe nri ga-enye ahụ gị ohere ịkwụsị ọrịa dementia, ma kụkwa na ụbụrụ gị na-arụ ọrụ ọfụma.
Nnyocha dị iche iche egosila na mmadụ nwereike igbochi ọrịa tupu ọ malite, n'agbanyeghi ma ọ dị na ezinaụlọ, site na ime ihe ndị ga-eme ka ahụ gbasie ike, ma zere nri na-adịghị ahụ anyị mma.
N'agunyeghị izere nri ise anyị kwuru maka ya, ihe ndị ọzọ ị nwereike ime bụ:
- Zere ise siga, maọbụ ịnọ ebe a na-ese siga
- Megharịa ahụ, ma kwụsị oke ibu
- Ekwela ka obi gi daa mba
- Rie ezigbo nri gunyere mkpuruosisi, akwụkwọ nri, azụ, agwa, dgz, ma zee iri oke anụ.













