Etu ị ga-esi chekwaa onwe gị n'oge ọgbaghara ka obi ghara ịda gị mba

Ebe foto si, Getty Images
A sị na Ọgbaghara na-efe efe nke pụtara na ọgbaghara mere n'otu ebe nwereike imetuta ọtụtụ mmadị nọ n'ebe ọzọ, ọ kachasị n'oge a ịntanetị na soshal midia meziri ka izipu ozi kawanye mfe.
N'iji maa atụ, ọtụtụ ndị mmadụ na Naịjirịa nakwa mbaụwa na-ekwupụta etu ihe mere na Lekki Toll Gate na ebe ndị ọzọ na Naịjirịa si kpatara ha uche ezughị ike nke Bekee kpọrọ 'emotional trauma.
Ya bụ ihe kacha metụta ndị nọ n'ihu ebe dị icheiche ọgbaghara a mere nakwa ndị hụrụ ya na foto nakwa ihe nkiri.
Kedụ ihe ị ga-eme ma ịhụta onwe gị n'ọnọdụ a?
- Dọkịta Brooke Rogers, ọkachamara n'okwu ihe izendụ n'ụlọakwụkwụ Kings dịna London nyere ụfọdụ ndụmọdụ sị:
- Ọ bụrụ na ị nọ n'ihu ọgbaghara kpọkwem, dere jụụ, legharịa anya n'akụkụ gị, gee ihe ndị mmadụ na-ekwu na ihe ha na-eme ma o nwere ozi ị ga-anụ ga-enyere gị aka.
- Gbalịa mata ebe ụzọ I nwere isi gbaa ọsọ dị.
- Ọ bụrụ na ị chọpụta na nsogbu dị ebe ahụ, biko pụọ ngwa ngwa mana nsogbu a gaa n'ihu dịka ị nụrụ ụda egbe maọbụ ogbunigwe, chọọ out ebe zoo onwe gị. Gbanwụọ ekwentị gị maọbụ mee ka ọkụla akụ.
- Ngwa ngwa ị hụrụ na ebe niile adịla jụụ, gbalịa kpọ ndị ezinaụlọ, ndị enyi gị maọbụ zigara ha ozi ma gwa ha na onweghi ihe mere gị.
- Ọ bụrụ na ị hụrụ ihe onyonyo ọgbaghara mere, lee ihe ị ga-eme.
Otu ụlọọrụ bụ Asido Foundation na-ahụ make ahụike ụbụrụ wepụtara ozi ga-enye aka n'ọnọdụ a nke kwuru sị:

Ebe foto si, Asido Foundation
- Elezila ihe onyonyo maọbụ foto na-egosi nkwafu ọbara.
- Nyochaa ebe I si enwete akụkọ ị na-ege ka ọ bụrụ ndị eziokwu.
- I nwereike gbanyụọ ekwentị gị maọbụ TV gị nwa obere oge.
- A mala jijiji, ụjọ nwereike ịtụ gị mana dere jụụ. Oge a ga-agafe.
- I nwereike ime ihe maọbụ gwuo egwuregwu na-eme gị obi ụtọ.
- A nyala uche gị ka akpa, kọsara mmadụ etu o si emetụta gị mana ka ọ bụrụ onye ịtụkwasịrị obi.
- Biko kpọtụrụ onye ọkachamara n'ahụike ụbụrụ.
Site n'ime ihe ndị a, ọ ga-enyere gị aka inwe nchekwa onwe gị nakwa nke mmetụta uche gị n'oge ọgbaghara dịka nke na-eme ugbua.





