Unknown Gunmen vs Security Operatives: Anyị gbagburu otu onye oji egbe chọrọ ịtọrọ ndị mmadụ na Njaba - Ndịagha

Ndị agha Naịjirịa

Ebe foto si, Nigerian Army

Ndịagha n'Imo Steeti nọ n'ọrụ a kpọrọ 'exercise down sector' sị ha egbuola otu onye ha sị bụ onye Ipob ndị bịara ịtọrọ ndị mmadụ n'obodo Amauju dị n'Isu nke Imo Steeti.

Ọnụ na-elwuru ndịagha bụ Onyema Nwachukwu depụtara nke a n'ozi o wepụtara.

Ha sị na ndị a bịara ịtọọrọ ndị dọkịnta na ndị nọọsụ a kpọrọ 'Doctors on the move Africa' bụ na-akwọ ndị mmadụ ọrịa n'obodo Amucha dị na Njaba.

Ọ sị ha na ndị ndịagha ụgbọelu na ndị uweojii wuchiri ebe ahụ ma zọpụta ndị dọkịnta na ndị nọọsụ ahụ mana ndị oji egbe ahụ gbara ọsọ.

Ọ sị ha chụụrụ ndị oji egbe ahụ ruo n'Amauju ebe ha kwarịtara mgbọ mgbe ha na-aamanye ndị mmadụ ịnọ n'ụlọ.

Ọ sị ha gbagburu otu onye oji egbe ahụ ebe ndị ọzọ bu mgbọ egbe gbaa ọsọ.

Ọ sị ha kpachiri egbe ise na ọtụtụ mgbọ, ụgbọala Lexuz, ekwentị.

A gbaala ọtụtụ ụgbọala ọkụ dịka ndị ọrụ nchekwa na 'unknown gunmen' kwara mgbọ n'Imo Steeti

Ụgbọala a gbara ọkụ

Ebe foto si, Other

Egwu juru ndị bi n'obodo Mgbidi nakwa Akata dị n'okpuruọchịchị Oru West,'Imo Steeti ahụ n'ụtụtụ ụbọchị Tuzde dịka ndị bu egbe na ndị ọrụ nchekwa kwatara mgbọ.

Nke mere dịka ndị a na-enyo na ha bụ ndị Ipob naa-amanye ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ maka oku ekpere a kpọrọ maka ntọhapụ Nnamdi Kanu ụbọchị Tuzde.

Ndị achọghị ka a kpọ aha ha n'obodo ahụ gwara onye ntaakụkọ anyị na ụdị egbe a gbara ebe ahụ mere ka ndị niile bi n'ogbe ahụ hapụ ụlọ obibi na ụlọahịa ha gbaa ọsọ.

Ha kwuru na ọ malitere n'Elekere isii nke ụtụtụ mgbe ndị a kaa anụghị nọ na-amagide ndị mmadụ ịnọ n'ụlọ, ha ji ọtụtụ ihe gbochie n'ụzọ, na-asị ndị mmadụ banye n'ime ụlọ.

Agwa a ha kpara kpalitere ndị ọrụ nchekwa nọ ọrụ ebe ahụ nke mere ka ha na ndị ahụ bu egbe ịgbarịta onwe ha.

O dobeghi anya ma o nwere onye e gburu n'ọgbaghara ahụ dịka akụkọ na-apụta mana a gbara ọtụtụ ụgbọala ọkụ.

Ogige ndí uweojii n'Ubakala
Nkọwa foto, Ụgbọala ndị uweojii

Anya hụrụ ka o si mee kwuru sị "ndị egberima na ndị nchekwa na-akwarịta mgbọ. Ndị obodo anyị agbafuchala ọkachasị ndị nọ na Mgbidi. A gbara ụfọdụ ụgbọala ọkụ."

Cheta na otu Ipob nyere iwu sị ka ndị bi n'Ọwụwa Anyanwụ banye n'ekpere n'ụbọchị Tuzde maka ntọhapụ onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu.

Ha sịrị ka ndị mmadụ gbachie ụlọahịa ha n'oge ekpere ahụ mana ha asịghị ka a nọrọ n'ụlọ kpọmkwem.

BBC Igbo kpọtụụrụ Mike Abattam bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii, ọ sịrị na ọ nụbeghi maka ya kama ka anyị kpọọ ndị agha.

Tupu akụkọ a na-apụta anyị na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ ndị agha.

Akụkọ ka na-abịa...