Awo-Omamma Crisis: Ihe ndị agha mere n'Awo-Omamma ekwesịghị ekwesị - Gọvanọ Hope Uzodimma

Hope Uzodimma

Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodimma akatọọla ọgbaaghara dapụtara n'Awo-Omamma n'ụbọchị Mọnde nke butere ọnwụ otu onye agha nakwa otu onye nkịtị.

O kwuru nke a site n'akwụkwọ ozi nke Kọmishọna mgbasa ozi Imo steeti bụ Declan Emelumba wepụtara n'ụbọchị Tuzde.

Uzodimma kwuru na ogbugbu e gburu otu anya agha jọgburu onwe ya, mana ọ bụghị ya ga-eme ka ndị agha ga gbaa ụlọ ndị mmadụ ọkụ.

O kwuru sị: "Onye agha na-arụrụ onwe ya ọrụ ichekwa ndụ na akụnụba ekwesịghị ka egbuo ya n'ụzọ dị otu a."

"N'aka nke ọzọ, gọọmentị katọkwara etu ndị agha si were iwe wakpoo ma mebikwaa ụlọ ndị mmadụ."

"Igba ụlọ ndị mmadụ ọkụ nakwa imebi ụlọahịa ndị mmadụ abụghị ụzọ kwesịrị ekwesị iji zaghachi ihe e mere ha. Ihe ọjọ abụọ enweghị ike iwepụta otu ihe ọma."

"Gọọmentị kwenyere na e nwere ihe ndị ọzọ kpatara ihe merenụ bụ nke achọpụtabeghi."

"N'ihi nke a, Gọvanọ Hope Uzodinma ehibela kọmiti ga-eleba anya na ya bụ ihe merenụ ma chọpụtakwa ihe kpatara ya kpọmkwem."

"Gọọmentị na-arịọ onye ọbụla ka ha wetuo obi ma dere duu ruo mgbe e mechara ya bụ nnyocha."

Otu onye agha na onye ọzọ nwụrụ n'ọgbaghara Awo-Omamma

Junction Awo-Omamma

Ebe foto si, Screen grab

Ndị obodo Awo-Omamma na-ebo ebubo na ndi agha Naịjirịa wakporo obodo ha ma gbaa ụlọ ọkụ dịka ndi amabeghị ndi ha bụ gburu otu onye otu ha.

Otu onye nọ n'ime Awo-Omamma dịka ihe na-eme gwara BBC Igbo na ya na ezinaụlọ ya nọ n'ime ọhịa dịka ọ na-ekwu okwu.

Ọ sị: "Ọ bụ sọsọ ndị be m nakwa ekwentị m ka m jiri gbapụ."

Gịnị mere kpọmkwem

Ndị agha Naịjirịa na-ebuso Boko Haram agha

Ebe foto si, AFP

Dịka onye ahụ gwara anyị okwu siri kọwa, "nsogbu malitere dịka ndị na-amanye atụmatụ 'sit-at-home' gbara ọtụ keke ọkụ n'ụtụtụ."

"Nke a mere ka ndị agha wuchie n'Awomama."

Ọ sị na ndị agha malitere ịgbali egbe elu, "mana ka ụmụ okoroọbịa ahụ ekweghi ịpụ, ha gbara otu onye n'ime ha egbe ma gbagbuo ya".

Nwoke a hụru ihe merenụ sị na ndị ntoroọbịa ahụ chụwara ndị agha ahụ ọsọ were gbuo otu onye.

Aha onyonyo, Otu onye anwụọla dịka ndị ntorobịa na ndị agha takọtara isi n’Oguta

"Ndị agha laghachitere n'igwe were gbawa ụlọ na ụgbọala ọkụ n'Awo-omamma Jucntion."

"Ugbua mmadụ niile agbafusiala. Ọ bụ n'ime ọhịa ka anyị nọ ugbua."

BBC Igbo kpọrọ ekwentị ọnu na-ekwuru ndị agha n'ọdọ ndị agha n'Obinze bụ Joseph Akubo mana ọ sị ka akpọghachi ya ka ọ mata ihe na-eme ọfụma.

BBC Igbo kpọkwara ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo bụ Michael Abattam mana ọzaghị ekwentị ya.

Mgbọ atugbuola otu onye dịka ndị omekome wakpro ọdọ ndị agha n'okpuru ọchịchị Nkwerre

Aha onyonyo, Ezeribe Chigbu nwụrụ n'ụbọchị Eprell 30 n'aka ndị ọrụ nchekwa.

N'akụkọ dị ka ibe ya, mgbọ egbe a na-eche na ndị agha Naịjirịa gbara tugburu otu onye nkiti na Mgbabano junction dị n'okpuru ọchịchị Nkwerre nke Imo steeti.

Otu onye nọ ebe ahụ mgbe ihe a mere na-achọghị ka akpọọ aha ya gwara BBC Igbo na ihe mgberede a malitere n'abalị Sọnde ebe ndị omekome amaghị ndị ha bụ pụtara ibuso ndị agha na-anọ n'okporoụzọ Mgbabano junction agha.

Dịka ndị omekome na ndị agha a nọ n'ikwa mgbọ, e kwuru na mgbọ ndị agha tụsara otu nwoke onye nkịtị nọ nso ebe ahụ na ndanye. E kwukwara na dịka e bugara ya bụ nwoke ụlọọgwụ na ndị dọkịnta kwuru na ọ laala mmụọ.

Ka akụkọ si kwuo, ndị bi ebe ahụ nọ n'ụjọ ugbua dịka mkpa mkpa a kpara menyere ha egwu.

Onye a na-achọghị ka akpọọ aha ya gwara BBC Igbo na ugbua, ndị bi ebe ahụ na-arịọ gọọmentị ka ha bịa bupu ndị agha ahụ n'okporoụzọ ahụ dịka be ha bụ ebe e ji udo mara.

Mbọ niile BBC Igbo gbara ikwuturu ọnụ na-ekwuru ndị agha nke ogige 34 artillery brigade command, Obinze, Owerre adibeghị ire ruo ugbua.

Akụkọ ka na-abịa.