Sọọsọ ekele ka Alex Iwobi nwere ebe Arsene Wenger nọ

Ebe foto si, Alex Iwobi/ Twitter
Onye ọgba bọọlụ Naịjirịa bụ Alex Iwobi etoola onye nkuzi ndị Arsenal bụ Arsene Wenger maka aka o nyere iguzobe Alex n'otu egwu bọọlụ ahụ.
Wenger ga-ahapụ ya bụ otu egwu bọọlụ na ngwụcha oge asọmpi a na-agba ugbua dịka ọ nọrọla karịa afọ iri abụọ n'Arsenal.
Wenger kwurpụtara ebumnobi ya site na mgbasaozi o nyere ndị ntaakụkọ.
Mana Iwobi nọ n'akara Twitter ya wee depụta etu obi dị ya ebe Wenger nọ ọkachasị etu Wenger siri nyee aka we guzobe ya n'otu egwu bọọlụ Arsenal.
N'okwu ya "Maka ihe niile i meere ndị egwu bọọlụ Arsenal, maka inwe ntụkwasị obi n'ebe m nọ dịka nwa na-etolite etolite, maka inye m ohere igosipụa onwe m ma tokwa dịka onye ọgba bọọlụ nakwa dịka mmadụ, a ga m na-ekele gị bu onyeisi m ebighebi. Daalụ rnke ukwuu!"
O tinyere akara nke na-egosi ịhụnanya na ya bụ ihe o dere.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Iwobi bụ otu onye nime ụmụ na-etolite etolite nke Wenger kuziri ndị si n'ụlọakwụkwọ nke ndị Arsenal wee banye n'otu egwu bọọlụ ahụ nke mbụ.
Iwobi banyere Arsenal dịka nwantakịrị na-agụ prayimarị ma sonyere ndị otu mbụ ha n'afọ 2013 dịka onye ga-anọchi mmadụ n'asọmpi ha na West Bromwich Albion gbara.
Wenger buru iko Premia Lig atọ na FA asaa nime afọ iri abụọ na abụọ ọ nọ n'Arsenal.
O nwere ike inweta iko mba Europe ya nke mbụ tupu o pụọ dịka otu ahụ nọ n'agba nke ikpeazụ n'asọmpi UEFA Yuropa Lig.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:









