Chekwanu ọchịchị onye kwuo uche ya - Saraki

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisi Sineti bụ Bukola Saraki arịọla ndị Naịjirịa ka ha chekwaa ọchịchị onye kwuo uche ya ma gbajọọ ihe ọ bụla ga-agbabi ya.
O nyere ndụmọdụ a mgbe ọ gara nkuzi ncheta arọ mmalite otu ụlọọrụ mgbasa ozi.
Saraki kwuru na ọchịchị onye kwuo uche ya bụ ọchịchị kachasi mma ma rịọkwa ka onye ọbụla gbaa mbọ chekwaa ya.
Ọ kwuru na agbanyeghị ụfọdụ nsogbu Naịjirịa na-enwe, ọchịchị onye kwuo uche ya bụ ụzọ kachasị mma iji wee nweta ọdịmma obodo anyị.
Saraki kwuru na ndị mgbasa ozi so wee mee ka ọchịchị onye kwuo uche ya bụrụ ihe tọrọ atọrọ na Naịjirịa.
Ọ rịọrọ ha ka ha ghara ịda mba n'ikwado ihe gbasara ọdịmma Naịjirịa ma mekwa ka ọ buru obodo kachasi mma.
Ọ kọwara mwepụ ọfọ n'ike nke mere na sineti n'izu ụka a dika ihe ihere, omume mara mmeputa iwu ura n'ihu ma nwee ike ịghasa ọchịchị onye kwuo uche ya.
Saraki kelere ndị mgbasa ozi otu ha sị kwuputa mmerụaka n'oge nke a mere ka ndị mmadụ hụ njọ dị na ya ọsịsọ.
Mana lee ihe ndị mmadụ sara Saraki na soshal midia:
Onye akpọrọ @natureboy_sola sị na okwetere mana o ga-esi chekwa ọchịchị onye kwuo uche ya bụ site n'ikwụsi i tunyere na ntukiaka na-abia nụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
@EkpoSylvanus kwuru na ọ bụ site n'iru ngalaba siri ike ka esi chekwa ọchịchị onye kuo uche ya,na ọ bụghị site n'isi ike.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
@Michael12Dennis kwuru na nchekwa onye kwuo uche ya bụ site n'ime ihe dimma karia ma i tọ n'ikwu sọ okwu.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
@usmansalisu222 kwukwara na ọ bụ site n'ikwe ka onye ọ bụla kwuputa obi ya.Ọchichi ike adịghị mma
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4








