Arsene Wenger ga-ahapụ Arsenal tupu nkwekọrịta ha akwụsị

Ebe foto si, Getty Images
Arsene Wenger bụ onye nchịkọta ndị otu egwuregwu bọọlụ Arsenal ga-ahapụ ha na mgbe na-adịghị anya, were weta njedebe ọnọdụ afọ 22 ọ nọ na ya bụ otu egwuregwu.
Wenger bụ onye mba France, ga-akwụsị ọrụ n'agbanyeghị na ọ fọrọ naanị otu afọ ka nkwekọrịta ya na ndị nwe Arsenal nwere gwụ.
Ndị Arsenal, bụ ndị e ji Gunners mara, nọ n'ọnụọgụ isii n'usoro Premier League nke afọ a, nke mere na ha nwereike ghara iso gbaa Champions League nke afọ na-abịa.
Nchekwube ha nwere ugbua isonye na Champions League bụ ma ọ bụrụ na ha bulie iko nke Europa League afọ 2017/2018 a.
Wenger, bụ onye dị afọ 68, ritere iko Premier League atọ na iko nke FA asaa, na njem ya na Arsenal.
"E kele m unu maka ohere m nwetere ịrụ ọrụ n'Arsenal," Wenger kwuru. "E duru m otu egwuregwu a etu o kwesịrị.
"A nam agwa ndị hụrụ Arsenal n'anya ka ha jide ihe ejiri mara Arsenal nke ọma."
Ihe ndị nkwado Arsenal na Naịjirịa kwuburu maka Wenger
Mmadụ dịka Rauf Aregbesola bụ gọvanọ nke Oshun steeti kwuru na Wenger kwesiri itinye akwụkwọ arụkwaghị m.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Banky W bụ onye oti egwu tinyekwara ọnụ n'okwu a. O kwuru na Wenger chọrọ ịnwụ n'ọrụ dịka onye nchịkwa Arsenal jiri ya maa atụ dịka onye chịburu Zibabwe bụ Mugabe.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Onye egwu Patoranking gwakara BBC Igbo n'oge agbara ya ajụjụ ọnụ na naanị ihe mwute ya nwere na ndụ ya bụ oge ya na-etufu ikiri egwu bọọlụ ndị Arsenal ma emesịa ha gbawa ya obi.
Kedu ihe a na-ekwu na Soshal midia ugbua?
Kelechi Anyikude eji "Kelechi Arsenal" mara gwala Wenger daalu maka ihe nrota niile onyere ndị nkwado Arsenal.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Onye nkwalite okwu na Twitter a ma ama bụ JJ. Omojuwa kelere Wenger sị ya daalụ
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Ma gakwa n'ihu kwuo na ọpụpụ Wenger dị ka mmekọrịta enyi na enyi na abịa na njedebe, ọ na ewe ndị niile ometụtara iwe.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 5
Ha bụ na Arsene Wenger ka na-enweta ezigbote nsọpụrụ site n'aka ndị hụrụ otu egwuregwu Arsenal n'anya.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasi gị:












