House of Representatives: Gịnị mere ijeri dọla 7 CBN nyere ụlọakụ 14 n'afọ 2006?

Ụlọomeiwu nta

Ebe foto si, House of Representative Federal Republi/Facebook/

Nkọwa foto, Nke a bụ mbu ndị ụlọomeiwu nta kwutere okwu ịchupu Onyeisiala Buhari

Ọ bụ gịnị mere $7bn CBN nyere ụlọakụ 14 n'afọ 2006?', bụ ajụjụ ụlọomeiwu nta nke Naijria chọọrọ ka ndị o metụtara zaa ya.

Ụlọakụ etiti nọrọ n'afọ 2006 tinye aka n'akpa ego Naịjirịa nwere na mba ọzọ were nye ụlọakụ iri na anọ na Naijịrịa nakwa ndị ogbo ha na mba ofesi iji kwalite ha.

Mana afọ iri na atọ agala, o nweghị onye na-ekwu okwu maka nkwụghachị ego ndị ahụ.

N'ụbọchị Tọzde, ndị omeiwu kwekọrịtara ma kpebie ịtinye ọnụ n'okwu a bụ nke Abubakar Ahmad nke APC (Gombe)kpalitere okwu ya.

Ha nyere kọmịtị okwu ụlọakụ dị n'aka ntuziaka ịchọpụta ọnọdụ e ji kesaa ego ahụ ma wetara ha ozi n'izu asatọ.

Mana otu onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara akụnaụba bụ ọkammụta Godwin Owoh kwuru na nnyocha ahụ ndị ụlọomeiwu chọọ ịmalite agaghị amịta mkpụrụ ọbụla n'ihi n'ọ bụ ịchụ oke ebe ụlọ ya na-agba ọkụ.

"Ihe e mere bụ na e nyere ụlọakụ isonye na ndị na-ahazị akụ Naijiria nke bụ ihe naanị ụlọakụ mba ofesi na-emebụ ma sonye nerite uru nke ọbụbu ụlọakụ mba ndị ọzọ na-erite."

Nnyocha ọ ga-apụtara gịnị?

Owoh kwuru na nnyocha ahụ agaghị amịta mkpụrụ ọbụla n'ihi na ụlọomeiwu enweghị ikike inweta akwụkwọ etu ụlọakụ-etiti si eme ego(Financial Report) bụ ihe e kwesịrị ịgbado ụkwụ were eme nnyocha.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ kwa oge ka ụlọomeiwu na-ebulite okwu ahụ kwa ụlọomeiwu ọhụrụ ọbụla na enweghị ihe ha kwutere na ya.

Ihe ndị ị kwesiri ịma maka ego CBN tinyere n'ụlọak 14:

  • Ọ bụ n'oge ọchịchị Charles Soludo oge o mere atụmatụ 'Consolidation' ka CBN kere ego a na-eaọ ụka ugbua.Ụlọakụ ndị ketere oke n'ego ahụ gụnyere Black Rock na Union Bank Nigeria Plc, J.P. Morgan Chase na Zenith Bank, HSBC na First Bank, BNP Paribas na Intercontinental Bank Plc.
  • Ndị ọzọ bụ UBS na United Bank for Africa, Credit Suisse na IBTC Chartered Bank Plc; Morgan Stanley na GTB Plc; Fortis na Bank PHB Plc. Ndị ọzọ bụkwa Morgan Stanley na Guaranty Trust Bank Plc; Fortis na Bank PHB Plc; Investec na Fidelity Bank Plc; ABN Amro na Access Bank Plc; Cominvest na Oceanic Bank Plc; ING na Ecobank Plc; Bank of New York na Stanbic Bank Plc; Crown Agents na Diamond Bank Plc.Ụfọdụ ụlọakụ ndị ritere elele n'ego ahụ gụnyere Oceanic Bank, Intercontinental Bank Plc, Bank PHB, Union Bank Plc enwela ụgba dịka ha so ụlọakụ ndị ụlọakụ ndị ọzọ weghara n'ihi na owu na-asa ha
  • Ndị maa ihe ekwe na-akụ kwuru na ọ bụ nsogbu recession nke dabụtara n'afọ 2008/9 kụpịara ego ụlọakụ ndị a nke mere na ha enweghịkwa ike ịkwụghachi engo enyere ha dowe
  • E nyochala okwu mgbasara ego ugboro ugboro gụnyere nnyocha nke ngalaba na-ahụ maka inweta ihe gọọmenti ezufuru bụ Special Investigation Panel for the Recovery of Public Property, nke'Okoi Obono-Obla nọ n'isi ya mere mana o nweghị mkpụrụ ọ mitara

Akụkọ ga-amasị gị: