Ụlọomeiwu ebinyela aka na Bọjetị 2018

Ụlọomeiwu Sineti

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Buhariwepụtara ndị ụlọoimiwu Bojet afọ 2018 ọnwa isi gara aga.
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ụlọomeiwu nke Naịjirịa binyere aka na Bọjetị nke 2018 n'ehihe a.

Ihe a butere njedebe nye njem akwụkwọ Bọjetị ahu bidoro kemgbe ọnwa Nọvemba nke afọ gara aga onyeisiala bụ Mohammadụ Buhari nyere ndị omeiwu ya bu akwụkwọ ka ha binye aka.

Akara ndi omeiwu di na Twitter dere na ha ebinyela aka na ya bụ Bọjeeti.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Cheta n'ụbọchị Tuusde, Ụlọomeiwu ukwu na nke nta wepụtara Bọjeti nke afọ 2018, ebe ha bulirị ego gọọmenti ga-emefu n'afọ site na tarịị naira 8.612 ga tarịị naira 9.120, nke pụtara mmanyekwu ijeri naira 500.

Mgbari ego ahụ nke pụtara N9,120,334,988,225, gọsiri na e hiwere N530,421,368,624 maka nkesa dị na iwu ( Statutory Transfers).

E hiwere N2,203,835,365,699 maka ịkwụ ụgwọ eji eji(Debt Service nke ọnụego N190,000,000,000 bụ maka ụgwọ ruola ọkwụkwụ.

E hiwerekwara N3,516,477,902,077 maka ego mmefu ego a na-eme kwa mgbe kwa mgbe (Recurrent Expenditure.)

Ha hiwekwara N2,869,600,351,825 dịka ego maka imepụta mwulite doro anya( Development Fund for Capital Expenditures) n'afọ ga-akwụ ma ọnwa Disemba gba iri ato na otu.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ