Unicameral Legislature: Ọ ga aka mma ma akụchapụ ụlọomeiwu Senate?

Ebe foto si, Getty Images
Naịjirịa nwere ụlọomeiwu abụọ.
Nke ukwu bụ 'Senate' ebe nke nta bụ 'House of Representatives'.
Enwere ndị mmadụ otu narị na itoolu n'ụlọomeiwu ukwu.
Ụlọomeiwu nta nwere ndị otu narị atọ na iri isii.

Ebe foto si, Kayode Fayemi/Facebook
Mana ọtụtụ ndị na-ekwu na ọnụọgụgụ ndị na-eme iwu na Naịjiria buru nnkwu ibu.
Ha na-ekwu na ọ ga-adị mma ma a kụchapụ otu n'ime ụlọomeiwu ahụ.
N'ụbọchị Wenezde, Gọvanọ Ekiti Steeti kwuru na ọ ga-aka mma ma e wepu ụlọomeiwu sineti kpam kpam.
N'okwu ya, "Ụlọomeiwu dị mkpa bụ 'House of Reps'".
Onye ọzọ tinyere ọnụ n'okwu ahụ bụ Rochas Okorocha.
Ọ gwara BBC na mkparịtaụka na ọ ga aka mma ma ọ bụrụ naanị otu sinetọ na-anọchi anya steeti ọbụla kama atọ.
Chidi Lemchi, onye ma nke ekwe na-akụ n'ihe gbasara ọchịchị gwara BBC Igbo na ya kwadoro ka e wepu ụlọomeiwu sineti.
Lemchi kwuru na ndị ụlọomeiwu nta bụ ndị kacha mkpa n'ihi na ha na-anọchite anya ndị kacha nta n'okpuru ọchịchị niile.
Mana o kwukwara na ego a na-akwụ ndị omeiwu kwesịrị ịgbadata.
Gee ihe o kwuru n'uju ebe a:

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:












