Ụmụntakịrị gbara otu afọ so na ndị e dinara n'ike n'oge agha mba Sụdan - Otu United Nations

Hala (ọ bụghị ezigbo aha ya) ku nwa ya.

Ebe foto si, Unicef

Nkọwa foto, Hala (ọ bụghị ezigbo aha ya) bụ otu n'ime ọtụtụ ụmụaka nwaanyị ndị na-eto eto e dinara n'ike kemgbe agha Sụdan malitere
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ịdọ aka na ntị: Akụkọ a kọrọ maka idina mmadụ n'ike nke nwereike ịmetụta ụfọdụ mmadụ

Otu Mbaụwa bụ United Nations (UN) ekwuola na ndịagha na-edina ụmụntakịrị, ọbụnadị ndị dị otu afọ n'ike n'oge aghaime Sụdan.

Ụfọdụ n'ime ha bụ ndị ike ụwa gwụrụla dịka ha kwuru na ụfọdụ n'ime ha agbaala mbọ iwepụ ndụ ha.

A hụtala idina mmadụ n'ike aghara aghara dịka otu n'ime ngwaagha gbapụtara ihe n'agha ahụ fọrọ ntakịrị ka o ruo afọ abụọ.

Mana ihe ndekọ Unicef bụ akụkọ mbụ a chịkọtara ọnụ nke ọma gbasara mmetụta idina ụmụntakịrị n'ike na Sụdan.

Ọkara atọ n'ime ndị e dinara n'ike bụ ụmụaka ndị nwoke, ndị na-agabiga ihe ịmaaka ikwupụta ụdịrị mpụ ahụ ma chọọ enyemaka ndị kwesịịrị ha.

Unicef kwuru na ọ bụ eziokwu na ha anatala mkpesa gbasara ụmụaka narị abụọ na iri abụọ na otu (221) e dinara n'ike kemgbe mmalite afọ 2024, ezigbo ọnụọgụ ha nwereike ịdị elu karịa.

Sụdan bụ mba na-echekwa ejirimara ha, ebe ịkpa oke na-egbochi ndị a kwasoro iko n'ike na ezinaụlọ ha ikwuputa gbasara ya.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ihe ndekọ Unicef na-arọpụta ohere ileba anya gbasara mmetọ ụmụaka n'aghaime dị na mba ahụ.

Ikekwe, mkpughe ha nke kachasị atụ n'anya bụ na mmadụ iri na isii (16) n'ime ndị a kwasoro iko n'ike erubeghị afọ ise, nke gụnyere ụmụaka anọ e ku n'aka.

Unicef akpọghị aha ndị aka ha dị n'arụ ahụ mana nnyocha ndị ọzọ UN mere tara ndị otu Rapid Support Forces (RSF) ụta ma kwuo na ihe e ji mara ndị otu ahụ bụ idina ndị mmadụ n'ike iji yie ndị na-agba ha ụkwụ egwu.

Ndị otu RSF na-alụ agha megide ndịagha Sụdan ekwuola na aka ha adịghị n'ebubo ahụ.

"Ụmụaka, ọbụnadị ndị gbara naanị otu afọ ndịagha dinara n'ike kwesịrị ịtụ mmadụ ọbụla n'anya ma bụrụ nke kwesịrị ime ka a mara ihe e mere ozugbo," ka nnukwu onyeisi Unicef bụ Catherine Russell kwuru.

"Nde kwuru nde ụmụaka na Sụdan bụ ndị nọ n'ize ndụ maka idina n'ike nakwa ụdị mmetọ ndị ọzọ, bụ e ji kwara ngwaagha. Nke a bụ nnupụisi megide iwu mbaụwa ma bụrụkwa nke a pụrụ ịgụnye dịka mpụ agha. Ọ ga-akwụsịrịịrị."

Dabere n'ihe akaebe otu ndị na-ahụ maka ikike nke mmadụ na mbaụwa wepụtara, ndị ọnọdụ ahụ metụtara na mpaghara Dafur ndị otu RSF kpachiri bụ ndị a wakporo oge ụfọdụ n'ihi na ha bụ ndị isi ojii Afrịka karịa ndị Arab, nke ebumnobi ya bụ ịchụpụ ha na Sụdan.

Ọrụ obi ebere UN na mba Sụdan bụ nke enweghị ezigbo nkwado ego. Mbelata enyemaka mba Amerịka bụ nke a tụrụ anya na ọ ga-ebelata ihe omume e ji enyere ndị ọnọdụ ọjọọ ahụ metụtara aka.

Akụkọ na-agba anyammiri na ndekọ Unicef kọwara ọnọdụ ọjọọ ahụ

"Mgbe ọ gafere elekere itoolu nke abalị, mmadụ mepere ụzọ ma jiri ụtalị n'aka, ọ kpọọrọ otu nwata nwaanyị gaa n'imeụlọ ọzọ. A nụrụ m ka nwata ahụ na-ebe akwa ma na-eti mkpu. Ha na-edina ya n'ike," ka Omnia (ọ bụghị ezigbo aha ya), okenye nwaanyị chetara.

"Oge niile ha dinara ya n'ike, nwata nwaanyị a ga-eburu ọbara pụta. Ọ ka bụ obere nwata. Ọ bụ naanị n'ụtụtụ ka ha na-atọhapụ ụmụaka nwaanyị ndị a dịka ha na-ebu ozu onwe ha alọghachi. Ha niile na-ebe akwa arịrị. N'ime mkpụrụ ụbọchị iri na itoolu (19) m nọrọ n'ebe ahụ, o ruru oge m chọrọ iwepụ ndụ m."

Unicef kwuru na mwakpo ndị ahụ gụnyere ụmụnwoke bu ngwaọgụ na-awakpo ụlọ ndị mmadụ ma gwa ụmụaka ndị nwaanyị ka ha nyefee onwe ha, ebe a na-edina ụfọdụ n'ime ha n'ike n'ihu ndị ezinaụlọ ha.

Ụfọdụ oge, a na-emerụ ha ahụ ma tụba ha ime mkpuke..

N'agbanyeghị mkpesa narị abụọ na iri abụọ na otu (221), Unicef nwetara mkpesa iri asaa na asaa ndị bụ mmetọ ụmụaka.

Ọtụtụ mmadụ a chụpụrụ n'ụlọ ha n'ihi agha emeele ka ụmụnwaanyị na ụmụaka bụrụ ndị a pụrụ iwakpo.

Mbelata enyemaka Gọọmenti Trump akwụsịla enyemaka ndị dị oke mkpa

Mpụtara mpụ ndị a na-agbawa obi bụ nke kawanyere njọ n'ihi na ndị o metụtara nwere ebe ole na ole ha nwereike ịga maka enyemaka ahụike maka na ebibiela ọtụtụ ụlọọgwụ ma kwakọrọ ngwongwo ha.

Mbelata enyemaka mba Amerịka nwereike itinye nsogbu n'obere ego amawapụtara iji chekwaa ụmụaka.

Unicef na-arọpụta ogbe nchekwa maka ụmụaka site na njikọaka ndị na-ahụ maka ndị a na-emegbu emegbu n'obodo bụ ndị hibere ihe a maara dịka "ebe a na-enweta enyemaka gbatagbata" iji zute ọgbaaghara dị n'obodo ha.

Dịka kọmitii nchịkọta mba Sụdan na-elekọta ụlọọrụ ndị ahụ siri kwuo, ndị ọrụ enyemaka ahụ bụ ndị dabeere nke ukwuu n'enyemaka mba Amerịka ebe ọtụtụ n'ime ha ka a manyere ịgbachi ụlọọrụ ha.

Ọzọkwa, ngalaba ụlọọrụ UN na-ahụ maka nchekwa ikike ụmụnwaanyị kwuru na otu dị iche iche n'ime ime obodo nke ụmụnwaanyị nọ n'isi ha dị ezigbo mkpa iji weta nkwado maka ndị e dinara n'ike. Mana ha na-enweta ego erughị 2% nke ego niile UN mebere maka enyemaka na mba Sụdan.

BBC chọpụtara na opekatampe, otu n'ime otu ndị ahụ a maara dịka "She Leads" kpọchiri ụlọorụ ha oge a kwụsịrị enyemaka mba Amerịka.