Mudashiru Obasa alaghachitela dịka onyeisi ụlọomeiwu Legọs Steeti

Cheta na ụlọomeiwu ahụ wepụrụ Mudashiru Obasa dịka onyeisi ha maka ebubo nrụrụaka na mpụ dị iche iche ndị ọzọ ụbọchị Mọnde 13 Jenụwarị, 2025.

Ebe foto si, Mudashiru Obasa/Instagram

Nkọwa foto, Cheta na ụlọomeiwu ahụ wepụrụ Mudashiru Obasa dịka onyeisi ha maka ebubo nrụrụaka na mpụ dị iche iche ndị ọzọ ụbọchị Mọnde 13 Jenụwarị, 2025.
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

A họpụtala Mudashiru Obasa dịka onyeisi ụlọomeiwu Legọs Steeti.

Nke a na-abịa ka Mojisola Meranda gbara arụkwaghịm dịka onyeisi ụlọomeiwu ahụ ụbọchị Mọnde 3 Maachị, 2005.

Nke pụtara na nsogbu na ọgbaghara dị n'ụlọomeiwu ahụ kemgbe ọnwa Jenụwarị abịala na njedebe ugbua.

N'aka nke ọzọ ụlọomeiwu ahụ gara n'ihu họpụta Mojisola Meranda dịka osote onyeisi ụlọomeiwu ahụ.

Cheta na ụlọomeiwu ahụ wepụrụ Mudashiru Obasa dịka onyeisi ha maka ebubo nrụrụaka na mpụ dị iche iche ndị ọzọ ụbọchị Mọnde 13 Jenụwarị, 2025.

Mojisola Meranda agbaala arụkwaghịm dịka Onyeisi Ụlọomeiwu Legọs Steeti

Cheta na ndị omeiwu ahụ wepụrụ Mudashiru Obasa dịka onyeisi ụlọomeiwu ahụ ụbọchị Mọnde 13 Jenụwarị 2025.

Ebe foto si, Mojisola Meranda/X, Mudashiru Obasa/Instagram

Nkọwa foto, Cheta na ndị omeiwu ahụ wepụrụ Mudashiru Obasa dịka onyeisi ụlọomeiwu ahụ ụbọchị Mọnde 13 Jenụwarị 2025 ma duo Mojisola Meranda n'iyi ọrụ dịka onyeisi ụlọomeiwu ahụ.

Onyeisi ụlọomeiwu Legọs Steeti bụ Mojisola Meranda agbaala arụkwaghịm ebe Mudashiru Obasa laghachitara dịka onyeisi ụlọomeiwu Legọs steeti.

Cheta na ndị omeiwu ahụ wepụrụ Mudashiru Obasa dịka onyeisi ụlọomeiwu ahụ ụbọchị Mọnde 13 Jenụwarị 2025.

Ọ bụ maka ebubo nrụrụaka nakwa mpụ ndị ọzọ dị iche iche e boro Obasa mere e ji wepụ ya dịka onyeisi ụlọomeiwu Legọs steeti. Oge nke a mere, a họpụtara Mojisola Meranda dịka onyeisi ụlọomeiwu ahụ.

Kemgbe nke a mere, e nwere ọtụtụ ọgbaaghara n'ụlọomeiwu ahụ.

Mana Obasa gbara isi akwara si na nwepụ ya ahụ bụ nke e mere n'ụzọ megidere iwu ma kwuo ụbọchị Tọzde 27 Febụwarị 2025 'na ọ ka bụ onyeisi ụlọomeiwu Legọs steeti'.

N'okwu ya 'A bụ m onyeisi ụlọomeiwu Legọs steeti a họpụtara dịka iwu siri kwu, onye ọbụla chọrọ iwepụ m n'ọkwa, kwesịrị ime ya n'ụsọ iwu kwadoro'.

Na mkparịtaụka Obasa nwere n'ụlọmgbasaozi Channels TV ụbọchị Tọzde 27 Febụwarị, o kwuru na Meranda kwetara ịgba arụkwaghịm oge ha nwere ọgbakọ udo nke ndị isi otu pati All Progressives Congress (APC) steeti ahụ chịkọbara.

Ka ọ dị ugbua, Mudashiru Obasa enwerela oche dịka onyeisi ụlọomeiwu Legọs steeti.

E weghachitebeghị ndị ọrụ nchekwa m ruo ugbua - Onyeisi ụlọomeiwu Legọs Steeti

Mojisola Meranda katọrọ mwakpo Obasa wakporo ụlọọrụ ya dị n'ogige ụlọomeiwu ahụ ma kwuo na agwa ahụ bụ ihe jọgburu onwe ya.

Ebe foto si, Mojisola Meranda/Instagram

Nkọwa foto, Mojisola Meranda katọrọ mwakpo Obasa wakporo ụlọọrụ ya dị n'ogige ụlọomeiwu ahụ ma kwuo na agwa ahụ bụ ihe jọgburu onwe ya.

Onyeisi ụlọomeiwu Legọs steeti bụ Mojisola Meranda ekwuola na ruo ugbua, onyeisi ndị uweojii enyeghachibeghị ya ndị ọrụ nchekwa ya.

Meranda gbara nke a n'anwụ oge ọ gwara ndị ntaakụkọ okwu ụbọchị Fraịde 28 Febụwarị 2025 oge ha gachara ụlọikpe banyere nsogbu na-aga n'ihu banyere onye bụ onyeisi ụlọomeiwu ahụ.

O kwuru na onye bụbu onyeisi ụlọomeiwu ahụ bụ Mudashiru Obasa kpụpụrụ ya na ndị omeiwu ọzọ ụlọikpe banyere mwepụ ha wepụrụ ya n'ọkwa.

Esemokwu a ka e kwuru mere e ji wepụ ndị ọrụ uweojii, DSS na ndị ọrụ nchekwa ọzọ na-eso Mojisola Meranda.

Mojisola Meranda katọrọ mwakpo Obasa wakporo ụlọọrụ ya dị n'ogige ụlọomeiwu ahụ ma kwuo na agwa ahụ bụ ihe jọgburu onwe ya.

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị omeiwu Legọs ewepụla Mudashiru Obasa dịka onyeisi ha ma kwuo na n'oge na-adighị anya, ụlọ omeiwu ahụ ga-alaghachịta ọgbakọ ha.

Onye bụ Mojisola Meranda

N'afọ 2015, Mojisola Meranda zọrọ ọkwa ma merie dịka onye omeiwu na-anọchiteanya Apapa Kọnstituensi 1 n'ụlọomeiwu Legọs steeti.

Ebe foto si, Mojisola Meranda/Instagram

Nkọwa foto, N'afọ 2015, Mojisola Meranda zọrọ ọkwa ma merie dịka onye omeiwu na-anọchiteanya Apapa Kọnstituensi 1 n'ụlọomeiwu Legọs steeti.

Mojisola Meranda bụ nwaanyị mbụ rịgoro n'ọkwa dịka onyeisi ụlọomeiwu Legos Steeti.

A họpụtara ya dịka onyeisi ụlọomeiwu ahụ ngwangwa ndị omeiwu wepụrụ Mudashiru Obasa n'ọkwa dịka onyeisioche ha. E boro Obasa ebubo nrụrụaka na mpụ dị iche iche.

A mụrụ Mojisola Meranda n'afọ 1980.

N'afọ 2015, ọ zọrọ ọkwa ma merie dịka onye omeiwu na-anọchiteanya Apapa Kọnstituensi 1 n'ụlọomeiwu Legọs steeti.

O jiela ọkwa dị iche iche n'ụlọomeiwu ahụ nke gụnyere onyeisioche kọmịtii na-ahụ maka ọdịmma ụmụnwaanyị na-ibelata ụbịam, onyeisi kọmịtii na-ahụ maka mmepụta, ọzụzụ, ụgwọ ezumike nka na ọrụ ọhanaeze.

O jiri ọkwa dịka 'Chief Whip' ụlọomeiwu ahụ, tupu a họpụta ya dịka onyeisi ụlọomeiwu ahụ, Mojisola Meranda ji ọkwa osote onyeisi ụlọomeiwu Legọs steeti.

Gịnị kpatara ọgbaghara dị n'ụlọomeiwu Legọs Steeti?

Ndị ụlọomeiwu Legọs steeti họpụtara Mojisola Meranda dịka onye nọchiri Mudashiru Obasa dịka onyeisi ha.

Ebe foto si, Lagos State House of Assembly

Nkọwa foto, Ndị ụlọomeiwu Legọs steeti họpụtara Mojisola Meranda dịka onye nọchiri Mudashiru Obasa dịka onyeisi ha.

Kemgbe ndị omeiwu Legọs steeti wepụrụ Mudashiru Obasa n'ọkwa dịka onyeisi ha ụbọchị Mọnde Jenụwarị 13 2025, ọtụtụ ọgbaghara adapụtala n'ụlọomeiwu ahụ.

Obasa bụ onye nọ n'ọchịchị nke ugboro atọ dịka onyeisi bụ onye e kwuru na a na-enyo enyo maka ajọ omume na mmegbu ndị otu ụlọomeiwu ahụ.

Ngwa e wepụrụ Obasa n'ọkwa, ndị omeiwu họpụtara osote onyeisi bụ Mojisola Meranda dịka onyeisi nke ụlọomeiwu Legọs Steeti.

Ihe ruru ndị omeiwu dị pasenti 90 kwekọrịtara ka ewepụ ya n'ọkwa ahụ.

Gịnị mere e ji wepụ Mudashiru Obasa?

Okwu a kpụ n'ọnụ mere e ji wepụ ya n'ọkwa bụ maka ebubo e boro ya maka iji nde naịra iri na asaa (N17billion) rụọ otu ọnụ ụzọ dị n'ogige ụlọomeiwu ahụ.

Ebe foto si, Lagos State House of Assembly

Nkọwa foto, Okwu a kpụ n'ọnụ mere e ji wepụ ya n'ọkwa bụ maka ebubo e boro ya maka iji nde naịra iri na asaa (N17billion) rụọ otu ọnụ ụzọ dị n'ogige ụlọomeiwu ahụ.

E nweela ọtụtụ ebubo e boro banyere ọchịchị Obasa dịka onyeisi ụlọomeiwu Legọs steeti. Ebubo ndị gụnyere nrụrụaka na mpụ ndị ọzọ dị iche iche.

Okwu a kpụ n'ọnụ mere e ji wepụ ya n'ọkwa bụ maka ebubo e boro ya maka iji nde naịra iri na asaa (N17billion) rụọ otu ọnụ ụzọ dị n'ogige ụlọomeiwu ahụ.

Otu ihe onyonyo pụtara ihe gosiri oge otu onye omeiwu kwuru na ọ bụ nkwekọrịta ndị ụlọomeiwu ka Mudashiru Obasa pụọ n'ọkwa dịka onyeisi ha.

Onye omeiwu ahụ kwuru na iwu nyere ha ikike ịwepụ onyeisi ha dịka n'ụzọ iwu kwadoro.

Onye bụ Mudashiru Obasa?

A họpụtara Mudashiru Obasa dịka onye omeiwu Legọs steeti n'afọ 2003 ka ọ nọchiteanya mpaghara Agege 1.

Ebe foto si, Mudashiru Obasa/Instagram

Nkọwa foto, A họpụtara Mudashiru Obasa dịka onye omeiwu Legọs steeti n'afọ 2003 ka ọ nọchiteanya mpaghara Agege 1.
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Mudashiru Obasa bụ onye ọkaiwu ma bụrụkwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị. Ọ họpụtara ya dịka onyeisi ụlọomeiwu Legọs steeti kemgbe afọ 2015.

A mụrụ ya n'Agege otu obodo dị na Legọs steeti ụbọchị Satọde 11 Nọvemba 1972.

N'afọ 1999, Obasa zọrọ ọkwa kansịlọ na-anọchiteanya mpaghara Agege n'okpuru pati Alliance for Democracy. O meriri na ntuliaka ahụ ma nọọ n'ọkwa ahụ site n'afọ 1999 ruo afọ 2002.

A họpụtara ya dịka onye omeiwu Legọs steeti n'afọ 2003 ka ọ nọchiteanya mpaghara Agege 1.

Dịka onye omeiwu, Obasa rụrụ ọrụ n'otu kọmịtii dị iche iche nke gụnyere kọmịtii na-ahụ maka ala na ụlọ, kọmịtii na-ahụ maka nhazi. Ọ rụkwara ọrụ dịka onyeisoche kọmịtii na-ahụ maka mmepe ime obodo nakwa kọmịtii ndị ọzọ.

Ọ gara n'ihu nweta mmeri na ntuliaka e mere n'afọ 2011, 2015, 2019 na 2023.

Ọ bụ eziokwu na e dooghị anya ihe mere e ji wepụ ya n'ọkwa, mana ụlọọrụ Lasgos State Anti-Corruption Coalition boro ya ebubo ma kwuo na ego ahụ o ji rụọ ọnụ ụzọ ahụ kwesịrị ka e nnyochaa ya.

Ka e wepụrụ ya n'ọkwa, Obasa kwuru na ọ bụ ndị iru ya kpara nkata ahụ iji wepụ ya n'ọkwa dịka onyeisioche ụlọomeiwu ahụ.

Obasa gara n'ihu kwuo na 'Ebubo ahụ abụghị eziokwu. Nke bụ eziokwu bụ na ego gọọmenti steeti na-enye anyị erughị ego ole ahụ'.

O kwuru na ọ bụ maka ntuliaka na-abịa n'afọ 2027 mere ndị iro ya ji akpa nkata ịkwatu ya.