Jiri ọsọ gaa ụlọọgwụ ma ọ bụrụ na ị chọpụta ihe ndị a na ntị gị - Dọkịnta Moses

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Michael Ilediagu
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Ebeg o si, Lagos, Nigeria
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3
Mmadụ adịghị anụ ntị maọbụ ntị ịkpọchi akpochi bụ otu ọrịa nwere ike eme onye ọbụla ma nwatakịrị a mụrụ ọhụrụ, ma okeye.
N'akụkụ a, dọkịnta maara ihe gbasara ntị, akpịrị na ịmị bụ onye ọkachamara Moses Ayodele Akinola tinyere ọnụ n'ihe dị icheiche na-emetụta ntị na nke na-akwụsị mmadụ ịnụ ihe.
Akinolati kwuru nke a dịka mba ụwa na-eme nchata ịnụ ntị bụ nke a na-eme n'abalị atọ nke ọnwa Maachị afọ ọ bụla.
Isi okwu mba ụwa ji eme emume nchata ịnụ ntị nke afọ 2025 bụ "Ịgbanwe uche: nyere onwe gị aka, mee ka ntị na ahụike ịnụ ntị dịrị mmadụ niile".
Lee ihe na-egosi na mmadụ ebidola inwe nsogbu ntị

Ebe foto si, Getty Images
Akinola kwupụtara ọtụtụ ihe wereike igosi na mmadụ ebidola inwe nsogbu ntị.
Akinola kwuru na ihe ndị ahụ bụ ihe na-eme ndị okenye ma dọọ aka na ntị na onye ọbụla bidoro na-enwe udiri nsogbu ahụ kwesiri ịga hụ dịbịa bekee na-ahụ maka ntị.
Ọ kọwara na ihe ndị ahụ gunyere:
- Onye na-anụ ihe nke ọma bido na-enwe nsogbu ịghọta ihe onye ọzọ na-ekwu n'oge a na-akpa nkata.
- Onye ahụ bido na-agwa ndị mmadụ ka ha kwuharịa ihe ha kwuru.
- Onye ahụ bido na-anụ ntị nke ọma naanị n'oge a na-ekwusi okwu ike.
- Ọ bụrụ na onye ahụ na-ekiri onyonyo maọbụ na-ege redio mgbe a gbaniri okwu ya elu.
Etu o si metụta nwa a mụrụ ọhụrụ na nke e bu n'afọ

Ebe foto si, Moses Ayodele Akinola
Moses Ayodele Akinola gara n'ihu kọwaa na e were ọtụtụ ihe na-ebute adịghị anụ ihe.
Ọ sị na ihe mere mgbe adị ime mmadụ ga-eme ya ọ hara ịnụ ntị. Ọ sị na ngaraba ahụ e ji anụ ntị nwereike imebi n'ime afọ mgbe e bu onye ahụ na-afọ.
Ọ sị na ọgwụ nne nwa ahụ nụrụ maọbụ nwa nne ya na-arịa ọrịa ọtọbịrịbịrị na-akpata adịghị anụ ntị.
Ọzọ bụ nwa a mụrụ mana anya ya na-acha edoedo nke ndị ọcha kpọrọ "Juandice". Ọ sị na e kwere ịzọ ndụ nwa ahụ nke ọma ka ọrịa ahụ ghara ịba ya n'ụbụrụ.
Ọ sị na ọtụtụ ọrịa ndị ọzọ nwereike ime nwa e bu n'afọ ahara ịnụ ntị mgbe a mụpụtara ya.

Ebe foto si, Getty Images
Ụzọ mmadụ ga-esi chekwaa ntị ya
Ayodele Akinola kwuru na ọtụtụ ihe nwereike ime ka mmadụ nwee ọnọdụ adaịghị anụ ntị.
Ọ sị na mmadụ ịnọ ebe unukwụ mkpọtụ mere nwereike imebi ntị onye ahụ.
Ọzọ bụ ndị na-anọ ebe mkpọtụ na-eme oge ọ bụla nwereike inwe ọnọdụ ntị ike maọbụ inwe ọrịa ntị.
"Nnukwu mkpọtụ nwereike imebị mmadụ ntị mee ka ọ hara ịnụ ihe".
Akinola gara n'ihu kwuo na ọ dị mma na onye ọbụla were nsogbu na ntị ga-eje ụlọ ọgwụ ga hụ dọkịnta.
O kwuru ka a kpachapụ anya n'ebe ụmụaka a mụrụ ọhụrụ nọ ma nye ha ọgwụ mgbochi n'oge.










