Ihe i kwesịrị ịma maka Fr Anthony Amadi ga-anọchị Mbaka nwa mgbe nta ilekọta 'Adoration Ministry'

Fr Mbaka na Fr Amadi

Ebe foto si, Enugu Diocese

Nkọwa foto, Fada Mbaka ji aka ya gwa Bishọpụ Onaga na ọ ga-amasị ya ka Fada Amadi nọchie ya

Bishọp Callistus Onaga nke ụka Katọlik na Dayọsis Enugwu ahọpụtala ụkọchukwu Anthony Amadi ka ọ nọchie ụkọchukwu Ejike Mbaka nwa mgbenta dịka onye nlekọta ekpere 'Adoration Ministry'.

Mana ndị ekpere 'Adoration' ajụla ịnabata Fada Amadi dịka onye nlekọta ha.

Nke a na-abịa n'agbanyeghi na ọ bụ Fada Mbaka ji aka ya họpụta Fada Amadi, dịka Bishọpụ nyere ya ohere iji aka ya kpọpụta Fada ọ ga-achọ ka ọ nọchie ya nwa mgbe nta.

Lee ụfọdụ ihe i kwesịrị ịma maka Fada Amadi:

  • E chiri Anthony Amadi Fada n'ụbọchị isii nke Julaị 2013
  • Ọ bụ ya bụ onye nlekọta ndị otu 'Altar Knights' na dayọsis Enugwu
  • Ọ bụ onye Imo Steeti, mana e chiri ya ụkọchukwu na dayọsis Enugwu
  • Fr Amadi so na ndị ụkọchukwu na-esonye nke ọma n'emume ekpere nke 'Adoration Ministry', ma bụrụkwa onye nkwado Mbaka.

'We say no'... Lee ihe mere n'ụlọekpere 'adoration' Fr Mbaka n'ụbọchị ụka

Fr Mbaka

Ebe foto si, Uncle IB

Nkọwa foto, Mbaka na-agwa ndị nkwado ya okwu

Ndị ekpere 'Adoration Ministry Enugu Nigeria' mekwara obere ngagharịiwe ọzọ n'ụbọchị ụka, 'Okụtoba 2, 2022, dịka a malitekwara ekpere ọzọ n'ebe ahụ.

Iwe ha bụ maka na Bishọp ụka Katọlik n'Enugwu dayọsis bụ Callistus Onaga, ewepụla ụkọchukwu Ejike Mbaka dịka onyeisi ụlọ ekpere Adoration nwa mgbe nta.

Ndị nkwado Mbaka bucha akwụkwọ ndụ n'aka ma mere ngagharịiwe bata n'ogige ụlọ Fada Mbaka na-eti mkpu na-asị: "we say no", "we no go gree".

Ọ gịnị ka ha sị na ha agaghị ekwe?

Iwu ọhụrụ Bishọp Enugwu tinyere maka ekpere 'Adoration'

Bishop Callistus Onaga
Nkọwa foto, Bishop Callistus Onaga

Cheta na Bishọp Onaga mechiburu ụlọekpere 'Adoration Ministry' n'ihi ụfọdụ ihe Mbaka na-ekwu ma ọ na-ezi oziọma, nakwa etu o si eme ekpere ya.

Mana n'ụbọchị Fraịde ka akụkọ pụtara na ekpere 'Adoration' ga-amalitekwa ọzọ n'ụbọchị Sọnde, abalị abụọ nke Ọkụtoba 2022, mana Bishọp nyere iwu ihe a ga eme.

N'ụbọchị ụka ahụ, Mbaka gwara ndị nkwado ya na Bishọp etinyela ụkọchukwu aha ya bụ Fada Anthony Amadi, onye ga-anọchi anya ya dịka onyeisi 'Adoration' ruo mgbe Mbaka mechara ihe enyere ya mee.

Iwu ndị ọzọ nke Bishop tinyere gbasara ekpere 'adoration' gụnyere:

  • Ekpere ụbọchị Wenezde na Fraịde agaghị na-adịzi ugbua
  • Naanị 'Mass' ụbọchị ụka ka a ga na-aka
  • Fada Mbaka n'onwe ya agaghị na-akazi 'Mass' ebe ahụ
  • Fada Mbaka ga-agawa njem ekpere bekee kpọrọ 'prayer pilgrimage' ruo mgbe Bishop ga-enye iwu ka ọ lọghachi
  • Amabeghị ebe Mbaka ga-aga njem ekpere a, amabeghịkwanụ ogologo oge ole ọ ga-anọ na ya.

Ọ bụ iwu ndị a ka ndị nkwado Fada Mbaka na-etiri mkpu na-asị "we say no", "we no go gree".

Nke a abụghị nke mbụ...

Mbaka
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Nke a abụghị nke mbụ ndị nkwado Fada Mbaka na-eme ngagharịiwe gbasara nna ha ukwu.

N'ọnwa Jun 2022, oge Bishọp Callistus Onaga nyere iwu ka akwụsị ekpere maọbụ emume ọbụla n'ụlọekpere 'Adoration', ndị nkwado Mbaka mekwara ngagharị iwe na-akatọ Bishop Onaga.

Ha kwuru ọtụtụ okwu ọjọọ megide Bishop, ụfọdụ kwuru na "ọ bụghị Bishopụ anyị".

Otu onye n'me ndị ahụ mere ngagharị iwe kwuru sị: "Onaga, hapụrụ anyị nna anyị Mbaka. Ana m akpọ ya Onaga, Onaga bụ aha ya, aha ya abụghị Bishọpụ."

Ọzọkwa, n'ọnwa Mee 2021, ndị nkwado Mbaka meere ngagharịiwe banye n'ime ogbe dị icheiche n'Enugwu dịka ha sị na ha na-achọ Mbaka achọ.

N'oge ahụ, asịrị fegharịrị na ndị ntọ tọọrọ Mbaka, ebe ụfọdụ kwuru na ọ bụ Bishọpụ nyere iwu ka e jichie Mbaka.

Ndị nkwado ya nukọọrọ n'igwe gawa n'ụlọ Bishọp nakwa n'ogige ụlọụka 'Holy Ghost Cathedral' Enugu.

Ha mebiri ọtụtụ ihe ma n'ụlọ Bishọp ma n'ụlọụka ahụ.

Mbaka mechara pụta gwa ha okwu ma kwuo na ọ bụ Bishọpụ nyere ya iwu ka ọ hapụ ịpụta n'ọha ruo nwa mgbe nta.

Onye bụ Fada Mbaka?

Fr Ejike Mbaka

Ebe foto si, Adoration Ministry Enugu Nigeria

Nkọwa foto, Fr Ejike Mbaka
  • Ezigbo aha ya bụ Ejikemuwa Camillus Mbaka.
  • Ọ bụ onye obodo Ituku nke dị n'okpuru ọchịchị Awgu n'Enugwu Steeti.
  • Ọ gụrụ akwụkwọ Sekọndịrị n'ụlọakwụkwọ St Vincent dị n'Agbaogugu, Enugwu steeti.
  • O mechara banye ụlọakwụkwọ ebe a na-azụ ndị ụkọchukwu a kpọrọ St Joseph Seminary Ikot-Ekpene.
  • E chiri Fada Mbaka ụkọchukwu n'ọnwa July afọ 1995, nke a pụtara na o meela afọ iri abụọ na isii o ji bụrụ ụkọchukwu.
  • Ọ bụ onyeisi ụlọ ekpere a kpọrọ 'Adoration Ministry' nke ọ na-eme na-adọta puku kwuru puku mmadụ.
  • Mbaka bụkwa otiegwu ụka a ma ama nke tipụtarala ọtụtụ egwu gụnyere: "Miracle Worker"; "Jesus mụ na gị ga-ebi"; Ebube Muonso"; "Aka Ndi Muo Ozi"; "Ike M Kwo Aba; "Jesus Obu Ngwongwo"; "Chideraa"; wdg.
  • Ọ bụ ya nwe ụlọọrụ Aqua Rapha nke na-arụpụta mmiri ọṅụṅụ nakwa ụdị ihe ọṅụṅụ Bekee kpọrọ 'Yoghurt'.
  • Ọ bụkwa onye na-ede akwụkwọ ụka na akwụkwọ ekpere dị icheiche nke o si na ya enweta ego.
  • Dịka Mbaka ji ọnụ ya kwuo, ndị ọ na-akwụ ụgwọ ọnwa karịrị mmadụ puku iri abụọ na atọ (23,000) kwa ọnwa.