Etu nwata nwaanyị si bepụ isi nna ya ma tufuo ozu ya na Ngwo n'Enugwu

Nke na-afịọ ugbua na Ngwo, nke dị n’okpuruọchịchị Udi n'Enugwu steeti bụ na otu nwaagbọghọ ji mma bepụ nna ya isi, gburie ozu ya ma zoo ya.
BBC Igbo gara n'obodo mkpamkpa ahu kpara a nakpo Okpatu, Okwojo Ngwo were chọpụta ka ya bụ ihe siri mee.
Aha nwoke ahụ egburu egbu bụ mazi Reuben Onyiba, onye Abia dị na Udi, Enugwu steeti.
Mgbe anyi rutere ebe a na-akpọ Ụzọ-Nwa-Money nke Okwojo Ngwo, n’ụlọ Mazi Donald Onyia bụ onye nwe ụlọ nwoke ahụ nwụrụ anwụ, anyị chọpụtara na iru uju na anya mmiri juputara ndị anyị hụru ebe ahụ na anya, makana ụdị ihe ọdachi a emebeghị ebe ahụ na mbụ.

Mazi Donald kwuru “ ọ bụ na ụlọ m ka mazi Reuben Onyiba na nwunye ya na nwa ya nwaanyị bi. Ọ bụzị na ụbọchị wenezde, March 6th, 2024 ka nwunye ya biara gwa m na ana-achọ dị ya achọ ka mgbe ụnyaahụ”
“Mụ na ndị agbata obi nyere aka chọọ ya mkpụrụ ụbọchị abụọ ahụzia ozu ya na “Dustbin”, ọ bọ nnukwu ihe nwute makana ebekasịrị isi ya ma aka n’ụkwụ ya.
Ndị agbata obi nwoke ahụ bụ onye na ere akwa ọkịrịka n’ihu ụlọ ahụ kọwara mazi Onyiba dịka onye udo na anaghị achọ nsogbu ma ncha.
Ha kọwara na ndị uwe ojii akoụrụla nwa ya nwaanyị na nwunye ya dika ndị aka ha nwere ike idi na ogbugbu ya bụ nwoke.
Onye nwe ụlọ ya bụ Maazị Donald gwara anyị na ndị uwe ojii kpụụrụ nwunye ya na nwa ya nwaanyi ka mgbe ihe ahụ mere ma kwuo na a na enyo enyo na ọ bụ nwa ya nwaanyị kpara arụ ahụ.
Nchọpụta gosiri na Mazi Reuben Onyiba bụ onye “Headmaster” lara ezumike nka.
O bi na Okwojo Ngwo n’ihi na nwunye ya bụ onyeisi ụlọ akwụkwọ Amachara primary school na Ngwo.
Ndị be ya bụ nwoke, bụ ndị obodo Abia, Udi LGA abịala na ngwo tụtụkọsia akụkụ ahụ nwanne ha ga lie ya.
Ndị uweojii azabeghi ozi ekwentị BBC Igbo zigara ha rue ugbua akụkọ a na-apụta.









