Ihe anyị ma maka nwaokoroọbịa a gburu nne ya ma lie ozu ya n'Umuagu Inyi, Enugwu Steeti

Nwaokoroọbịa gburu nne ya

Ebe foto si, Screen shot

Ndị uweojii Enugwu Steeti ekwuola na aka ha akparala otu nwokoroọbịa a sị gburu nne ya ma lie ozu ya n’azụ ụlọ ha n’obodo Umuagu Inyi dị n’okpuruọchịchị Oji River nke steeti ahụ.

Daniel Ndukwe bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ gwara BBC Igbo na ha amalitela ime nyocha banyere arụ a nwamadị a mere.

Etu ihe a si mee

Onyeisi gburugburu ‘President General’ nke obodo Umuagu Inyi bụ Maazị Anoliefo gwara BBC Igbo na nke mere n’abalị ụbọchị ụka 3 Disemba 2023.

“Ọ bụ n’abalị ụbọchị ụka gara aga ka nwaokoroọbịa gburu nne ya ma lie ozu ya n’azụ ụlọ n’akụkụ ebe ha na-asa ahụ,

“E ruru n’ụtụtụ ụbọchị Mọnde ka otu onye obodo hụrụ ka ọbara juru n’azụ ụlọ ebe nwaokoroọbịa ahụ na nne ya bi, o tiri mkpu ma kpọkuo ndị ọrụ nchekwa.

“Mgbe ndị mmadụ gbakọjuru, a nwuchiri nwokoroọbịa ahụ ma malite ịjụ ya ebe ọbara ahụ si. O kwuru na ọ bụ ọbara nne ya bụ onye o gburu n’abalị.

“Mgbe a jụrụ ya kedụ ebe ozu ya dị, ọ kpọrọ ha gawa n’azụ ụlọ be ebe o liri ozu nne ya. Ndị nchekwa na ndị mmadụ manyere ya n’ike ka ọ bọọ ozu nne ya ahụ.”

Maazị Anoliefo kwuru na dịka a na-agba nwamadị a ajụjụ, na o kwupụtara etu o siri gbuo nwa nwanne nne ya ahụ n’ọnwa Juun 2023 ma liekwa ozu ya.

“Nwaokoroọbịa gara n’ihu kwupụta na o gburu nwa nwanne nne bụ nwaanyị ma liekwa ozu n’azụ ụlọ ha. Ahụ nwaọgbọghọ ahụ ereela naanị okpokoro isi ka abọpụtara n’ala.”

Nwamadị a ekwughi kpọmkwem ihe bụ iwe ya mere o jiri gbuo nne ya na nwa nwanne nne ya.

Anoliefo kwuru na nwaanyị ahụ bụ onye obodo Umuagu Inyi, a lụọ ya n’obodo ọzọ mana mgbe di ya nwụrụ ka ọ kpọọrọ nwa ya nwoke a gburu ya lọghachite obodo ebe a mụrụ ya.

Onye ‘President General’ nke obodo niile dị n’okpuruọchịchị Oji River bụ Ejike Ilo Tasie kwuru na ihe ọ chọpụtara na nwamadị a gburu nne ya ṅụrụ ọgwụike a kpọro mkpụrụmmiri.

O kwuru na ha ndu amalite ịchọpụta ndị niile na-ere ọgwụike n’ụdị ọbụla na gburugburu obodo ha, na a ga-ata ndị a ahụhụ ruuru ha.