Ihe anyị ma maka nwaokoroọbịa a gburu nne ya ma lie ozu ya n'Umuagu Inyi, Enugwu Steeti

Ebe foto si, Screen shot
Ndị uweojii Enugwu Steeti ekwuola na aka ha akparala otu nwokoroọbịa a sị gburu nne ya ma lie ozu ya n’azụ ụlọ ha n’obodo Umuagu Inyi dị n’okpuruọchịchị Oji River nke steeti ahụ.
Daniel Ndukwe bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ gwara BBC Igbo na ha amalitela ime nyocha banyere arụ a nwamadị a mere.
Etu ihe a si mee
Onyeisi gburugburu ‘President General’ nke obodo Umuagu Inyi bụ Maazị Anoliefo gwara BBC Igbo na nke mere n’abalị ụbọchị ụka 3 Disemba 2023.
“Ọ bụ n’abalị ụbọchị ụka gara aga ka nwaokoroọbịa gburu nne ya ma lie ozu ya n’azụ ụlọ n’akụkụ ebe ha na-asa ahụ,
“E ruru n’ụtụtụ ụbọchị Mọnde ka otu onye obodo hụrụ ka ọbara juru n’azụ ụlọ ebe nwaokoroọbịa ahụ na nne ya bi, o tiri mkpu ma kpọkuo ndị ọrụ nchekwa.
“Mgbe ndị mmadụ gbakọjuru, a nwuchiri nwokoroọbịa ahụ ma malite ịjụ ya ebe ọbara ahụ si. O kwuru na ọ bụ ọbara nne ya bụ onye o gburu n’abalị.
“Mgbe a jụrụ ya kedụ ebe ozu ya dị, ọ kpọrọ ha gawa n’azụ ụlọ be ebe o liri ozu nne ya. Ndị nchekwa na ndị mmadụ manyere ya n’ike ka ọ bọọ ozu nne ya ahụ.”
Maazị Anoliefo kwuru na dịka a na-agba nwamadị a ajụjụ, na o kwupụtara etu o siri gbuo nwa nwanne nne ya ahụ n’ọnwa Juun 2023 ma liekwa ozu ya.
“Nwaokoroọbịa gara n’ihu kwupụta na o gburu nwa nwanne nne bụ nwaanyị ma liekwa ozu n’azụ ụlọ ha. Ahụ nwaọgbọghọ ahụ ereela naanị okpokoro isi ka abọpụtara n’ala.”
Nwamadị a ekwughi kpọmkwem ihe bụ iwe ya mere o jiri gbuo nne ya na nwa nwanne nne ya.
Anoliefo kwuru na nwaanyị ahụ bụ onye obodo Umuagu Inyi, a lụọ ya n’obodo ọzọ mana mgbe di ya nwụrụ ka ọ kpọọrọ nwa ya nwoke a gburu ya lọghachite obodo ebe a mụrụ ya.
Onye ‘President General’ nke obodo niile dị n’okpuruọchịchị Oji River bụ Ejike Ilo Tasie kwuru na ihe ọ chọpụtara na nwamadị a gburu nne ya ṅụrụ ọgwụike a kpọro mkpụrụmmiri.
O kwuru na ha ndu amalite ịchọpụta ndị niile na-ere ọgwụike n’ụdị ọbụla na gburugburu obodo ha, na a ga-ata ndị a ahụhụ ruuru ha.








