Ihe m chere mere Atiku jiri hapụ ịhọrọ Wike - Ned Nwoko

Ebe foto si, BBC/@Atiku/Twitter
Ned Nwoko bụ ọkaiwu na onye ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa, gwara BBC Igbo ihe o chere mere Atiku jiri hapụ ịhọrọ Wike dịka osote ya.
Ọ gwara BBC Igbo nke a dịka ọ na-ewu ewu na Abubakar Atiku ji ọkọlọtọ People's Democratic Party azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na-ele anya ịhọrọ Nyesom Wike dịka osote ya.
Mana akụkọ pụtara taa bụ na Ifeanyi Okowa na-achị Delta steeti bụ onye Atiku họpụtara n'ikpeazụ.
Lee ihe Ned Nwoko kọwarala BBC Igbo n'uju ebe a.






