Onye ga-abụ eze ga-akwụ ọtọ na ntuliaka ọkwa gọvanọ Ebonyi Steeti?
Ọ fọla ụbọchị atọ tupu ndị Ebonyi Steeti enuputa n'igwe ịhọpụta onye ga-anọchi Dave Umahi dịka gọvanọ ha.
Mmadụ iri na-atọ na-azọ ọkwa gọvanọ n'Abia Steeti, nke ọbụla n'ime ha na-ekwe nkwa iweta mmepe na steeti ahụ nakwa ịkwalite ọdị mma ndị mmadụ.
Lee ndị na-azọ ọkwa gọvanọ n'Ebonyi steeti:


Ebe foto si, Odii/Francis/Odoh/Awuregu/Facebook


Nwifuru Francis Ogbonna - APC

Ebe foto si, Nwifuru Francis Ogbonna
- Ọ bubu onyeisi ụlọ omeiwu Ebonyi steeti ruo afọ asatọ, ebe ọ nọchitere anya mpaghara Izzi West.
- Ọ dị afọ 48
- Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum Ebonyi Steeti

Odoh Benard - APGA

Ebe foto si, Odoh Bernard/Facebook
- Ọ bụbu odeakwụkwọ Ebonyi steeti bido na 2015 ruo 2018
- Ọ zọrọ ọkwa gọvanọ Ebonyi steeti n'afọ 2019 na pati APC
- Ọ bụ ọkammụta na ngalaba Geophysics

Nkwegu Edward Okereke - LP

Ebe foto si, Nkwegu Edward/Facebook
Ọ zọkwara ọkwa gọvanọ na 2015 nakwa 2019
Ọ bụ 'Architect'
Ọ bụ ojiego achụ ego a ma ama

Chukwuma Odii Ifeanyi - PDP

Ebe foto si, Chukwuma Odii Ifeanyi/Facebook
Ọ bụ onye Isu dị n'okpuru ọchịchị Ọnịcha, Ebonyi Steeti
Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum 'Open University' nke Naịjirịa.
Ọ dị afọ 48

Nwandugo Chukwuma Awuregu - AA

Ebe foto si, Nwandugo Chukwuma Awuregu
Ọ bụbu Kọmishọna ọrụ na njem n'Ebonyi Steeti
Ọ bụ civil engineer
Ọ dị afọ 54

Oziomaeze Kenneth Nwabueze - ADP

Ebe foto si, Oziomaeze Kenneth Nwabueze/Facebook
Ọ bụ onye ụkọchukwu maọbụ pastọ na bekee
Ọ dị afọ 47

Opoke Sunday Andrew - YPP

Ebe foto si, Opoke Sunday Andrew/Facebook
Ọ zọburu ọkwa gọvanọ na PDP tupu ọ banye YPP.
Ọ bụ ọkachamara na ngalaba mmụta gbasara ime ala nke bekee na-akpọ 'geology'
Ọ bụkwa onye oji ego achụ ego

Usulor Anthony N - NRM

Ebe foto si, Tony Usulor/Facebook
Tony Usulor mechara kwuo na ya agaghị azọzi ọkwa gọvanọ, na ọ ga-akwado Chukwuma Odii nke PDP.
Mana Inec ewepụghị aha ya n'akwụkwọ ndị na-azọ ọchịchị.

Adol-awam Chris Soni - NNPP

Ebe foto si, Adol-awam Chris/Facebook
Ndị ọzọ gụnyere...
Nwonomara Bernard Nyaba - ADC
Igwe Chinyere Judith - APM
Okpara Prince Apollos Ndubisi - APP
Nwankwo Michael Ikechukwu - SDP











