Etu e si chọta nwata dị afọ 11 furu n’Enugu n’ime Owerri, Imo steeti

Oscar Chigemezu ji foto nwa ya bụ Chinedu onye ọ na-achọ achọ
Nkọwa foto, Oscar Chigemezu ji foto nwa ya bụ Chinedu onye ọ na-achọ achọ

Akụkọ pụtara na nwata nwoke dị naanị afọ 11 nke a kpọrọ Golden Chinedum Okechukwu furu n’Enugu steeti n’izu a.

Nna nwata a bụ Oscar Chigemezu Ibe gwara BBC Igbo n’abalị ụbọchị Sọnde bụ ụbọchị 18 nke Sepụtemba, 2022 na ha achọtala ya bụ nwata n’ikwu nne ya dị n’ime Owerre, Imo steeti.

Ọ kọwara na nwanne ya nwoke nke bi n'Owerri gwara ya na ha hụrụ akụkọ ofufu nwata a.

Ọ gara n'ihu kwuo na o zigara nwanne ya nwoke ahụ ka o tinye aka gaa ikwu nne nwata a dị n'Owerre nyere aka chọọ nwata ahụ ebe ahụ.

Nke a na-eme dịka nne nwata nọ na mba Gana kemgbe ebe o mere njem.

Ibe kwuru na nwanne ya nwoke ahụ gbaara ya ama na ya ji anya ya hụ nwata ahụ na nke ikwu nne ya dị na Owerre mgbe ọ garuru ebe ahụ.

Mana Ibe gara n'ihu kwuo na ihe ịtụ na anya mere bụ na ndị ikwu nne ya agwaghị ya kemgbe na ha ji nwata nwoke ahụ agbanyeghị na o zitere ha ozi na nwa ahụ na-efu efu n'ụbọchị Wenezde.

O kwukwara na kemgbe ụbọchị Fraịdee ezinụlọ ikwu nne nwata a ekweghịzị zaa ekwentị ha dịka ọ kpokuru ha aghara aghara.

Nke a mere o jiri kwuo na ọ ka na-achọ ịmata kpọm kwem etu ya bụ nwata siri garuo Owerre.

Mazị Ibe kwuru na ọ ga-aga ebe ahụ n'ụbọchị Mọnde ịga kpọrọ nwa ya.

Mana o ji olu ọṅụ kwuo "Obi dị mụ na ezinaụlọ m mma maka nchọta anyị chọtara nwa anyị."

"Ihe a bụ oge egwu na Naịjirịa ya mere abụ ọṅụ jiri ju anyị ọnụ maka nchọta a".

Akụkọ ofufu nwata a wuru ewu nke ukwu dịka ọtụtụ ndị mmadụ ji ụjọ na-ekesa ozi ofufu ya na soshal midia ma na-arịọ ka ọha gbata ọsọ tinye aka na nchọta ya.

Chinedu Golden Okechukwu

Ebe foto si, Oscar Chigaemezu Ibe

Nkọwa foto, Chinedu Golden Okechukwu, Nwata nna ya sị na ọ na-efu efu

Ihe nna Chinedu kwuru maka ofufu ya

Cheta na ọ bụ n'ụbọchị Satọde, bụ ụbọchị 17 nke Sepụtemba ka Maazị Ibe gwara BBC Igbo etu nwa ya nwoke bụ Chinedu Golden Okechukwu, onye gara ikpofu ahịhịa si bụrụzie onye a na-achọ achọ.

O kwuru na ya bụ ihe mere n'ụbọchị Wenezde, abalị iri na anọ nke ọnwa Sepụtemba, n'ebe elekere anọ nke mgbede, na mpaghara Trans-Ekulu, Enugwu steeti.

O kwuru na kamgbe ihe a mere ha-ewegala mkpesa n'aka ndị uweojii mana ha achọtaghị nwa ahụ ruo ụtụtụ Sọnde.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugu steeti bụ Daniel Ndukwe zara ajụjụ BBC Igbo jụrụ ya n'ụbọchị ụka banyere akụkọ ofufu nwa a ma kwuo na ọ ga-eziteghachị ozi ma ọ chọpụta ma edebanyere aha nwa a na ndị na-efufu n'Enugu n'ezie mana oziteghịzị ozi ọbụla banyere nwata ahụ.

Akụkụ Trans Ekulu nke Enugwu steeti
Nkọwa foto, Akụkụ Trans Ekulu nke Enugwu steeti

'Nwa m gara ikpofu ahịhịa kemgbe Wenezde ma fuo'

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Mazi Oscar Ibe kwuru na nwa ya bịakwutere ya n'ụbọchị ahụ sị na ya chọrọ ịga kpofuo ahịhịa, maka na ọ na-esi isi ebe e debere ya.

Ka ihe dịka nkeji iri atọ gafere mana nwa ahụ alọtabeghị, Ibe pụrụ n'ezi ịmata ihe ji nwa ya.

"Oge m pụtara n'ezi, ajụrụ m ndị mmadụ ma ha ahụrụ Chinedu nwa m, ha sị na ha hụrụ ya ebe o bu ahịhịa na-aga ikpofu," Ibe kwuru.

"Mana ka m rutere ebe a na-ekpofu ahịhịa, ahụghị m ya. Amalitere m ịchọ ya ebe niile, chọrọ ya gaa n'ụlọ ụfọdụ ndị enyi ya, mana ha sị na ọ bịaghị be ha."

Ibe sị na ya malitere ịkpọ ndị ezinụlọ na ndị enyi ya na-akọrọ ha ihe merenụ, ha wee sị ya gaa mee mkpesa na nke ndị uweojii.

"Mgbe m gara n'ụlọọrụ ndị uweojii dị na Trans-Ekulu ebe a, ha sị na m ga-eche ruo awa 24, tupu m weta mkpesa m."

"Na mgbede echi ya bụ Tọọzde ka m laghachikwara ebe ahụ, ha wee debanye mkpesa m n'akwụkwọ ma zipụkwa okwu n'igwe redio."

"Mana kamgbe ahụ anụbeghị m ihe ọbụla maka ya. Ụfọdụ ndị enyi m enyela aka tinye ya n'akara soshal midia ha, mana enwebeghị nke mịtara mkpụrụ."

Ibe kwuru na nwa ya nwoke dị afọ iri na abụọ ma nọrọkwa na klaasị nke isii n'ụlọakwụkwọ praịmarị.

Na nso nso a, ọtụtụ akụkọ ndị efu efu na-apụta aghara aghara n'akụkọ Naịjirịa dị icheiche ọkachasị dịka ọnọdụ eneweghi ezi nchekwa ka na-arị ibe ya elu na Naịjịrịa ugbua.

Ụmụaka na-abụkarị ndị na-adanye n'ọnọdụ ofufu nke mere ndị uweojii ji ezịpụta ozi nye ọha etu ha ga-esi chekwa ụmụ n'oge dị etu a.

N'ọnwa Ọgọọst, 2022, ụlọọrụ The International Committee of the Red Cross (ICRC) zipụtara ozi na Naịjirịa bụ mba Afrịka ebe ndị mmadụ kacha efu efu, ọkachasị ụmụaka.

Ozi ha kwuru na nnyocha ha gosiri na a na-achọ nchịkọta ụmụaka 14,000 achọ n'akụkụ Naịjirịa dị iche iche ruo mgbe ha zịpụtara ya bụ ozi.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post

Ụdị ihe dị etu a emeela na nso nso a

Maureen Wechinwu
Nkọwa foto, N'ọdị nso a ka e jidere otu 'Rev Sr' adigboroja ji ụmụaka a tọọrọ atọrọ atụ mgbere ahịa na Rivers Steeti.

Ntọrị ụmụaka abụghị ihe ọhụrụ na mpaghara dị icheiche na Naịjirịa, n'agbanyeghị na ndị ọrụ nchekwa na-ekwu na ha na-agbasi mbọ ike ịkwụsị ya.

N'ọdị nso a, ndị uweojii Pọtakọtụ, Rivas steeti kwuru na ha gbapụtara ụfọdụ ụmụaka a ndị a tọọrọ na Bayelsa steeti nakwa akụkụ Rivers steeti dị icheiche kamgbe 2020.

Ha kwuru nke a dịka ha jidere otu nwaanyị na-eke ekike dịka ndị 'Reverend Sister'nke ụka Katọlik, dịka a na-ebo ya ebubo na akaọrụ ya bụ ịtụ mgbere ụmụaka, dịka ndị uweojii Rịvas steeti si kwuo.

E jidere nwaanyị a na Pọtakọtụ, na ebe mbido ọnwa Sepụtemba, ma zọpụtakwa ụmụaka dị iri na ise n'ọnụọgụgụ n'aka ya. Ụmụaka ndị a dị n'agbata afọ atọ ruo afọ iri na atọ.