Etu aka si kpara 'Rev Sister' adigboroja maka ebubo ịtụ mgbere ụmụaka

Aka akparala otu nwaanyị aha ya bụ Maureen Wechinwu, onye na-eke ekike dịka ndị 'Reverend Sister' nke ụka Katọlik, mana ndị uweojii na-ekwu na ọ bụ ịtụ mgbere ụmụaka ka o ji mere aka ọrụ.
Ndị uweojii Rivers steeti gbara nwaada a n'anwụ n'ụbọchị Wenezde, ebe ọ nọ saa asịsa ma kọọrọ ndị ntaakụkọ na 'sister' nke ya bụ nke adigboroja.
Ndị uweojii kwuru na nwaanyị a nwere ụlọ ebe a na-echekwa ụmụaka na-enweghị nne na nna, mana ọ bụ mgbere ahịa ka o ji ụmụaka ahụ atụ.
Ụmụaka a napụtara n'aka 'sister' adigboroja a dị iri na ise n'ọnụọgụgụ. Ha ncha dị n'etiti afọ ise ruo afọ iri na ise.
Ụmụaka a zọpụtara n'aka 'sister' adigboroja a

1) Prosper Godwin - onye ndị ntọ tọọrọ na Bayelsa steeti n'ọnwa Ọkutoba afọ 2020 na Bayelsa steeti.
2) Queen Harry - onye ndị ntọ tọọrọ na mpaghara Mile 1, na Diobu Pọtakọtụ oge ọ na-agara nwanne ya nwaanyị ozi.
3) Miracle Ohiri - Onye a tọọrọ na mpaghara Ada-George, Pọtakọtu, ya na nne ya na ụmụnne ya abụọ, bụ ndị a hụbeghi ruo taa. Ihe a mere n'ọnwa Nọvemba 2021.
4) Favour Edeze - Onye a tọọrọ n'ahịa dị na 'Creek Road' na Pọtakọtụ n'ọnwa Eprel afọ a.
5) Chiemela Obinna - Onye a tọọrọ na mpaghara Rumuodara, Oroigwe, Pọtakọtụ n'ọnwa Eprel afọ a.
Ụmụaka ise a bụ ndị a chọtarala nne na nna ha ma kpọọ ha ka ha bịa kpọrọ ụmụ ha.
Mana ndị uweojii sị na ha ka na-agba mbọ ịchọta nne na nna ụmụaka iri ndị fọrọ afọ dịka nnyocha ka na-aga n'ihu.
Onye bụ Maureen Wechinwu?
Oge ndị ntaakụkọ gbara nwaanyị a ajụjụ ọnụ n'ogige ndị uweojii, o kwuru na ya abụghịzi 'Rev Sister' ugbua, mana ya bụbu n'oge mbụ.
O kwuru sị: "A nọbu m n'otu ndị 'sister' a na-akpọ 'Our Lady of Victory Missionary Sisters' nke dị na mba ofesi.
"Isi ụlọọrụ anyị dị na England; naanị m bụ onye Naịjirịa mbụ sonyere n'otu a."
"Enwere m ụlọọgwụ na-enye ọgwụ mgbọrọgwụ. Aha ụlọọrụ m bụ 'St Francis of Asisi Orphanage home."
Nwaanyị a gara n'ihu kwuo na ya ma na ụmụaka ise n'ime iri na ise ahụ ọ kpọ, bụ ụmụ onye ọzọ, mana ndị ọzọ bụ otu nwoke aha ya bụ Victor na otu nwaanyị aha ya bụ Alice na-akpọtara ya ha.
O kwuru na oge ụfọdụ na ya na-enye ndị na-ekutere ya ụmụaka ahụ ego.
"Ụfọdụ oge ana m enye ha N50,000, N60,000, maọbụ N100,000.
Ndị uweojii sị na ha ka na-eme nnyocha ịchọta ndị niile ha na nwaanyị a na-arụkọ ọrụ.









