Chibuike missing child: "Ka nwa anyị furu efu achọtara si fuokwa ọzọ n'aka ndị uweojii"

Aha onyonyo, Nne na nna Chibuike ji foto nwa ha furu efu

Chibuike Iheanacho furu efu n'ọnwa Febrụwarị 2017 oge o si ụlọakwụkwọ alọta.

Nne na nna ya bụ Joy na Chinweuba Iheanacho achọọla ya ihe dịka afọ anọ tupu ha hụ foto ha sị na ọ bụ nwa ha n'ọnwa Febrụwarị afọ 2021 na Facebook.

Mana oge ha gara na nke ndị uweojii ịkpọlata ya, ọ bụrụ na nwaanyị ọzọ agaala kpọrọ ya.

Nwaanyị ahụ gwara ndị uweojii na ọ bụ nwa ya, mana nnyocha mechara gosi na nke ahụ abụghị eziokwu.

Ugbua, nwatakịrị ahụ bụ Chibuike efuola ọzọ.

Akụkụ na-ekwu na ọ nọzị Imo steeti ugbua.

Ndị uweoji gwara Joy na di ya bụ Chinweuba ka ha weta N200,000 iji gaa kpọlata ya.

Gere akụkọ a n'uju.

Ndị mere ya bụ Chukwunaeme Obiejesi na Chiemela Peter.