Chibuike missing child: "Ka nwa anyị furu efu achọtara si fuokwa ọzọ n'aka ndị uweojii"
Chibuike Iheanacho furu efu n'ọnwa Febrụwarị 2017 oge o si ụlọakwụkwọ alọta.
Nne na nna ya bụ Joy na Chinweuba Iheanacho achọọla ya ihe dịka afọ anọ tupu ha hụ foto ha sị na ọ bụ nwa ha n'ọnwa Febrụwarị afọ 2021 na Facebook.
Mana oge ha gara na nke ndị uweojii ịkpọlata ya, ọ bụrụ na nwaanyị ọzọ agaala kpọrọ ya.
Nwaanyị ahụ gwara ndị uweojii na ọ bụ nwa ya, mana nnyocha mechara gosi na nke ahụ abụghị eziokwu.
Ugbua, nwatakịrị ahụ bụ Chibuike efuola ọzọ.
Akụkụ na-ekwu na ọ nọzị Imo steeti ugbua.
Ndị uweoji gwara Joy na di ya bụ Chinweuba ka ha weta N200,000 iji gaa kpọlata ya.
Gere akụkọ a n'uju.
Ndị mere ya bụ Chukwunaeme Obiejesi na Chiemela Peter.

