Etu ndị mmadụ si eri uju maka ọnwụ Doyin Okupe

Doyin Okupe

Ebe foto si, Doyin Okupe/facebook

Nkọwa foto, Doyin Okupe
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onye ndọrọndọrọ ọchịchị a ma ama na Naịjirịa bu Doyin Okupe anwụọla n'afọ iri asaa na abụọ (72).

Akụkọ kwuru na Okupe rịara ọrịa a na-enyo enyọ na ọ bụ akpụ nke ndị bekee na-akpọ cancer.

Okupe tupuu ọ nwụọ bụ Ọkammụta n'ihe banyere ndọrọndọrọ ọchịchị.

Ọ rụrụ ọrụ dịka ọnụ na-ekwuru gọọmentị ndị chịburu Naịjirịa n'okpuru ọchịchị Olusegun Obasanjo na Goodluck Jonathan.

Ọ bụkwa ọnụ na-ekwuru ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị Labour Party n'afọ 2023 mgbe Peter Obi na-azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa.

Ihe Peter Obi kwuru maka Doyin Okupe

Onye ji otu ndọrọndọrọ ọchịchị Labour Party were zọọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023 bụ Perter Obi kọwara Doyin Okupe dịka nwoke a ma ama na Naịjirịa nakwa onye ọ na-amasị ka Naịjirịa dị mma.

Peter Obi mere ka a mata nke a n'ozi o zipuru na soshal mịdịa ya bụ ebe ọ nọọrọ kwuo na ọnwụ Doyin Okupe bụ ihe mwute.

N'okwu ya "Ọ bụ ihe iwe na m nwetere ozi na Doyin Okupe anwụọla".

"E ji m aha ezịnaụlọ m, ndị Obidient were na-eru uju. Ọnwụ ya bụ nnukwu ihe funarịrị anyị"