Etu a sị nwoke na nwunye ya si gbuo nwa ha nwoke, lie ya n'azụ ụlọ ha n’Abịa steeti

Akụkọ si obodo Umuokpulor Abayi nke okpuruọchịchị Osisioma n’Abịa steeti na-ekwu na otu nwoke na nwunye a kpọrọ Emmanuel Onyenweaku Nwankpa na Happiness Emmanuel Onyenweaku gburu nwa nwaanyị ọzọ nwoke nwaanyị ọzọ mụrụ ha ma lie ya n’azụ ụlọ ha.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Geoffrey Ogbonna gbara BBC Igbo ama akụkọ a ma kọwa
“E nwebeghi onye zitere anyị ozi mkpesa kpọm kwem maka ọnwụ nwaamadị a mana akụkọ ya eruola anyị ntị site na soshal midia.”
“Mbọ niile anyị gbarala ịnwụchi ma malite nnyocha n’okwu a amịtabeghị mkpụrụ n’ihi na akụkọ kwuru na ndị obod ahụ achụpụla di na nwunye a n’obodo ahụ.”
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Kedụ ka ihe a siri mee?
Onye ntaakụkọ BBC Igbo mere njem gaa obodo Umuokpulor Abayi bụ ebe a sị ihe a mere ma nụta ọtụtụ akụkọ n’ọnụ ndị obodo ahụ.
Ọ gara n’ụlọ ebe a sị ihe mere ma hụ na ọ tọgbọ chakoo dịka e kwuru na a chụpụla Emmanuel Onyenweaku Nwankpa na nwunye n’obodo ahụ.
Eze obodo ahụ bụ Eze Ugonna nakwa ndị ezinaụlọ ya bụ nwoke ekweghị gwaa onye ntaakụkọ anyị okwu maka ihe a mere mana ụfọdụ ndị obodo ahụ kọwara ya ihe ha ma banyere ọnwụ nwaamadị ahụ.
Akụkọ ndị na-efegharị na-ada iche iche dịka ha anaghị ekweyere onwe ha.
Otu onye na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ọ bụ okwu akụnụba kpatara ogbugbu nwa ahụ “Nwoke a na nwunye ya gburu nwa ahụ nwaanyị ọzọ nwụrụ ha, lie ya n’azụ ụlọ ha ma ghara igwa onye ọbụla ruo mgbe otu enyị ya bụ nwa rọtara ọnwụ ya na nrọ ma malite ịjụ ha ajụjụ banyere ebe nwa ahụ nọ.”

“E duru ndị ntorobịa obodo ahụ gaa ezinaụlọ ma mmanye ha igosi ọha ebe ya bụ nwa nọ. Ọ bụ mgbe ahụ ka ha gara n’azụ ụlọ be ha gwupụta ozu nwamaadị ahụ a.”
N’ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia, a hụrụ ebe a gbara otu nwoke na nwunye ya ọtọ, kee ha ọmụ ma tikasịa ha ahụ dịka ha bụ ozu ihe yiri mmadụ rekasịrị erekasị n’elu akwa ma na aga n’ụzọ.
E kwuru na ọ bụ ndị ntorobịa obodo ahụ gbara ndị ọtọ ma mmanye ha ibuga ozu ya bụ nwaamadị ọdọ ebe a na-edobe ozu n’ụzọ nke Aba-Owerri.
N’ime ụlọ di na nwunye a, nke tọgbọọ chakoo, onye ntaakụkọ anyị n’Abia hụrụ na akụsasiri ngwu ngwu ha ma kurie akụkụ ya dịka e kwuru na ndị ntorobịa ji iwe wakpoo ụlọ ahụ mgbe akụkọ ọnwụ nwaamadị ahụ.

Ndị gwara onye ntaakụkọ anyị okwu gbara ama na achụpụla di na nwunye n’obodo ahụ ma tie iwu na ha agaghị alọghachite n’ihi na ha merụrụ ala.
Akụkọ ọzọ ndị nọkwa ebe ahụ kọrọ kwuru na ya bụ nwaamadị ahụ na-arụ akpụụkwụ n’ahịa arịarịa mana ọ lọtara obodo na-arịọ nna ya o nye ya otu akụkụ ụlọ ahụ mana o kweghị dịka ọ bụ nwa nwaanyị ọzọ mụrụ ya.
E kwuru na ndị ntorobịa obodo ahụ tinyere ọnụ n’okwu ahụ ma mmanye nwoke ahụ ka onye ya bụ nwaamadị otu akụkụ ụlọ ahụ.
Akụkọ a kwuru na ya bụ nwaamadị dara ọrịa n’ime ụlọ ahụ ma mecha nwụọ dịka ya bụ di na nwunye liri ozu ya n’azụ ụlọ ha ma ghara ime akwamozu zuru oke dịka ha agwaghị onye ọbụla maka ọnwụ ya.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Ogbonna gara n’ihu gwaa BBC Igbo na ihe ndị a ka bụ kepụ kepụ ruo mgbe a nwụchiri nwoke a na nwunye ya, gbaa ha ajụjụ ọnụ ma mee nnyocha zuru oke n’onwu nwammadị a.









