A nwụchiela nwoke a na-enyo n’ogbugbu nne na nna ya na Nnewi Ichi, Anambra

Ebe foto si, iStock
Akụkọ si n’akụkụ Nnewi Iche nke Anambra steeti na-ekwu na a nwụchiela otu nwoke a sị gburu nne na nna ya ebe ahụ.
Onye ntaakụkọ anyị n’Anambra steeti mere njem gaa n’ụlọ ebe a sị ihe a mere dịka ụfọdụ nọ n'obodo ahụ gbara ama nke a.
Cheta na akụkọ ogbugbu ndị a pụtara n’izuụka gara aga ma kwuo na otu nwoke gbara afọ 21 ji mma gbukasịa nne na nna ya ahụ ma gbuo ha.
Otu onye ọrụ nche n’obodo ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na ha nwụchiri ya bụ nwa nwoke a na-enyo n’okwu ọnwụ ndị a ma kpọgara ya ndị uweojii Naịjirịa.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga gwara BBC Igbo na ọ natabeghị ozi banyere nwụchị a.
O kwukwara na ọ ga-ezite ozi banyere okwu a n'uju na nso nso.
Ozi Ikenga ziteere BBC Igbo n’izu gara aga kwuru na ha hụrụ ozu otu nwoke nakwa otu nwaanyị na-erekasị na-esi isi n’ime otu ụlọ na Nnewi.
O kwuru na ozu ndị a ahụ bu ọtụtụ ọnya yiri nke ndị e gburu mma aghara aghara tupu ha anwụọ.
Onye ntaakụkọ anyị kwuru na enweghị onye ọbụla ọ hụrụ n’akụkụ ụlọ ahụ nwereike ịza ajụjụ ndị o nwere mana o zutere otu onye nche obodo ahụ.
Onye nche ahụ gwara BBC Igbo okwu kwuru na ọ bụ onyeisi ha kwesịrị ikwu okwu n’uju banyere nwụchi nwaamadị, etu e siri nwụchie ya nakwa ihe ndị ọzọ.
Mbọ niile BBC Igbo gbara ịnụ olu onyeisi ndị nche ahụ, amịtaghị mkpụrụ n’ihi ya bụ nwoke ekweghị zaa ozi anyị zitere ya.

Ebe foto si, Getty Images
Etu akụkọ a siri dapụta
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
N’izuụka gara aga, iihe onyonyo pụtara ma na-efesa na soshal midia, a hụrụ ebe ndị mmadụ gbakọtara n’ihu otu ụlọ.
Olu onye na-ese ya bụ ihe onyonyo kwuru na ndị mmadụ gbakọtara maka na ozu mmadụ abụọ nọ n’ime ụlọ ahụ, na-erekasị ma na-esi.
Olu onye ahụ nke ahụghị ihu ya kwuru “Ebe a bụ Abubo Nnewi ichi, nwatakịrị onye akwụkwọ mahadum gburu nne ya na nna ya ma gbaa ọsọ. Ozu ha abụọ ka dọ ebe ahụ na-esi”.
“Anyị na-eche ndị uweojii ka ha bịa bupụ ozu ndị a ugbua”.
Ikenga, bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii, kọwara na ndị uweojii awụchiela ebe ahụ ma bupụ ozu ndị ahụ.
O kwuru na ndị uweoji katọrọ agwa a ma kwuo na ihe a bụ ihe jọgburu udele ma sigbuo nkakwụ.
Ọ gara n’ihu kwuo na ha e zigarala ndị ngalaba nnyocha nke ndị uweojii bụ State Criminal investigation department ozi ka ha malite nnyocha na ya bụ okwu.
Akụkọ kwuru na nwoke ahụ a sị gburu nne ya na nna ya mere nke a n’ihi esemokwu dapụtara n’etiti ha mana e nweghị ihe aka ebe gosiri nke a ugbua.
Onwebeghị onye ma ebe ya bụ nwata nwoke a na-ebo ebubo igbu nne na nna ya nọ ugbua.









