Kidnapping in Abia State: Etu e si zọpụta mmadụ iri a tọọrọ n'ụzọ si Uturu gawa Akara

Chima Agbaeze bụ Onyeisioche okpuruọchịchị Isuikwuatọ dị n'Abia Steeti sị na a tọhapụla mmadụ iri ahụ ndị ntọrị tọọrọ 'ụbọchị Fraịde 26 Nọvemba, 2021.
Ọ sị na a tọọrọ ha n'ụzọ si Uturu gawa Akara mana a hụziri ha n'ime ọhịa dị n'obodo Ope nke okpuruọchịchị Okigwe, Imo Steeti.
Agbaeze kwuru na nke a dị ire site na mbọ ndị ọrụ nchekwa dị iche iche gbara ịhụ na a tọhapụrụ ha.
Ọ sị a na-eche na ọ bụ ndị ọchị ehi na-akpa ike n'ogbe ahụ tọọrọ ndị a.
Ọ gaara n'ihu kwuo na mmadụ iri ahụ e nwerela onwe ha ma lakwuru ezinaụlọ ha dị iche iche.

N'ikpeazụ Agbaeze kelere ndị ọrụ nchekwa maka mbọ ha ma sị ha gbalịa na-echekwa ogige ahụ nke ọma.
Cheta na e nweela ọtụtụ akụkọ ịtọrọ mmadụ n'ụzọ si Uturu gawa Okigwe, Uturu gawa Akara nke dịcha n'Isuikwuato, Abia Steeti.
Etu ndị ojiegbe siri tọrọ ndị mmadụ n'ụzọ si Uturu gawa Akara n'Abia Steeti

Ụjọọ ji ọtụtụ ndị mmadụ n'okpuruọchịchị Isikwuato nke Abia Steeti dịka ndị omekome na-akpa ike n'ụzọ si Uturu gawa Akara tọrọla ndị na-eme njem na mgbede Tọọzde.
Ndị ma maka ihe a mere sị na o bụ mmadụ iri ka ndị ntọrị a tọrọ.Dịka ha siri kwuo, ọ bụ n'ọdọ ụgbọala dị n'ihu Mahadum Abịa Steeti dị n'Uturu ka ndị a bala ụgbọala njem ha. Ndị a na-aga Akara dị n'Isuikwuato oge awakporo ha.
Aka na-achi okporuọchịchị Isuikwuato bụ Chima Agbaeze gwara BBC Igbo na obi adịghị ya mma maka mkpa mkpa ndi omekome na-akpa na mpaghara ahụ.
Ọ sị na mbọ niile ha na-agba ịhu na ihe kwụsịrị amịtabeghi mkpụrụ.
'Ndị ọrụ nchekwa nọ mpaghara ahụ'

Ebe foto si, Abia State University Uturu
Maazị Agbaeze sị na ihe na-atụ ya anya bụ na ndị ntọrị a mere ihe gbalaga n'agbanyeghi na e nwere ọdọ ndị agha n'ụzo ahụ.
Ọ gakwara n'ihu kwuo na ha ga-agbambọ ịzọpụta ndị a atọrọla, n'agbanyeghị na amabeghị ndị ha bụ.
Onye bụbụ onyeisi patị Peoples Democratic Party (PDP) n'Abịa Steeti bụ Sinetọ Emma Nwaka - bụkwa ony Isukwuato- gwara BBC Igbo n'ekwentị na ihe mere mibiri ya ahụ.
Ọ sịkwa na ihe a nwereike mee ka ndị a Isukwuato ghara ịlọta n'oge Ekeresimesi.
Ya onye ya sikwa na ọdọ ndị nchekwa di n'ụzọ ahu dị anọ, mana ndị omekome a kpara ike laa.
Sinetọ Nwaka sịkwa na ndị ọrụ nchekwa kwesiri ị na-eme mkparịtauka iji nọdu ndi omekome a n'ihu. Ọ sị na ọ bu ihe mere ndi omekome jiri na-akpa ike na mpaghara ahụ, dika ha ma na ndị ọrụ nchekwa agaghị agwa onwe ha okwu.
Ọ sị: "Ịmalite i na-akwụsị ma na-enyocha ụgbọala ga-enye aka mee ka ihe akwụsị. Ha ekwesighi ịno otu ebe. Ha kwesikwara inwe igwe okwu ka ga-eji na-akpọ onwe ha maka gbatagbata."BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abia bụ Geoffrey Ogbonna mana ọ zaghị ekwenti ya.
Dịka akụkọ a na-apụ, BBC enwetebeghị akaebe na ndi omekome a akpọọla ezinaụlọ ndị ha tọrọ.
Abia Steeti di na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa so n'ebe ọgbaghara n'ogbugbu mmadụ na-emesi ike na mba ahụ.











