Yauri School Abduction: ABSU, Greenfield na ebe ndị ọzọ a tọọrọ ụmụakwụkwọ kemgbe afọ 2021

Ebe foto si, Getty Images
Dịka ọtụtụ mmadu ma ugbua, ntọrị mmadụ abụrụla omenala na Naịjirịa.
Nke a mere na ndị mmadụ anaghị ada ebube ma ha nụta akụkọ na ndị ntọrị kpara ike ebe ọbụla, gụnyere ụlọ akwụkwọ maọbụ ụlọekpere.
Nke a akpụ n'ọnụ ugbua bụ ntọrị ụmụakwụkwọ n'Ụlọ Akwụkwọ Federal Government dị n'obodo Yauri di na Kebbi Steeti.
Ndị oji egbe a wakporo ya bụ ụlọakwụkwọ ma tọrọ ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi ha n'ụbọchị Wenezde.
Ụmụakwụkwọ nwaanyị na nwoke bi na ya bụ ụlọakwụkwọ.
Mmadụ ole ka a tọrọ?

Ebe foto si, Getty Images
Amabeghi mmadụ ole ndị ntọrị a ji mana otu onye ọrụ gbahapụrụ ndị ntọ ahụ kwuru na ndị ahụ ruru iri atọ.
Onye nọ ebe ihe mere kọwara na ha ghukwara otu onye ụweojii ma kwaa mgbo dị egwu mgbe ha bịara.
Mana akụkọ a abụghị mbụ a tọọrọ ụmụakwụkwọ na Naịjirịa n'afọ 2021 a.
Lezie mgbe niile ụdịrị ihe a merela kemgbe mbido afọ a:
Government Science College Kagara, Febụwarị 17

Ndị ojiegbe tọọrọ ụmụakwụkwọ dị iri abụọ na asaa n'ebe elekere atọ nke ụzụ ụtụtụ.
Ha tọrọkwara ọtụtụ ndị ọrụ ụlọakwụkwọ ahụ na ezinaụlọ ha n'ihe ahụ mere na Niger steeti.
A tọghapụrụ ha n'ụbọchị iri abụọ na asaa dịka ha nọchara abalị iri n'aka ndị ntọ ha.
Government Girls Science Secondary School, Febụwarị 26

Ndị o ji egbe tọọrọ ụmụakwụkwọ nwaanyị dị narị abụọ na iri asaa na itoolu n'ụlọakwụkwọ ahụ dị na Janegbe, Zamfara steeti.
A tọghapụkwara ha niile n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Maachị.
Federal College of Forestry Mechanization, Maachị 11

Ndị ntọ wakporo ụlọakwụkwọ ahụ ma tọrọ mmadụ iri atọ na itoolu n'obodo Mando n'ọnwa Maachị.
Akụkọ kwuru na ọ bụ ụgbọala 'Bus' ka ndị ahụ ji bata n'ụlọakwụkwọ ahụ ma kpooro mmadụ ruru iri atọ.
E machara mechie ụlọakwụkwọ ahụ rue oge amaghị dịka a na-eme nyocha ma na-achọ ndị a tọọrọ.
E mechara tọghapụ ha niile n'ụbọchị ise nke ọnwa Mee.
Greenfield Univeristy, Epreelu 20

Ebe foto si, Greenfield University website
Ndị ntọ tọọrọ ihe ruru ụmụ akwụkwọ iri anọ n'ụlọ akwụkwọ ahụ dị na Kaduna steeti.
Mana akụkọ mechara kwuo na ọ bụ mmadụ iri abụọ na abụọ ka ha tọọrọ.
Ihe ịtụ anya mere mgbe ha gburu ụmụakwụkwo ise n'ime ndị ahụ ha bụ ụzọ tọrọ.
Ha mechara tọghapụ mmadụ iri na anọ n'ime ha n'ụbọchị 26 ọnwa Mee.
Abia state University, Mee 5

Ebe foto si, Okezie Ikpeazu/Twitter
Ntọ atọọrọ nwata akwụkwọ ABSU dị iche n'ihi na ọ bụghị n'ime ụlọakwụkwọ ahụ kama n'ime ụgbọala njem ka o mere.
Mgbe ihe ahụ mere n'okporoụzọ Okigwe-Uturu, akụkọ kwuru na ha dị ọtụtụ ụmụakwụkwọ a tọrọ mana gọọmentị steeti ahụ mechara kwuo na ọ bụ naanị otu onye.
A tọghapụkwara onye ahụ bụ nwaanyị dịka ọ nọchara abalị anọ n'aka ndị ntọ ya.
Salihu Tanko Islamic School, Mee 30

E gburu otu onye ma tọrọ ụmụ akwụkwọ karịrị otu narị n'ụlọakwụkwọ ahụ dị na Tegina na Niger steeti.
Onye na-ekwuru ndị uweojii kwuru na ọ bụ ụmụ nwoke nọ n'elu ọgbaatumtum kpara mkpamkpa a.
Rue ugbua, atọghapụbeghị ụmụakwụkwọ ahụ ekwuru dịcha afọ atọ.
Ngalaba UNICEF akpọọla oku ka atọghapụ ha.
Nuhu Bamalli Polytechnic, Juun 11

Ebe foto si, Nuhu Bamalli Polytechnic
E gburu ihe ruru otu nwata akwụkwọ ma atọrọ mmadụ atọ ọzọ n'ụlọakwụkwọ ahụ dị na Zaria Kaduna steeti.
Nke a bụ ugboro atọ awakporo ụlọakwụkwọ ahụ n'ime otu afọ.
Mgbe ọzọ bụ n'ọnwa Nọvemba 2020 mgbe a tọọọ otu onye nkuzi na ụmụ ya abụọ.








