Umuahia Insecurity: A hụrụ ozu otu onye uweojii n'ehihie Fraịde a

Ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ agbagbuola otu onye uweojii n'Umuahia, isi obodo Abia steeti, n'ehihie ụbọchị Fraịde a.
Ọtụtụ ndị mmadụ malitere ịgba ọsọ ndụ dịka ụdaegbe malitere ịda n'elu n'ala.

Ebe ihe a mere bụ na mpaghara a kpọrọ 'Mission Hill', dịka onye ntaakụkọ BBC siri hụ.
Ọ sị na nke a mere mgbe ndị oji egbe a chọrọ ịtọrọ onye ọcha nọ n'ụgbọala ahụ mana onye uweojii ahụ jụrụ nke mere ha ji gbagbuo ya.
O setakwara foto onye uweojii ahụ a gbagburu ebe ozu ya dịna n'okporoụzọ, mana ya bụ foto ekwesịghị ka e tinye ya n'akụkọ a.
Ọtụtụ ndị gbara ọsọ ndụ na-ekwu na ọ bụ ndị ohi bịara ya bụ ihe mana onwebeghị onye ma kpọmkwem.

Onye ntaakụkọ BBC hụkwara ka ọtụtụ ụgbọala ndị uweojii si n'isi ụlọọrụ ndị uweojii dị na Bende Road apụ.
Ndị uweojii juru n'ụgbọala ndị a jikechara nke ọma ka ndị na-aga agha ma burukwa egbe, onweghị onye ma ebe ha na-agbaga.
Ụlọahịa niile dị n'okirikiri ebe ihe a mere ji ọsọ mechie dịka ndị mmadụ na-azọ isi one ha
Ụda egbe ekweghị ndị mmadụ rahụ ụra n'Umuahia

Nke a na-abịa dịka ọtụtụ ndị bi n'Umuahịa, isi obodo Abia steeti kwuru na ụra agaghị ha n'anya n'abalị fotere Tọzde n'ihi ọtụtụ ụdaegbe ha nụrụ.
Onye ntaakụkọ BBC kwuru na ya bụ ụda egbe malitere n'elekere itoolu nke abalị.
O kwuru na ọ bụ na mpaghara obodo Afara na Aba road ka ya bụ ụdaegbe na-ada.

N'ụtụtụ Fraịde a, oge onye ntaakụkọ BBC gara ịchọpụta ihe merenụ, ndị bi na mpaghara ahụ kwuru na ọ bụ ndị ọrụ nchekwa na-agba ya bụ egbe.
Dịka ndị ogbe ahụ si kwuo, "Ọ bụ ndị uweojii gbara egbe ndị ahụ, iji mee ka ndị mmadụ lakpuo ma rube isi n'iwu mmachị mkpagharị nke gọọmentị Abia steeti tinyere."
BBC Igbo kpọrọ Geoffrey Ogbonna, bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abia steeti, iji mata kpọm kwem ka ọ bụ ndị uweojii na-agba egbe ahụ, mana ọ zaghị.
Anyị zigakwaara ya ozi n'ekwentị, mana ọ zaghachibeghị ya tupu akụkọ a apụta.










