Nigeria Labour Congress Protests: N'Abia steeti, ndị ọrụ NLC si ka Gọọmenti etiti ji aka ya na-akwụ ha ụgwọọnwa

Ngagharịiwe NLC
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Otu jịkọtara ndị ọrụ oyibo na Naịjirịa a kpọrọ Nigeria Labour Congress (NLC) amalitela imengagharịiwe dịka ha kwere na ngwa ụbọchị olemole gara aga.

Ha na-esikwa ọnwụ maka na gọọmentị anaghị akwụkọta ndị otu ha niile ụgwọ opekatampe ha kwere na nkwa.

Ndị otu a sị na ha nụrụ kepukepu na ndị omeiwu chọrọ iwepu ụgwọọnwa ndịọrụ n'akwụkwọ gọomentị etiti a kpọrọ "exclusive list".

Ngagharịiwe NLC mere n'Abuja

NLC kwere gọọmentị etiti nkwa na ịwepụ ụgwọọnwa na akwụkwọ gọọmentị etiti bụ ọgụ ka gọọmentị etiti na-achọ.

Maka na nke a ga-etinyezi ha n'aka gọọmenti steeti bụ nke wereike ụkwụ ndị obula ụgwọ ka ọ masịrị ha.

Ka anyị sị hụ ngagharịiwe NLC mere n'Abuja, Legọs, Abia, Anambra na Rivers

Ka ọ dị ugbua, ya bụ ngagharịiwe ha kwuru ga-abụ na steeti niile na-akpọtụ na Ikeja, isi obodo Legọs steeti nakwa Abuja ugbua.

N'Abuja

A gbakọtara na Unity Fountain bụ ebe ha si gawa ụlọomeiwu n'isi ụtụtụ a.

Ka anyị sị hụ ngagharịiwe NLC mere n'Abuja, Legọs, Abia, Anambra na Rivers

Ọ na-akpọtụkwa n'Abuja, isi obodo Naịjirịa.

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

NLC Demonstration

Cheta na Ọktoba 2018 ka gọọmentị etiti kwekọrịtara ịkwụwa ndị ọrụ puku Naịra iri atọ (N30,000), mana ọtụtụ steeti ewebeghị ike ịkwụwa nke a maka na ha sị na ha enweghị ego.

N'Anambra steeti,

NLC Demonstration

Ndị ọrụ oyibo mere ngaghịiwe na ụlọomeiwu steeti ahụ ịme ka ha gbaa mbọ chefuo itinye ụgwọọnwa ha n'aka gọọmentị etiti.

NLC Demonstration

Ka ọdị nke taa agụọla ya bụ akwụkwọ kwesiri ịwepụ aka gọọmentị etiti n'ụgwọọnwa ndị ndị ọrụ ugboro abụọ n'ụlọomeiwu ahụ.

NLC Demonstration

Onye tinyere akwụkwọ ya bụ iwu bụ Garba Mohammed sị na iwu a ga-enyere gọomenti steeti na nke etiti ohere ịkwe ụgwọọnwa ndị ọrụ ọnụ.