Elon Musk ga-enyenwu Naịjirịa ego bọọjetị ha ruo afọ ise

Buhari na Elon Musk

Ebe foto si, AFP/BBC

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Elon Musk abụrụla onye kachasị nwee ego n'ụwa niile dịka ego dị ya n'akpa gafere nke Jeff Bezos - bụ onye bụbu onye kachasị nwee ego.

Nke a na-abịa dịka ego ole a na-ere oke Tesla ji pasenti anọ na ụma asatọ rịa elu n'ụbọchị Tọzde.

Ọ bụ Maazị Musk nwe ụlọ ọrụ Tesla na-arụpụta ụgbọala latrik nakwa SpaceX bụ nke na-arụpụta ụgbọelu e ji aga n'urukpu.

Ugbua ego dị Musk n'akpa bụ ijeri dọla 188.5. ($188.5 billion)

Dịka ego ya gbagoro elu, Musk kwuru na ya bụ ihe gbagwojuru ya anya, ma kwukwaa na ya ga na-arụ ọrụ ya na-aga n'ihu.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

"Ndị ka Musk nọ n'Ọnịcha nakwa Nnewi"

Ka akụkọ banyere Musk na-ewu na soshal midia, ụfọdụ mmadụ pụtara na-ekwu na e nwere ide ego anaghị eme mkpọtụ nọ Ọnịcha nakwa Nnewi ego ha ruru maọbu kara nke Maazị Musk.

Otu onye aha ya bụ Kelvin Odanz dere na ndị ide ego nọ obodo abụọ ahụ ga na-ele akụkọ Elon Musk na-efe n'isi maka na "ndị nwere ezigbote ego anaghị apụta na Forbes".

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Maazị Odanz mechara pụta kwuo na ọ bụ njakịrị ka ọ na-ama, mana okwu ahụ enwurula ọkụ ma na-ewu na Twitter ebe ụfọdụ na akatọ ya dịka ndị ọzọ na-asị na ọ bụ eziokwu.

Onye nwere akala @ayodele_oz kọwara na ide ego Musk na nke dị n'Ọnịcha nakwa Nnewi abụghị otu ihe dịka ofu bụ ide dọla ebe ndị ọzọ bu ide naịra.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Etu Musk jiri karịa ndị ide ego Nnewi na Ọnịcha

Aliko Dangote

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Aliko Dangote bụ onye kacha baa ọgaranya n'Afrịka niile

Onye a ma kacha nwee ego n'Afrịka bụ Aliko Dangote bu onye nwee ụlọọrụ Dangote Group nke na-arụpụta ihe dị iche iche.

A bịa n'Anambara bụ steeti Nnewi na Ọnịcha nọ n'ime ya otu ide ego a ma ama bụ Innocent Chukwu, onye isi ụlọọrụ Innoson.

Mana ekwuwe ndị kachasị nwee ego n'Naịjirịa Innoson esoghi na mmadụ ise mbụ.

Forbes dere n'ego Dangote bu ijeri dọla 10.1 n'ọnwa Disemba 2020.

Ndị Naịjirịa atọ ọzọ gụnyere Mike Adenuga, Folorunsho Alakija na Abdulsamad Rabiu nọ n'ime mmadụ 20 kachasị nwee ego na Afrịka.

Musk

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Musk na-arụpụta ụgbọeligwe n'ụlọ ọrụ ya a kpọrọ SpaceX

Ọnweghị Ọwụwa Anyanwụ sọ n'ime ya.

Nke kachasi nke bụ na a gbakọọ ego niile mmadụ 20 Forbes sị na ọ bu ha kachasị nwee ego n'Afrịka, o rụghị ọkara ego Elon Musk.

Agbakọọ ego mmadụ 20 a kachasị nwee ego ọ ga-apụta ijeri dọla 73.4.

Nke a pụtara sọsọ ọkara ijeri dọla 188.5 bụ ego dị Musk n'akpa ugbua.

Ego Musk ga-arụ akwammiri Naịja nkr abụọ ugboro 288

Akwa mmiri Naịja

Ebe foto si, Julius Berger

Ọ bụ nde dọla 653.m ka eji arụ akwammiri Naịja nke abụọ bụ nke na-aga n'ihu ugbua.

Nke a pụtara na ego dị Elon Musk n'akpa ugbua ga-arụ akwa mmiri ahụ ugboro 288 ma ọ chọọ iji ego ya niile rụọ ya.

Musk ga-enyenwu Naịjirịa ego bọọjetị ha ruo afọ ise

Onyeisiala Buhari

Ebe foto si, Nigeria Presidency/Twitter

Nkọwa foto, Onyesisala Buhari sị na a ga-ebute ụfọdụ ego bọọjeti Naịjirịa nke 2021 ebute

Ọ bụ ijeri dọla 35 ka Naịjirịa mapụtara dịka ego a ga-emefu n'afọ 2021.

Ihe ego a pụtara bụ ego Musk ụzọ Ise.

Matakwa na-a mụrụ Musk na mba Saụt Afrịka tupu ọ gawa mba Amerịka ebe o tiwara ma bụrụ ide ego ọ bụ taa.

Ọ sị na ya ga-eji ego ọ kpara n'ụwa rụọ ebe obibi na Mars.

Musk na Tesla

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ụgbọala anaghị aṅụ mmanụ Musk na-arụpụta bụ nke kachasị kwụrụ ka ọkaibe n'ụwa ugbua