Workers' Day: Lee nsogbu ise coronavirus buteere ndịọrụ

Ụbọchị ndị ọrụ

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Abali mbụ nke ọnwa Mee afọ ọbụla bụ ụbochị ndịọrụ ji agbakọ emerube ụbọchị, mee 'parade', ma tụọ alo etu ha si akwado akụnaụba na mwulite obodo, mana n'afo a, egwu adaghariri n'ihi oria coronavirus.

Dika onyeisioche otu NLC ngalaba nke Enugwu steeti bụ Comrade Virginus Nwobodo si gwaa BBC Igbo, onye ọbụla nọ be ya n'ihi ụjọ coronavurus."

Kemgbe ọrịa coronavirus malitere kpaba ike na Naijiria bido na ngwụcha onwa Februwari afọ 2020, oge onye mbụ bubatara ya,ọnọdụ ndị ọrụ na Naijiria dịzi ka nke nwaanyi ime na-eme; etu ọbụla o si tụgharịa,nsogbu.

Aha onyonyo, Workers' Day: Ndịọrụ ahụike na-ekele ụmụ Naịjirịa n'ụbọchị ncheta ndịọrụ

Nsogbu ndi a metutara ahụike, ọnọdụ ọrụ,mmefu ego ntụmadi, na ọdịda akụnauba ezinaụlọ.

Nwobodo, onye kwuru na "ụjọ coronavirus bụ ahụoku nke onwe ya" si na coronavirus mere ka ha na-emefu oke ego ịga ọrụ nakwa ịzụ nri, ọgwụ na ihe ndị ọzọ dị mkpa maka ezinaụlọ nke na " ego ndịọrụ anaghị ezuziri ha n'ọnwa."

Ọ bụghi naanị ihe ndị a ọ rụtụrụ aka, lee ụfọdụ ajọ ọnọdụ Coronavirus tinyerela ọtụtụ ndịọrụ:

Aha onyonyo, May Day 2020: Lee ndị ọrụ nọ n'ihu agha Covid-19

1. Ezumike akwgw

Mmachi ngaghari kpochiri ụzọ ọtụtụ ụlọọrụ dị na Naijira si achụta ego dịka ọtụtụ ndị mmadụ nọ n'ụlọ.

N'ọnwa Eprel, ụlọọrụ ụgbọelu Arik kwuru na malite n' abali mbu nke onwa Mee afọ 2020, na ọtụtụ ndịọrụ ha,(pasent 90), ga-anọrọ ezumike akwụ ụgwọ rue mgbe a mabeghị n'ihi na ego anaghịzị abata dịka e nweghịkwa ndị na-eme njem ụgbọelu ugbua.

2. Mgbubi gwọọnwa

Kedụ nke I ga-ahara n'ime zuo ike n'ụlọ na anaghị ụgwọọnwa na rụọ mana anyi ga-egbubi ụgwọọnwa gi?

Goomenti Kaduna nyere iwu ka ewepu pasent iri abụọ na ise(25%) na ego ndi welitere isi n'ọrụ oyibo steeti ahụ iji kwado mbọ a na-agba ịhụ na agụụ egbughị ndị ogbenye n steeti ahụ dịka a machiri ngaghari maka coronavirus.

Mana ya bụ atụmatụ atọghị ndị ọrụ steeti ahu ọchị ma ọlị.

Otu onyeisioche otu jikoro ndị ọrụ bụ NLC na steeti ahu bu Ayuba Suleiman kwuru na ọ bụghị na mmanye ka a ga-asi ndịọrụ tinye ego were kwado ọgụ megide coronavirus.

" O kwesịrị ịbụ o metụta gị n'obi ịtụnye nke gị."

Ọ bụghị naanị Kaduna steeti mere nke a, Arik gbubiri ụgwọọnwa ndịọrụ ha n'ọnwa Eprel tupu a gwa ha nọrọ n'ụlọ.

3. Ich n' r

Ndị Igbo sị na ọ naghị ahịa ahụ, ọ hịawa ahụ. Ka ọchị, ka egwu, ụfọdụ ndịọrụ ga-esi na ịnọ n'ụlọ ghọọ ndị enweghị ọrụ.

Otu jikoro ndịọrụ njem ụgbọelu bụ ' International Air Transport Association'(IATA) na Bekee gbara ama na ọrụ dị 91,380 ga-ala mgbuka na Naijiria dịka ọnụgụgụ ndị njem ụgboelu ji nde ato na uma ise(3.5m) gbatuo n'oge corona virus a.

O bughi naani ugboelu, otutu ulooru akpuola afo n'ala nke na ha agaghi enwe ike kulie ozo ma coronavirus laa. Onye makwanu mgbe o ga-ebi?

4. r ezu ike

Ajị ekweghị ka a mara na ọsịsa na-agba nwa mkpi. Na ọtụtụ ndịọrụ nọ n'ụlọ ezu ike maọbụ si n'ụlọ na-arụ kemgbe mmachi ngagharị ekweghị ka a mara na o nwere ndi ekutebeghị ume kemgbe coronavirus batara Naijiria.

N'ozi o ji kelee ndịọrụ, ụbọchị mbụ nke ọnwa Mee afọ a, Mịnịsta na-ahụ maka ahụike bụ Dọkita Osagie Ehanire sị, "Ana m kelere ndịọrụ ahụike dịka ndị dọkịta,nọọsụ, ndịọrụ 'lab', na ndị niile na-arụ ọrụ kwa ụbọchị kemgbe coronavirus bidoro."

Mana ọ bụghị naanị ndịọrụ ahụike bụ ndị aṅụbeghị mmiri tọgbọ iko n'oge a.

Ndị uweojii, ndị ntaakụkọ, ọbụladị otu 'Presidential Task Force on Covid -19' na-arụ ọrụ kwa ụbọchị, na ezughị ike kemgbe coronavirus malitere.

5. nw akwadogh akwado

Kemgbe coronavirus bidoro ndịọrụ ụfọdụ nọ n'ihu agha megide ọrịa ọjọọ a ebutela ọrịa n'ihu ọrụ, ebe ụfọdụ tụnyerela ndu ha.

Dika ozi si na NCDC puta si kwuputa na ụbọchị iri atọ nke ọnwa Eprel, ndịọrụ ahụike gunyere ndị dọkịta, nọọsụ na ndịọrụ ahụike ndị ọzọ dị 113 ebutela ọrịa coronavirus, ebe ihe ruru anọ nwụrụ anwụ.

Ka o si kwuru taa bu 1/5/2020, na Naijiria,mmadu 1,728.ebutela coronavirus,ebe mmadu 51 nwụrụla site na ya.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Akụkọ ndị ga-amasị gị: