Benue Strange Disease: Ihe anyị ma maka ọrịa ọhurụ pụtara na Benue steeti

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisi 'Nigeria Centre for Disease Control' (NCDC) bụ Chikwe Ihekweazu ekwuola na ụlọọrụ ha na-enyocha ọrịa amaghị aha ya nke gbugoro mmadụ iri na ise na Benue steeti.
Ihekweazu kwuru na ha na-agba mbọ ịhụ na ya bụ ọrịa efesasịghị n'ebe ndị ọzọ.
Lee ihe ndị anyị ma maka ya bụ ọrịa ọhụrụ
- E si na mmiri ebute ya
- Nchọpụta e mere n'ụlọ nnyocha ha gosiri na ọrịa ahụ abụghị Lassa Fever, Yellow fever maọbụ Ebola.
- Ọrịa a efeela mmadụ otu narị na steeti ahụ.
- E wegala mmiri ekutere maka nnyocha gawa ụlọọrụ na-ahụ maka mmiri na Naịjirịa maka nnyocha ọzọ.
- Ọ ga-ewe ihe ruru awa iri anọ na asatọ iji chọpụta mpụatara ya bụ nnyocha.






