Biafra at 50: 'Ọkwa onyeisiala kwesiri ndị Igbo, anyị agaghị arịọ ya n'arịrịọ'

Ichie Nduka Eya kwuru nke a na mkparịtaụka nke BBC Igbo kpokọbara maka ncheta afọ 50 kemgbe agha Biafra biri.
O kwuru na ọ bụghị tigbo zogbuo ka a ga-eji nweta ihe ndị Igbo na-achọ.
Cheta na Ichie Nduka bụ otu n'ime ụfodụ ndị lụrụ agha Biafra mgbe ọ dara n'afo 1967.
Ọ kọwakwara na Igbo dị Naịjirịa mkpa nke mere na agaghị a gbahapụ ha n'ihe gbasara ọchịchị.
N'ọnụ ya "Igbo so na ụkwụ atọ Naịjirịa kwụ n'elu ya. Ewepu otu ụkwụ kedụ etu Naịjirịa ga-esi kwụrụ?"
Onye ọzọ so kwa na mkparịtaụka a bụ Chinedu Mbah onye kpokọbara otu Ndị Igbo United.
Ọ sị na oge eruola mgbe ụmụ Igbo ga abịakọta ọnụ jiri otu olu kwuo ihe ha chọrọ ma sowe ya.
O kwuru na ndị Igbo sepụ aka n'ihe niile ga-ebute agha ọzọ.
Ihe ndị pụtara na mkparịtaụka a n'aha ịchafụ
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
1. Anyị chọrọ onyeisiala Igbo dị mma na abụghị onyeisiala Igbo nkịtị"
2. Ndị ahụghị ndị Igbo n'anya kpọrọ 'coup' mbụ 'Igbo coup'
3. Mmegbu ndị Igbo abụghị taa ka o bidoro
4. Iwu Hate speech bụ kaiji mechie Igbo ọnụ
5. Ndị e nyere 20 paunds ejirila ya merie ndị nyere ha 20 paunds.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị










