Omoyele Sowore: A ga m akpụpụ DSS ụlọikpe ma ha emeghi ihe ha kwesiri - Femi Falana

Omoyele Sowore bụ onye ndu pati African Action Congress

Ebe foto si, Sowore2019/Facebook

Nkọwa foto, Ngagharịiwe 'RevolutionNow' ka a na-atụ anya ịmalite n'ụbọchị ise nke ọnwa Ọgọstụ 2019

Ọkaiwu na-anọchite anya Omoyele Sowore sị na "Department of State Service" (DSS) emebeghi ihe ụlọikpe sị ha mee na-agbanyeghi na-e nyere ha akwụkwọ.

Femi Falana sị na DSS enwetela akwụkwọ ụlọikpe ji si ka ahapụ Sowore mana ha ekwebeghị ịtọhapụ ya. Ọ sị na ya ga-agba ha akwụwkọ ma ha emezughi ihe ụlọikpe kwuru.

Cheta na Ọkaikpe Ijeoma Ojukwu nọ n'ọnwa Ọktoba nye Sowore ohere ịla ma ọ kwụọ otu narị nde naịra ma kpọtakwa mmadụ abụọ ga-ejikwa ego ole ahụ gbaara ya akaebe.

Kemgbe ahụ, nwaamadị ahụ tọrọ na mkpọrọ maka na o nweghị onye ga-agbara ya akaebe.

Nke a bịara ka Maazị Falana gara Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja gaa gwa Ọkaikpe Ojukwu na o mezuola ihe a sị ya mee iji tuzuo ịtọghapụ.

Olileanya na a ga-atọghapụ Sowore ụnyaahụ bụ ụbọchị isii nke ọnwa Nọvemba, amịtaghị mkpụrụ.

Femi Falana

Ebe foto si, Femi Falana's Facebook page

Nkọwa foto, Femi Falana

Dịka ụlọ ntaakụkọ Premium Times siri dee, ndị DSS ekweghị ahapụ ya.

Ka ha sị dee, ihe DSS kwuru mere ha ji ka jide ya bụ makana ha emechiela ọrụ mgbe ozi si ụlọikpe rute ha aka.

BBC Igbo kpọrọ Maazị Falana ịmata nke bụ eziokwu, o were sị na a sị ka ha laghachite n'elekere iri nke ụtụtụ a bụ abalị asaa nke ọnwa Nọvemba.

"Ndị ọrụ nọ n'ụlọ ọrụ DSS ụgbụa, kpọghachite m ma ọ kụọ elekere iri na otu nke ụtụtụ a."

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, 'Nwa ebu n'afọ na-agba ọkada na Nnewi'